Skip to content

We use essential cookies to sign you in and remember your settings. With your permission we also use analytics cookies to understand how the site is used. See our privacy policy or fine-tune this anytime at cookie settings.

SubjectFree lesson

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA 1.1 NDḷ IGBO

ClassNotes Team 69 MIN READUPDATED 5 JUL 2026

ISI NKE MBU

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA

1.1 NDḷ IGBO

        Ndị igbo bụ ndị ahụ bi n’ ebe a maara dịka ala igbo, ma nweekwa asụsụ igbo dịka asụsụ nne na nna ha. Ndị igbo bụ ndị bi n’ ọwụwa anyanwụ mba Naịjịria. Ihe eji mara mba ma ọ bụ obodo ọ bụla bụ na ha ga-enweriri ebe ha bị na ya.

        Abia n’ ọwụwa Anyanwụ Naijịrịa ebe ndị igbo bi, ọ bụ naanị ha, ọ bụ naanị ha bi na steeti ise ndi a:

a. Abịa

b. Anambra

ch. Ebọnyị

d. Enugwu

e. Imo

f. E nwekwara steeti ndị ọzọ ebe ndị igbo so biri dịka:

i. Akwa ịbọm

ii. Kros Riva

iii. Delta

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

Agbụrụ dị iche iche na Naijịrịa gbara ndị Igbo gburugburu. Na mgbago ugwu, ndị ha na ndị igbo gbara bụ igbala, idoma na Tiv. Na ndị da, ọ bụrụ ndị ijọ (Ijaw), Urobo (Urhobo) na isoko, n’ ọwụwa anyanwụ ọ bụrụ ha na efiti (Efik) na Ibịbịo. A gafee ọdịda anyanwụ ọ bụrụ ha na ndị Edo.

        Mmekọrịta ndị Igbo na ndi agbataobi ha metụtara omenala, usoro ọchịchị na usoro achụmunta akụnụba. Site n’ ụzọ dị iche iche, tụmadu site n’ akụkọ ndịịche, anyi na-aghọta na ọ bụ ndị igala na ndị Edo ka ha na Igbo ka nwee mmekọrịta n’ oge gboo.

        Ndị Enugwu Ezike nke dị na mgbago Nsukka na ndị igala gbara

agbataobi. Ha na-alụkọrịta dị na nwunye. Ụfọdụ ndị Enugwu Ezike dịka ndị unadụ na-egbu egbugbu dịka ndị igala. Ha na-azakwa ndị igala. Ufodu na-aza ataa.

        Ndị Aguleri na ndị igala nke dịkwa na kogi steeti gbakwara agbataobi. Ọ bụ osimiri Anambra ma ọ bụ omambala kewara ndị igala na ndị Aguleri

        Ndị Igbo ụfọdụ bị na delta steeti na ndị Edo (Iduu) gbara agbataobi. Ndi ọ bụla na- esi n’ aka ibe ha gbaziri ma ọ bụ omena-ala ma ọ bụ okwu ụfọdụ.

 

1.3 AKỤKỌ GBASARA EBE NDḷ IGBO SI MMALITE

        Agbụrụ ọ bụla nwere akụkọ ha na-akọ bụ etu agbụrụ ha siri malite.

Ndị Yoruba kwenyere na ọ bụ oduduwa bụ nna ndị Yoruba. A mụghi ya amụ. Ọ si n’ elu igwe wụdata n’ ala wee mụbawazie ndị Yoruba.

        Ndị Awụsa Kwenyere na ọ bụ kano be ebe mbu, nna mbu ha siri malite.

Ndị Igbo nwere otụtụ akụkọ gbasara etu ha siri malite. Ide akwụkwọ abiaghị ala igbo n’ oge. Ndị ọ bụla na- akọ na- ekwu na ọ bụ ha bụ ndị mbu bịara biri n’ ala igbo.

        E nwekwara ndị kwenyere na ndị igbo esịghị ebe ọ bụla bịa. Ndị dị otu a na-akọwa na ndị igbo malitere ndu ha n’ Awka na Nri Oweriri na ọrlụ na okigwe, Ọ bụzi ebe ndị a ka ha sitere gbasaa. Ụfọdụ n’ ime ndị kwenyere n’ echichi a na-akọwa na ndi igbo malitere ndu ha na mpahara ọrlụ na owerri na mgbagwo oshimiri omabala tupu ha wee rute Awka na Nri.

        Ụfọdụ sịrị na ndị Igbo sitere n’ agbụrụ ndị juu. Ha gbadoro ụkwụ n’ ihe ndi a wee na-ekwu:

A.Ndị Igbo na-akpa agwa ka ndị juu:

i. Ha na achụkari akụnaụba nke ụwa a.

ii. Ha amaghi ihe bụ ezụmike.                      

iii. Ha dị ike ọrụ nke ukwuu.

iv. Afọ anaghi eju ha eju n’ ịchu ego.

v. Ha anaghị efe eze ha ofufe dịka ndị agbụrụ ndị ọzọ.

        Otu a kwa ka ọ dị n’ agbụrụ ndị juu.

B. Ụfọdụ omenaala ha na ndị juu yiri bu:

i. Ha na-ebe ugwu dịka ndị juu.

ii. Ha na-eme mmemme ọmụgwọ.

iii. Ha na-eme mmemme ịgụ nwa ọhụrụ aha.

 

1.4 NJIRIMARA NDI IGBO (Characteristics of the Igbo People)

a. Ndị igbo na-asụ asụsụ Igbo.

b. Ha na-enwe amamiihe.

ch. Ndị Igbo na-azụkarị ahịa.

d. Ha kwenyere n’ egbe bere ugo bere.

e. E ji erimeri ndị a mara ndị Igbo dika akpụ, ji, ofe onugbu, ofe ọra. na ndị ọzọ dị iche iche.

f. Ejikwa Ejije a mara ndị Igbo.

 

1.5 NGWE EJIJE NDI IGBO (IGBO COSTUMES)

Okpu                 (Cap)

Okpu mme         (Red cap)

Mkpara              (Staff)

Uwe mwuda       (Long gown)

Abụba ugo         (Eagles feather)

Akpụkpọụkwụ    (Shoes)

Aka                   (bead)

Ịchafụ               (Scalf)

Irika                  (Ring)

Ụdọ                   (Robe)

Ọlanti                  (Earring)

Ụkwụ akwa        (Wrapper)

                                       

ISI NKE ABỤỌ

NJḷRḷMARA NA ỌRỤ ASỤSỤ (LANGUAGE)

2.1 NKỌWA ASỤSỤ

        Asụsụ bụ mmerkọrịta na-adị n’ etiti mmadụ na ibe ya, obodo na obodo, mba na mba.

        Asụsụ bụ okwu mmadụ kwuru n’ ọnụ nke ya n’ ibe ya ji emekọrịta ma ọ bụ agwarịta onwe ha okwu. Ọ bụ naanị mmadụ nwere ike isụ asụsụ doro anya ma ụmụ anụmanụ ndị ọzọ na-eme ụnara ma ọ bụ bee ube dị iche iche ma ịhe ndịa abụghị asụsụ.

        Mmadụ na- esitekwa n’ asụsụ azipụta ebumnobi ya. E nwere ọtụtụ asụsụ dị iche iche na Naịjịrịa ma naani atọ n’ ime ha kacha pụta ihe. Atọ ahụ bụ Igbo, Awusa na Yoruba.

 

2.2 URU ASỤSỤ BARA

a. Mmadu ji asụsụ akọwapụta ebumnobi ya.

b. Asụsụ na-egosi mba maọbụ obodo mmadu siri pụta.

ch. Eji asụsụ akuziri ụmụaka ihe n’ ụlọ akwụkwọ.

d. Eji asụsụ azipụta omnaala na agụmagụ mba.

e. Eji asụsụ ezirita ozi n’ akwụkwọ n’ ikuku.

f. Asụsụ na- eme ka mmadụ na ibe ya ghọta onwe ha.

g. Eji asụsụ ekele ekele.

h. Eji asụsụ arịọ arịrọ.

i. Asụsụ na-eme ka mmadụ nwee ike ịgụ ihe edere n’ akwụkwọ.

 

2.3 NJḷRḷMARA ASỤSỤ

1. Asụsụ na-eto eto ma ọ kwusi otito, ọ nwụọ.

2. Ọ bụ naanị mmadụ nwere asụsụ

3. A ga-ebụ ụzọ mụta ịsụ asụsụ tupu odide ya.

4. Asụsụ nwere nhazi na usoro esi asụ ya.

5. Asụsụ ọ bụla nwere ohere ịnabata okwu dị n’ asụsụ ndị ọzọ.

6. Asụsụ ọ bụla nwere izugbe ya, n’ ọsụsụ na n’ odide.

7. Eji asụsụ azipụta omenaala mba.

8. Eji asụsụ ama mba.                

ISI NKE ATỌ

ỤDAASỤSỤ IGBO NA USORO ODIDE IGBO

3.1 ABỊCHỊỊ IGBO (IGBO ALPHABETS)

        Abịchịị Igbo bụ ederde eji anọchite mkpụrụụda (fonim) digasi n’ asụsụ. Ọ bụ mkpụrụabịchịị Igbo ka  na- akpọ mkpụrụedemede Igbo ma ọ bụ mkpụrụasụsụ Igbo.

        Mkpụrụabịchịị eji ede Igbo ugbu a gbasoro nsoroedide komitii onwu nke a nabatara n’ afọ 1961.

        Abịchịị Igbo dị iri atọ na isii (36) Ha bụ ndi a:

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

Ndị obere(Small letters)

a      b      ch     d      e      f       g

gb    gh    gw    h      i       ị       j

k      kp     kw    l       m     n      ṅ

nw    ny     o      ọ      p      r       s

sh     t       u      ụ      v      w      y

z.

 

Ndị Nnukwu (Big Letters)

A      B      CH    D      E      F      G

GB    GH    GW   H      I       Ị       J      

K      KP    KW   L       M      N      Ṅ

NW   NY    O      Ọ      P      R      S

SH    T      U      Ụ      V      W     Y

Z.

3.2 NJḷRḷMARA ABỊCHỊỊ IGBO

1. Ọ bụ mkpụrụ abịchịị ka a na-akpọ mkpụrụedemede ma ọ bụ mkpụrụ asụsụ

2. Ọ bụ mkpụrụ abịchịị ka eji anọchite mkpụrụụda ma ọ bụ fonim digasi n’ asụsụ.

3. Mkpụrụabịchịị Igbo dị iri atọ na isii

4. Ekere mkpụrụabịchịị Igbo ụzọ abụọ: ụdaume na mgbochiume.

5. Ụdaume Igbo dị asatọ: a e i ị o ọ u ụ.

6. Mgbochiume Igbo dị iri abụọ na asatọ.

 

3.3 E KERE MKPỤRỤEDEMEDE IGBO ỤZỌ ABỤỌ HA BỤ

1. Ụdaume (Vowel)

2. Mgbochiume (Consonant)

 

 Ụdaume dị asatọ ndị a:

 

A      E      I       Ị       O      Ọ      U      Ụ

 

Mgbochiume dị iri abụọ na asatọ ndị a:

 

b      ch     d      f       g      gb    gh    gw

h      j       k      kp     kw    l       m     n

ṅ      nw    ny     p      r       s       sh     t

v      w      y      z

 

ISI NKE ANỌ

4.1 IJI MKPỤRỤ EDEMEDE MEBE MKPỤRỤ OKWU

A:     Anya (Eye)

        Aziza (Broom)

 

B:     Bọọlu (Ball)

        Bia (Come)

        Bata (Come in)

 

CH:   Chee (Think)

        Chọọ (Find)

        Chịagozie (God’s blessing)

 

D:     Dibia (Native doctor)

        Dọkitọ (Doctor)

        Di (Husband)

 

E:     Efere (Plate)

        Eze (King)

        Ego (Money)

 

F:     Fee (Fly)

        Fuo (Get missing)

        Foto (Picture)

 

G:     Gaa (Go)

        Gụọ (Count)

        Gi (What)

 

GB:   Gbuo (Kill)

        Gbaa (Shoot)

        Gbọọ (Vomit)

 

GH:   Ghee (Fry)

        Ghọta (Understanding)

        Ghọpụ (Plunk)

                                               

GW:  Gwuo (Dig)

        Gwọọ (Cure)

        Gwee (Crush)

 

H:     Ha (They)

        Huo (Roast)

        Hapụ (Live it)    

 

I:      Imi (Nose)

        Iko (Cup)

        Isi (Head)

 

Ị:      Ịgba (Drum)

        Ịba (Yellow fever)

        Ịchafụ (Scalf)

 

J:      Jee (Go)

        Ji: (Yam)

        Jere(Go to)

 

K:     Kobo (Money name)

        Kee (divide)

        Kedu (How)

 

KP:   Kpọọ (Call)

        Kpee (Report)

        Kpata (Plunk)

 

KW:  Kwee (Sing)

        Kwaa (Sew)

        Kwuru (Said)

 

L:     Lee (See)

        Lụọ (Fight)

        Lọta (Return)

 

M:    Mma (Knife)

        Metu (Touch)

        Mmadụ (Human being)

 

N:     Nnu (Sat)

        Nri (Food)

        Ngozi (Blessing)

 

Ṅ:     Ṅuo (Drink)

        Ṅụria (Rejoice)

        Ṅọrọ (Stay)

 

Nw:  Nwa (Child)

        Nwụọ (Die)

        Nwalee(Child look)

 

NY:   Nyere (Give)

        Nyetu (Give to)

        Nyem (Give me)

 

O:     Obe (Cross)

        Osisi (Tree)

        Obi (Heart)

 

Ọ:     Ọnwa (Sun)

        Ọkụ (Fire)

        Ọjị (Kola)

 

P:     Pụọ (Go out)

        Para (Carry)

        Papa (Father)

 

R:     Rie (Eat)

        Ree (Sell)

        Ria (Climb)

S:     Sie (Cook)

        See (Draw)

        Saa (Wash)

 

SH:   Shovelu (Shove)

        Sheti (Shirt)

        Isha (Crayfish)

 

T:     Tii (Tea)

        Tebulu (Table)

        Tee (Scrub)

 

U:     Ube (Pear)

Uru (Gain)

Ugwu (Prestige)

 

Ụ:     Ụkwụ (Leg)

        Ụtara (Cain)

        Ụzo (Door)

 

V:     Vọpụ (Uproot)

        Votuo (To remove)

        Vọọ (Scatter)

 

W:    Wepu (Takeaway)

        Weta (Bring)

        Waya (Wire)

 

Y:     Yie (Resemble)

        Ya (He, She)

        Yabasi (Onions)

 

Z:     Zapụ (Sweep)

        Zụọ (Buy)

        Zọọ (Save)                                     

ISI NKE ISE

5.1 ỤDAUME (VOWEL)

        Ụdaume bụ mkpụrụdaasụsụ eji nkupụta ume akpọpụta n’ enweghị mgbochi n’ oghere ọnụ.

        Ụdaume Igbo dị asatọ. Ha bụ ndị a:

A      E      I       Ị       O      Ọ      U      Ụ

E kewara udaume Igbo ụzọ abụọ: Ha bụ ndi a:

a. Ụdamfe (Otu A):  a    ị     ọ    ụ

b. Ụdaarọ (Otu E):   e   i    o   u

       Iji ha mee mkpụrụokwu

OTU  A

OTU  E

Aki

Eku

Azụ

Ozi

Ịtụ

Obe

Ọnụ

Ube

Ụzọ

Udo

 

5.2 MGBOCHIUME (CONSONANT)

        Mgbochiume bụ mkpụrụ Abịchịị ndị fọrọ ka e wepụchara ụdaume.

Mgbochiume bụ mkpụrụ ụdaasụsụ ana-enwe Mgbochi n’ ikuku so mkpọpụta ha site na mmetụkọ ogan okwu na ibe ya.

        Mgbochiume Igbo dị iri abụọ na asatọ. Ha bụ ndị a:

b      ch     d      f       g      gb    gh    gw    h

j       k      kp     kw    l       m     n      ṅ      nw

ny     p      r       s       sh     t       v      w      y

z.

5.3   ỤDAMKPI (TWICE LETTER)

E nwere mkpụrụ Abịchịị ndị gbara mkpi. Ha dị Itoolu. Ha bụ ndị a: ch,  gb,  gh, gw,  kp,     kw,  nw,  ny,    sh.

 

5.4 MKPỤRỤ ABỊCHỊỊ NGE (SINGLE LETTERS)

Ndị ọzọ na-abataghị na ndị gbara mkpi ka a na-akpọ Abịchịị Nge. Ha bụ ndị a: Ha dị iri abụọ na asaa (27).

a      b      d      e      f

g      i       ị       k      l

m     n      ṅ      o      ọ

p      r       s       t       u

ụ      v      w      y      z

 

5.5 MYIRIỤDAUME (SYLLABIC NASALS)

        Myiriụdaume bụ mkpụrụasụsụ ndị ahụ yiri udaume na mkpọpụta. Ya bụ mgbe a na-akpọ ha n’ odide, ha bụ mgbochiume. Myiriụdaume di naani abụọ ndi a “M” na “N”.

Ọmụmaatụ

M

N

Mmiri

Nne

Mmanụ

Nna

Mma

Nnụnụ

Mmadụ

Nzụkọ

 

ISI NKE ỊSỊỊ

AKARA EDEMEDE (PUNCTUATION MARKS)

6.1 NKỌWA AKARA EDEMEDE

        Akara edemede bụ akara dị iche iche a na-etinye n’ ihe e dere ede iji zipụta mkpọpụta, ụda, ọrụ na nghọta ya n’ ụzọ doro anya. Akara edemede bụ akara ndị ahụ anyi na-etinye n’ ahịrịokwu ka ha gosi ebe anyi kuru ume, ebe anyi jụrụ ajụjụ, ebe anyi tiri mkpu.dgz. itinye akara edemede dịka ha kwesiri dị nnukwu mkpa iji mee ka ghara inwe nghọtahie n’ ihe edere.

 

6.2 ỤDḷ AKARA EDEMEDE Dḷ ICHE ICHE

Akara edemede

Aha Igbo ha

Aha bekee ha

.

Kpọm

Full stop

,

Rikọm

Comma

:

Kpọm kpọm

Colon

;

Kpọmrịkọm

Semi colon

?

Akara ajụjụ

Question mark

!

Akara mkpu

Exclamation mark

n'

Rịkọm elu

Apostrophe

 

Akara uhie

Hyphen

“  ”

Rịkọm ngwu

Quotation mark

(  )

Akara mgbodo

Bracket

/ / ____

Akara udaolu

Tone mark

Akara nkwubiri

Ellipsis

Akara mmagba

Omission

                     

 

6.3 NKỌWA ỤDỊ AKARA EDEMEDE Dḷ ICHE ICHE

A. KPỌM [ .]

Kpọm bụ ntụpọ a na-etinye iji gosi nkwusi ahịrịokwu nke na-abụghị mkpu ma ọ bụ ajụjụ.

Ọmụmaatụ:

1. Nkechi jere ahia.

2. Mmadụka riri nri.

3. Mmiri na-ezo n’ udu mmiri.

4. Nne m mara mma.

5. Ahụ m bụ obi.

        A na- etinyekwa kpọm n’ aha mkpirisi ma ọ bụ iji gosi okwu a na- ederughị n’ isi.

Ọmụmaatụ:

i. Mz. (maazi)

ii. N.A. Nwafor

iii. W.A.E.C = West African Examination Council

iv. dgz. = diri gawazie

v. ork = Oriaku

vi. G.C.E = General Certificate Examination

vii. Rv. = Reverend

 

B. RỊKỌM [,]

Rịkọm bụ akara edemede eji gosi nkuru ume tupu ekwutọpụ ihe a na-ekwu.

Ọmụmaatụ:

i. Adakụ zụtara ji, ede, mmanụ, nnu na azụ, mgbe o jere ahia.

ii. Ha gakatara ije, gbawa ọsọ.

iii. Anyi gara ahia, ma anyi ahụghi nnu ka anyi ji ahụ ose.

iv. Ọ gbagidoro ọsọ, o wee daa.

v. E ruo ọnịcha, a ga-ahụ osimiri Naija.

 

Ch. KPỌM KPỌM[:]

E ji kpọmrịkọm egosi ebe okuku ume toturu eto, ebe a jịkọrọ usoro okwu dị iche iche, ndị na-ekwụ maka otu ihe na ndị gaara ịbụ ahịrịokwu nọọrọ onwe ha iche iche ma a bịa zia jikọta ha ọnụ.

Ọmụmaatụ:

i. Ọ zụtara ihe ndi a: akara, agidi, azụ na ogili.

ii. Nke a bụ ndi so ya bia: mmadụka, Nkechi na Onyinye.

iii. O nyere onyinye dị iche dika: moto, ego na akwa.

iv. Ụbọchi ahụ aṅụri ekwughị onye ọ bụla rie nri: Ụmụ akwụkwọ anyi niile gafere n’ ule Igbo.

v. Ndị gara ahia bụ ndị a: Mmesọma, Ndidi, na Nneameka.

 

D. KPỌMRỊKỌM [;]

Nke a na-ekewa ahịrịokwu abụọ zuru ezu ma ha enweghị njiko n’ etiti ha.

 

Ọmụmaatụ:

i. Onyinye mụrụ nwa; nwoke ka ọ mụrụ.

ii. Nkechi zara ụlọ; ọ chọrọ ihi ụra

iii. Nne ya were iwe; narakwa ya ihe ya.

iv. A hụ kwghịị na-egbu okenye; e kwuo a nụghịị na-egbu nwata.

v. Ahụ adịghị ya; ọ gawala ụlọ ọgwụ.

 

E. AKARA AJỤJỤ [?]

Akara ajụjụ bụ akaraedemede eji akara ajụjụ egosi nkwusi ebe a jụrụ ajụjụ

Ọmụmaatụ:

i. Gini bụ aha gị?

ii. Kedụ ka ịmere?

iii. Chisom ọ nọ n’ ụlọ?

iv. Mmadụ ole biara?

v. Gịnị na-eme gị?

 

F. AKARA MKPU [!]

A na-etinye akara mkpu iji gosi ihe eji iti mkpu kwụpụta dị ka okwu dapụtara mmadụ n’ ọnụ na mberede site n’ ihe mere n’ ike, na mwute, n’ ujo maọbụ na nkụja.

 

Ọmụmaatụ:

i. Hia! Ọkụ anyụọ.

ii. Chei! Ọnwụ dị egwu.

iii. Onyinye o!

iv. Chimu o o o!

v. Hey! Were nwayọọ.

G. RỊKỌM ELU [n’]

Rịkọm elu dị ụzọ abụọ. Nke mbu bụ nke eji ezipụta mbuụzo.

 

Ọmụmaatụ

i. Ewu nọ n’ elu ụlọ.

ii. Nkechi bi n’ aba.

iii. Ụlọ ha dị n’ ahia.

iv. Jisọs gara ije n’ elu mmiri.

v. Uwe m dị n’ ime akpati.

       Nke abụọ bụ nke eji ezipụta mgbochiume dị ka

i. Azụ dị na mmiri.

ii. Ngozi bi na legosi.

iii. Ụkwụ ya kụtụrụ na bọọlụ.

iv. Uwe m dabara na mmiri.

v. Amaka bi na Nnewi.

GB. AKARA UHIE [-]

Akara uhie na-apụtakari n’ ahịrịokwu oge ọ na- arụ ọrụ dị ka nyemakangwaa.               

Ọmụmaatụ:

i. Ada na-azụ ụlọ.

ii. Nwata ahụ ka ga – eje ije.

iii. Uchenna ga – esi ofe echi.

iv. Nwanne m na – asụ ede.

v. Onye isi ụlọ m na – ede ihe n’ akwụkwọ.

ISI NKE ASAA

7.1 AHỊRỊOKWU (SENTENCE)

        Ahịrịokwu bụ mkpụrụokwu ole na ole gara n’ ezigbo usoro nwere ngwaa, echiche nanghọta zuru oke. Ka ahịrịokwu wee zuo ezigbo oke, ọ ga – enweriri onye maọbụ ihe ọ na-ekwu maka ya nwekwa ihe ekwuru maka onye ma ọ bụ ihe ahụ.

Ọmụmaatụ:

i. Nụọ

ii. Rie

iii. Taa

iv. Obi bi n’ legosu.

v. Nkechi jere ahia.

 

7.2 ỤDḷ AHỊRỊOKWU IGBO ENWERE

1. Ahịrịmfe (Simple sentence)

2. Ahịrịnha (Compund sentence)

3. Ahịrịukwu (Multiple sentence)

4. Ahịrịmgbagwo (Complex sentence)

5. Ahịrịajụjụ (Interrogative sentence)

 

7.3 NKỌWA IHE BỤ AHḷRḷMFE

Ahịrịmfe bụ ahịrịokwu na – enwe naanị otu ngwaa nke na – ezipụta naanị otu echiche na nghọta.

Ọmụmaatụ:

a. Obi churu mmiri.

b. Okeke jere ahia.

ch. O gwuru mmiri.

d. Ada gbara ọsọ.

e. Chisom na – achi ọchị.

 

Ọmụmaatụ:

S/N

Ahịrịmfe Nkwe

Ahịrịmfe Nju

i.

Obi Churu mmiri

Obi echughị mmiri

ii.

Okeke jere ahia

Okeke ejeghị ahia

iii.

O gwuru mmiri

O gwughị mmiri

iv.

Ada gbara ọsọ

Ada gbaghị ọsọ

v.

Chisom na-achị ọchị

Chisom anaghị achị ọchị

vi.

Uche bụ Ụkọchukwu

Nche abụghị Ụkọcukwu

vii.

Azubuike zuru ohi

Azubuike ezughị ohi

viii.

Ada bụ nwa chukwu

Ada abụghi nwa chukwu

ix.

O nwere ego

O nweghị ego

x.

Ebere siri ofe Akwụ

Ebere esighị ofe Akwụ

xi

Ọriakụ nwere Ugboelu

Ọriakụ enweghị Ugboelu

 

 

ISI NKE ASATỌ

NRỤKỌRỊTA ỌRỤ NA URU Ọ BABA

8.1 NKỌWA IHE BỤ NRỤKỌRỊTA ỌRỤ

        Nrụkọrịta ọrụ bụ mmadụ na ibe ya inọrọ n’ otu ụlọ ọrụ na arụkọrịta ọrụ. N’ ụlọ ọrụ di iche iche a na – adị ọtụtụ mmadịị na – arụkọrịta ọrụ. N’ ụlọ ọrụ ụfọdụ ọ na – abụ naanị ụmụnwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyi.

        Nrụkọrịta ọrụ na – aka nke ọzọ bụ mgbe mmadu abụọ ma ọ bụ karịa tụrụ arọ, kwe kọrịta na ha ga-adị na enyere onwe ha aka.

        Ọmụmaatụ: Ọrụ mmadụ abụọ ma ọ bụ karia bụ ndị a:

i. Ichụ nta.

ii. Ọrụ ugbo

iii. Ọrụ isụ akwa

iv. Iza ụlọ

v. Isụ mmanụ nri dgz

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

8.2 URU Dḷ NA NRỤKỌRỊTA ỌRỤ

1. Ime ka ọrụ dị mfe: Nrụkọrịta ọrụ na – eme ka ọrụ ahụ dị mfe.

2. Iweta obi Aṅụrị: N’ ebe a dị ọtụtụ mmadụ na – amụ mee ka iwe onye ọ dị n’ obi dajụọ. A rụkata ọrụ e zurutụ ike nọ kọọ kpa amụ dị na ya.

3. Iweta Agbammbo: Ebe ọ bụla enwere ọtụtụ mmadụ na-arụkọrita ọrụ ọnụ, a gana – enwe agbammbo.

4. Iweta ịdị Uchu: Ịdị uchu ọrụ bụ mmadu igba mbo were ọrụ ọna – arụ dịka ọrụ nke aka ya.

5. Ikwalite mmekọrịta mmadụ Na Ibe ya: Ụfọdu mmadụ anaghị enwe ezi mmekọrịta n’ ezinaụlọ na mana, Ezi mmekọrịta dị n’ ụlọ ọrụ na ezinaụlọ, ọganịịhụ ga na-adị n’ ụlọ ọrụ ahụ nakwa azinaụlọ.

 

8.3 ỌGHỌM Dḷ N’ ỊRỤKỌRITA ỌRỤ

1. Ụfụ Anya: Ụfọdụ na – atajiri ibe na anya n’ ihi na e buliri ha n’ okwa kari ha.

2. Akpọmasị: Ụfọdụ ndị ọrụ ahụ na – akpọ onwe ha asi.

3. Ọgba Agbara: Ọ bụrụ ụlọ ọrụ ebe enweghị mmekọrịta, ndị ajọ mmadụ n’ ime ha na- agba mbọ mebie obi ndị na – arụsị ọrụ ike wee ka e nwee ọgba aghara.

4. Idọghachi ụlọ ọrụ Azụ: Ụfọdụ ụlọ ọrụ nwere ọtụtụ ndi njọ mmadụ na – adọla ụlọ ọrụ ahụ azụ.

 

ISI NKE ITOOLU

NTỤGHARỊ AHḷRḷOKWU (TRANSLATION)

9.1 NKỌWA NTỤGHARỊ:

        Ntụgharị bụ ịsụgharị ihe dị n’otu asụsụ ka ọ dị n’asụsụ ọzọ, ka echiche, nghọta na mpụtara ya bụrụ otu.

9.2 IHE MGBAKWASA UKWU MAKA NTỤGHARỊ

1. Gụọ ihe enyere gi ọtụtụ ugboro iji mata echiche na ebmnuche di na ya.

2. Ntụgharị mkpụrụokwu ga-adị na mkpụrụokwu nke ahịrịokwu ga- adi n’ ahịrịokwu nke nkeji edemede ga- adịkwa na nkeji edemede. (paragraph)

3. Na ntụgharị, a gaghi etinye echiche ọzọ ma ọ bụ wepụ ewepu. Ọmụmaatụ:

 “ He went to the market” ga- abụ “Ọ gara ahia” Ọ gaghị abụ  “Ọ gara igote ihe n’ ahịa”.

4. E nwere ilu, akpalaokwu na atụmatụ okwu bekee a ga-eji nke igbo ya na nke bekee ahụ nwere otu  echiche na mpụtara tụgharịa ya.

Ọmụmaatụ:

 “A stitch in time, saves nine” ga- abụ “E mee ngwa ngwa emeghara ọdachị” “There is no smoke without fire” ga- abụ “Awọ anaghị agha ọsọ ehihie n’efu”.

 

9.3 NTỤGHARỊ IHE EDERE NA BEKEE N’IGBO

Bekee

Igbo

Bread

Achicha

Time

Oge

O’clock

Elekere

Minute

Nkeji

Tall

Ogologo

Male

Nwoke

White

Ọcha

Truth

Eziokwu

Water

Mmiri

December

Disemba

November

Novemba

October

Ọktoba

Sunday

Sonde

Tuesday

Tuzudee

Assignment

Ihe omume

Reported

Okwungwon

Plural

Ụbara

Singular

Mkpolu

Padlock

Igodo

Paragraph

Nkeji edemede

Sentence

Ahịrịokwu

Teacher

Onyenkuzi

Food

Nri

Moon

Ọnwa

Poem

Abụ

 

9.4 NTỤGHARỊ AHỊRỊOKWU NA ILU.

 

Bekee

Igbo

1.

I should have come there.

A garam abịa ebe ahu.

2.

Adamma has take in.

Adamma adila ime.

3.

Nkechi went to market.

Nkechi jere ahịa.

4.

She bought some meat.

Ọ zụtara anụ.

5.

There is no smoke without fire.

Awọ anaghị agba ọsọ ehihie n’efu.

6.

The man gave me one thousand naira.

Nwoke ahụ nyere m otu  puku naira.

7.

His uncle deliberately stood up.

Nwanne nna ya nke nwoke kpachara anya kwuru ọtọ.

8.

The patient's dog eats the fattest bone.

Onye ndidi na- eri azụ ukpoo.

9.

Ngozi took the first position.

Ngozi gbara onye nke mbu.

10.

Obi is the son of the soil.

Obi bụ nwa amaala.

 

 

ISI NKE IRI

AHỤIKE NDḷ NTỌRỌBỊA

10.1 NKỌWA MAKA NDḷ NTỌRỌBḷA

        Ntọrọbia bụ ndị gbara bido n’ afọ iri na asatọ wee ruo ihe dịka afọ iri atọ. Ọ bụrụ onye nwaanyị anyi akpọọ ya nwa aghọghọbịa.

        Ahụike pụtara oge mmadụ enweghiọrịa ọ bụla na-enye ya nsogbu, iri ezigbo nri na inwe ezumiike na-eme ka mmadụ nwee ahụike oge niile.

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

10.2 Mgbanwe n’ ahụ Ntọrọbịa

        Mgbe mmadụ si na nwa baa na ntọrọbịa, a na-ahụ ihe mgbanwe ndị a n’ahụ ha:

1. Olu ha na-agbanwe: Olu ha na-adabu gịrịgịrị ga-agbanwe na-edekpuzi edekpu olu ha ga-esi n’ olu nwanta wee dawazie ka olu nna ma ọ bụ nne.

2. Ụtọ Ha: Ha ga-adị ka ihe a manyere eriri dọtia ya ogologo. Ha na-ala n’ elu wee toruo etu onye ahụ ga-etodebe.

3. Aji digasi ha n’ ahụ: Aji digasi ha n’ ahụ ga-eto na-eji oji.

4. Omume ha na-agbanwe.

5. Ịchọwa mmekọrịta Nwoke na Nwaanyị: Ha ga-ebido pinyewere onwe ha anya.

 

10.3 ỌRḷA Dḷ ICHE ICHE

1. Ọrịa mmekọrịta nwoke Na Nwaanyi dika HIV/AIDS, Ọria nsi nwaanyi, na ọkọ ọjọọ.

2. Ọrịa iba: Nke a bu ọrịa zuru ọha niile ọnụ n’ ala ndị isi ojii ebe anwunta na-ata ọ dịghị onye ọ bụla ọ họrọ.

3. Ọrịa Taifọịdị: Ọrịa bụkwa ọria so emesi ndị ntọrọbịa ike

4. Ọrịa Hapataitiisi: Ọrịa sokwa n’ ihe ndị ntọrọbịa na-aria. Ndị ụfọdụ na-akpọ ya ịba ojii.

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

10.4 ỤZỌ MGBOCHI ỌRỊA NDḷ A

1. Ịgbara mmekọrịta nwoke na Nwaanyị ọsọ.

2. Ọrịa ibe: Ha nwekwara ike na- agba ọgwụ ndị na – egbu anwunta ka ọ ghara ita ha.

3. Ndebe onwe na gburugburu ọcha.

5. Igba ọgwụ mgbochi.

ISI NKE IRI NA OTU

ỌNỤỌGỤGỤ (Numerals) (1-500)

11.1 NKỌWA ỌNỤỌGỤGỤ

        Ọnụọgụgụ bụ usoro ọgụgụ n’ igbo. Ọnụogụgụ so n’ otu n’ ime nkeji asụsụ e nwere n’ igbo. Eji ọnụọgụgụ ezipụta ole ihe dị. Nwekwa nke a na-agụ n’ ụzọ ego dịka kobo, Naira abụọ.

ỌMỤMAATỤ

 

BEKEE

IGBO

0

Efu

1

Otu

2

Abụọ

3

Atọ

4

Anọ

5

ise

6.

ịsịị

7.

Asaa

8

Asatọ

9

Itoolu

10

Iri

11

Iri na otu

12

Iri na abụọ

13

Iri na atọ

14

Iri na anọ

15

Iri na ise

16

Iri na ịsịị

17

Iri na asaa

18.

Iri na asatọ

19

Iri na itoolu

20

Iri abụọ

21

Iri abụọ na otu

22.

Iri abụọ na abụọ          

 

23

Iri abụọ na atọ

24

Iri abụọ na anọ

25

Iri abụọ na ise

26

Iri abụọ na ịsịị

27

Iri abụọ na asaa

28

Iri abụọ na asatọ

29

Iri abụọ na itoolu

30

Iri atọ

31

Iri atọ na otu

32

Iri atọ na abụọ

33

Iri atọ na atọ

34

Iri atọ na anọ

35

Iri atọ na ise

36

Iri atọ na ịsịị

37

Iri atọ na asaa

38

Iri atọ na asatọ

39

Iri atọ na itoolu

40

Iri anọ

41

Iri anọ na otu

42

Iri anọ na abụọ

43

Iri anọ na atọ

44

Iri anọ na anọ

45

Iri anọ na ise

46

Iri anọ na ịsịị

47

Iri anọ na asaa

48

Iri anọ na asatọ

49

Iri anọ na itoolu

50

Iri ise

51

Iri ise na otu

52

Iri ise na abụọ

53

Iri ise na atọ     

 

54

Iri ise na anọ

55

Iri ise na ise

56

Iri ise na ịsịị

57

Iri ise na asaa

58

Iri ise na asatọ

59

Iri ise na itoolu

60

Iri ịsịị

61

Iri ịsịị na otu

62

Iri ịsịị na abụọ

63

Iri ịsịị na atọ

64

Iri ịsịị na anọ

65

Iri ịsịị na ise

66

Iri ịsịị na ịsịị

67

Iri ịsịị na asaa

68

Iri ịsịị na asatọ

69

Iri ịsịị na itoolu

70

Iri asaa

71

Iri asaa na otu

72

Iri asaa na abụọ

73

Iri asaa na atọ

74

Iri asaa na anọ

75

Iri asaa na ise

76

Iri asaa na ịsịị

77

Iri asaa na asaa

78

Iri asaa na asatọ

79

Iri asaa na itoolu

80

Iri asatọ

81

Iri asatọ na otu

82

Iri asatọ na abụọ

83

Iri asatọ na atọ

84

Iri asatọ na anọ         

85

Iri asatọ na ise

86

Iri asatọ na ịsịị

87

Iri asatọ na asaa

88

Iri asatọ na asatọ

89

Iri asatọ na itoolu

90

Iri itoolu

91

Iri itoolu na otu

92

Iri itoolu na abụọ

93

Iri itoolu na atọ

94

Iri itoolu na anọ

95

Iri itoolu na ise

96

Iri itoolu na ịsịị

97

Iri itoolu na asaa

98

Iri itoolu na asatọ

99

Iri itoolu na itoolu

100

Otu nari

101

Nari na otu

102

Nari na abụọ

103

Nari na atọ

104

Nari na anọ

105

Nari na ise

106

Nari na ịsịị

107

Nari na asaa

108

Nari na asatọ

109

Nari na itoolu

110

Nari na iri

111

Nari na iri na otu

112

Nari na iri  na abụọ

113

Nari na iri  na atọ

114

Nari na iri  na anọ

115

Nari na iri  na ise      

 

116

Nari na iri  na ịsịị

117

Nari na iri  na asaa

118

Nari na iri  na asatọ

119

Nari na iri  na itoolu

120

Nari na iri abụọ

121

Nari na iri abụọ na otu

122

Nari na iri abụọ na abụọ

123

Nari na iri abụọ na atọ

124

Nari na iri abụọ na anọ

125

Nari na iri abụọ na ise

126

Nari na iri abụọ na ịsịị

127

Nari na iri abụọ na asaa

128

Nari na iri abụọ na asatọ

129

Nari na iri abụọ na itoolu

130

Nari na iri atọ

131

Nari na iri atọ na otu

132

Nari na iri atọ na abụọ

133

Nari na iri atọ na atọ

134

Nari na iri atọ na anọ

135

Nari na iri atọ na ise

136

Nari na iri atọ na ịsịị

137

Nari na iri atọ na asaa

138

Nari na iri atọ na asatọ

139

Nari na iri atọ na itoolu

140

Nari na iri anọ

141

Nari na iri anọ na otu

142

Nari na iri anọ na abụọ

143

Nari na iri anọ na atọ

144

Nari na iri anọ na anọ

145

Nari na iri anọ na ise

146

Nari na iri anọ na ịsịị           

147

Nari na iri anọ na asaa

148

Nari na iri anọ na asatọ

149

Nari na iri anọ na itoolu

150

Nari na iri ise

151

Nari na iri ise na otu

152

Nari na iri ise na abụọ

153

Nari na iri ise na atọ

154

Nari na iri ise na anọ

155

Nari na iri ise na ise

156

Nari na iri ise na ịsịị

157

Nari na iri ise na asaa

158

Nari na iri ise na asatọ

159

Nari na iri ise na itoolu

160

Nari na iri ịsịị

161

Nari na iri ịsịị na otu

162

Nari na iri ịsịị na abụọ

163

Nari na iri ịsịị na atọ

164

Nari na iri ịsịị na anọ

165

Nari na iri ịsịị na ise

166

Nari na iri ịsịị na ịsịị

167

Nari na iri ịsịị na asaa

168

Nari na iri ịsịị na asatọ

169

Nari na iri ịsịị na itoolu

170

Nari na iri asaa

171

Nari na iri asaa na otu

172

Nari na iri asaa na abụọ

173

Nari na iri asaa na atọ

174

Nari na iri asaa na anọ

175

Nari na iri asaa na ise

176

Nari na iri asaa na ịsịị

177

Nari na iri asaa na asaa    

 

178

Nari na iri asaa na asatọ

 

179

Nari na iri asaa na itoolu

 

180

Nari na iri asatọ

 

181

Nari na iri asatọ na otu

 

182

Nari na iri asatọ na abụọ

 

183

Nari na iri asatọ na atọ

 

184

Nari na iri asatọ na anọ

 

185

Nari na iri asatọ na ise

 

186

Nari  iri asatọ na ịsịị

 

187

Nari  iri asatọ na asaa

 

188

Nari  iri asatọ na asatọ

 

189

Nari  iri asatọ na itoolu

 

190

Nari iri itoolu

 

191

Nari iri itoolu na otu

 

192

Nari iri itoolu na abụọ

 

193

Nari iri itoolu na atọ

 

194

Nari iri itoolu na anọ

 

195

Nari iri itoolu na ise

 

196

Nari iri itoolu na ịsịị

 

197

Nari iri itoolu na asaa

 

198

Nari iri itoolu na asatọ

 

199

Nari iri itoolu na itoolu

 

200

Nari abụọ

 

201

Nari abụọ na otu

 

202

Nari abụọ na abụọ

 

203

Nari abụọ na atọ

 

204

Nari abụọ na anọ

 

205

Nari abụọ na ise

 

206

Nari abụọ na ịsịị

 

207

Nari abụọ na asaa

 

208

Nari abụọ na asatọ           

 

209

Nari abụọ na itoolu

210

Nari abụọ na iri

211

Nari abụọ na iri na otu

212

Nari abụọ na iri na abụọ

213

Nari abụọ na iri na atọ

214

Nari abụọ na iri na anọ

215

Nari abụọ na iri na ise

216

Nari abụọ na iri na ịsịị

217

Nari abụọ na iri na asaa

218

Nari abụọ na iri na asatọ

219

Nari abụọ na iri na itoolu

220

Nari abụọ na iri abụọ

221

Nari abụọ na iri abụọ abụọ na otu

222

Nari abụọ na iri abụọ na abụọ

223

Nari abụọ na iri abụọ na atọ

224

Nari abụọ na iri abụọ na anọ

225

Nari abụọ na iri abụọ na ise

226

Nari abụọ na iri abụọ na ịsịị

227

Nari abụọ na iri abụọ na asaa

228

Nari abụọ buo na iri abụọ na asatọ

229

Nari abụọ na iri abụọ na itoolu

230

Nari abụọ na iri atọ

231

Nari abụọ na iri atọ na otu

232

Nari abụọ na iri atọ na abụọ

233

Nari abụọ na iri atọ na atọ

234

Nari abụọ na iri atọ na anọ

235

Nari abụọ na iri atọ na ise

236

Nari abụọ na iri atọ na ịsịị

237

Nari abụọ na iri atọ na asaa

238

Nari abụọ na iri atọ na asatọ

239

Nari abụọ na iri atọ na itoolu  

       

 

240

Nari abụọ na iri anọ

241

Nari abụọ na iri anọ na otu

242

Nari abụọ na iri anọ na abụọ

243

Nari abụọ na iri anọ na atọ

244

Nari abụọ na iri anọ na anọ

245

Nari abụọ na iri anọ na ise

246

Nari abụọ na iri anọ na ịsịị

247

Nari abụọ na iri anọ na asaa

248

Nari abụọ na iri anọ na asatọ

249

Nari abụọ na iri anọ na itoolu

250

Nari abụọ na iri ise

251

Nari abụọ na iri ise na otu

252

Nari abụọ na iri ise na abụọ

253

Nari abụọ na iri ise na atọ

254

Nari abụọ na iri ise na anọ

255

Nari abụọ na iri ise na ise

256

Nari abụọ na iri ise na ịsịị

257

Nari abụọ na iri ise na asaa

258

Nari abụọ na iri ise na asatọ

259

Nari abụọ na iri ise na itoolu

260

Nari abụọ na iri ịsịị

261

Nari abụọ na iri ịsịị na otu

262

Nari abụọ na iri ịsịị na abụọ

263

Nari abụọ na iri ịsịị na atọ

264

Nari abụọ na iri ịsịị na anọ

265

Nari abụọ na iri ịsịị na ise

266

Nari abụọ na iri ịsịị na ịsịị

267

Nari abụọ na iri ịsịị na asaa

268

Nari abụọ na iri ịsịị na asatọ

269

Nari abụọ na iri ịsịị na itoolu

270

Nari abụọ na iri asaa         43

271

Nari abụọ na iri asaa na otu

272

Nari abụọ na iri asaa na abụọ

273

Nari abụọ na iri asaa na atọ

274

Nari abụọ na iri asaa na anọ

275

Nari abụọ na iri asaa na ise

276

Nari abụọ na iri asaa na ịsịị

277

Nari abụọ na iri asaa na asaa

278

Nari abụọ na iri asaa na asatọ

279

Nari abụọ na iri asaa na itoolu

280

Nari abụọ na iri asatọ

281

Nari abụọ na iri asatọ na otu

282

Nari abụọ na iri asatọ na abụọ

283

Nari abụọ na iri asatọ na atọ

284

Nari abụọ na iri asatọ na anọ

285

Nari abụọ na iri asatọ na ise

286

Nari abụọ na iri asatọ na ịsịị

287

Nari abụọ na iri asatọ na asaa

288

Nari abụọ na iri asatọ na asatọ

289

Nari abụọ na iri asatọ na itoolu

290

Nari abụọ na iri itoolu

291

Nari abụọ na iri itoolu na otu

292

Nari abụọ na iri itoolu na abụọ

293

Nari abụọ na iri itoolu na atọ

294

Nari abụọ na iri itoolu na anọ

295

Nari abụọ na iri itoolu na ise

296

Nari abụọ na iri itoolu na ịsịị

297

Nari abụọ na iri itoolu na asaa

298

Nari abụọ na iri itoolu na asatọ

299

Nari abụọ na iri itoolu na itoolu

300

Nari atọ

301

Nari atọ na otu       

 

302

Nari atọ na abụọ

303

Nari atọ na atọ

304

Nari atọ na anọ

305

Nari atọ na ise

306

Nari atọ na ịsịị

307

Nari atọ na asaa

308

Nari atọ na asatọ

309

Nari atọ na itoolu

310

Nari atọ na iri

311

Nari atọ na iri na otu

312

Nari atọ na iri na abụọ

313

Nari atọ na iri na atọ

314

Nari atọ na iri na anọ

315

Nari atọ na iri na ise

316

Nari atọ na iri na ịsịị

317

Nari atọ na iri na asaa

318

Nari atọ na iri na asatọ

319

Nari atọ na iri na itoolu

320

Nari atọ na iri abụọ

321

Nari atọ na iri abụọ na otu

322

Nari atọ na iri abụọ na abụọ

323

Nari atọ na iri abụọ na atọ

324

Nari atọ na iri abụọ na anọ

325

Nari atọ na iri abụọ na ise

326

Nari atọ na iri abụọ na ịsịị

327

Nari atọ na iri abụọ na asaa

328

Nari atọ na iri abụọ na asatọ

329

Nari atọ na iri abụọ na itoolu

330

Nari atọ na iri atọ

331

Nari atọ na iri atọ na otu

332

Nari atọ na iri atọ na abụọ

333

Nari ato na iri atọ na atọ        

 

334

Nari atọ na iri atọ na anọ

335

Nari atọ na iri atọ na ise

336

Nari atọ na iri atọ na ịsịị

337

Nari atọ na iri atọ na asaa

338

Nari atọ na iri atọ na asatọ

339

Nari atọ na iri atọ na itoolu

340

Nari atọ na iri anọ

341

Nari atọ na iri anọ na otu

342

Nari atọ na iri anọ n a abụọ

343

Nari atọ na iri anọ na atọ

344

Nari atọ na iri anọ na anọ

345

Nari atọ na iri anọ na ise

346

Nari atọ na iri anọ na ịsịị

347

Nari atọ na iri anọ na asaa

348

Nari atọ na iri anọ na asatọ

349

Nari atọ na iri anọ na itoolu

350

Nari atọ na iri ise

351

Nari atọ na iri ise na otu

352

Nari atọ na iri ise na abụọ

353

Nari atọ ato na iri ise na atọ

354

Nari atọ na iri ise na anọ

355

Nari atọ na iri ise na ise

356

Nari atọ na iri ise na ịsịị

357

Nari atọ na iri ise na asaa

358

Nari atọ na iri ise na asatọ

359

Nari atọ na iri ise na itoolu

360

Nari atọ na iri ịsịị

361

Nari atọ na iri ịsịị na otu

362

Nari atọ na iri ịsịị na abụọ

363

Nari atọ na iri ịsịị na atọ    

 

364

Nari atọ na iri ịsịị na anọ

365

Nari atọ na iri ịsịị na ise

366

Nari atọ na iri ịsịị na ịsịị

367

Nari atọ na iri ịsịị na asaa

368

Nari atọ na iri ịsịị na asatọ

369

Nari atọ na iri ịsịị na itoolu

370

Nari atọ na iri asaa

371

Nari atọ na iri asaa na otu

372

Nari atọ ato na iri asaa na abụọ

373

Nari atọ na iri asaa na atọ

374

Nari atọ na iri asaa na anọ

375

Nari atọ na iri asaa na ise

376

Nari atọ na iri asaa na ịsịị

377

Nari atọ na iri asaa na asaa

378

Nari atọ na iri asaa na asatọ

379

Nari atọ na iri asaa na itoolu

380

Nari atọ na iri asatọ

381

Nari atọ na iri asatọ na otu

382

Nari atọ na iri asatọ na abụọ

383

Nari atọ na iri asatọ na atọ

384

Nari atọ na iri asatọ na anọ

385

Nari atọ na iri asatọ na ise

386

Nari atọ na iri asatọ na ịsịị

387

Nari atọ na iri asatọ na asaa

388

Nari atọ na iri asatọ na asatọ

389

Nari atọ na iri asatọ na itoolu

390

Nari atọ na iri itoolu

391

Nari atọ na iri itoolu na otu

392

Nari atọ na iri itoolu na abụọ

393

Nari atọ na iri itoolu na atọ

394

Nari atọ na iri itoolu na anọ    

 

395

Nari atọ na iri itoolu na ise

396

Nari atọ na iri itoolu na ịsịị

397

Nari atọ na iri itoolu na asaa

398

Nari atọ na iri itoolu na asatọ

399

Nari atọ na iri itoolu na itoolu

400

Nari anọ

401

Nari anọ na otu

402

Nari anọ na abụọ

403

Nari anọ na atọ

404

Nari anọ na anọ

405

Nari anọ na ise

406

Nari anọ na ịsịị

407

Nari anọ na asaa

408

Nari anọ na asatọ

409

Nari anọ na itoolu

410

Nari anọ na iri

411

Nari anọ na iri na otu

412

Nari anọ na iri na abụọ

413

Nari anọ na iri na atọ

414

Nari anọ na iri na anọ

415

Nari anọ na iri na ise

416

Nari anọ na iri na ịsịị

417

Nari anọ na iri na asaa

418

Nari anọ na iri na asatọ

419

Nari anọ na iri na itoolu

420

Nari anọ na iri abụọ

421

Nari anọ na iri abụọ na otu

422

Nari anọ na iri abụọ na abụọ

423

Nari anọ na iri abụọ na atọ

424

Nari anọ na iri abụọ na anọ

425

Nari anọ na iri abụọ na ise    

 

426

Nari anọ na iri abụọ na ịsịị

427

Nari anọ na iri abụọ na asaa

428

Nari anọ na iri abụọ na asatọ

429

Nari anọ na iri abụọ na itoolu

430

Nari anọ na iri atọ

431

Nari anọ na iri atọ na otu

432

Nari anọ na iri atọ na abụọ

433

Nari anọ na iri atọ na atọ

434

Nari anọ na iri atọ na anọ

435

Nari anọ na iri atọ na ise

436

Nari anọ na iri atọ na ịsịị

437

Nari anọ na iri atọ na asaa

438

Nari anọ na iri atọ na asatọ

439

Nari anọ na iri atọ na itoolu

440

Nari anọ na iri anọ

441

Nari anọ na iri anọ na otu

442

Nari anọ na iri anọ na abụọ

443

Nari anọ na iri anọ na atọ

444

Nari anọ na iri anọ na anọ

445

Nari anọ na iri anọ na ise

446

Nari anọ na iri anọ na ịsịị

447

Nari anọ na iri anọ na asaa

448

Nari anọ na iri anọ na asatọ

449

Nari anọ na iri anọ na itoolu

450

Nari anọ na iri ise

451

Nari anọ na iri ise na otu

452

Nari anọ na iri ise na abụọ

453

Nari anọ na iri ise na atọ

454

Nari anọ na iri ise na anọ

455

Nari anọ na iri ise na ise

456

Nari anọ na iri ise na ịsịị   

 

457

Nari anọ na iri ise na asaa

458

Nari anọ na iri ise na asato

459

Nari anọ na iri ise na itoolu

460

Nari anọ na iri ịsịị

461

Nari anọ na iri ịsịị na otu

462

Nari anọ na iri ịsịị na abụọ

463

Nari anọ na iri ịsịị na atọ

464

Nari anọ na iri ịsịị na anọ

465

Nari anọ na iri ịsịị na ise

466

Nari anọ na iri ịsịị na ịsịị

467

Nari anọ na iri ịsịị na asaa

468

Nari anọ na iri ịsịị na asatọ

469

Nari anọ na iri ịsịị na itoolu

470

Nari anọ na iri asaa

471

Nari anọ na iri asaa na otu

472

Nari anọ na iri asaa na abụọ

473

Nari anọ na iri asaa na atọ

474

Nari anọ na iri asaa na anọ

475

Nari anọ na iri asaa na ise

476

Nari anọ na iri asaa na ịsịị

477

Nari anọ na iri asaa na asaa

478

Nari anọ na iri asaa na asatọ

479

Nari anọ na iri asaa na itoolu

480

Nari anọ na iri asatọ

481

Nari anọ na iri asatọ na otu

482

Nari anọ na iri asatọ na abụọ

483

Nari anọ na iri asatọ na atọ

484

Nari anọ na iri asatọ na anọ

485

Nari anọ na iri asatọ na ise

486

Nari anọ na iri asatọ na ịsịị

487

Nari anọ na iri asatọ na asaa   

 

 

488

Nari anọ na iri asato na asatọ

489

Nari anọ na iri asato na itoolu

490

Nari anọ na iri itoolu

491

Nari anọ na iri itoolu na otu

492

Nari anọ na iri itoolu na abụọ

493

Nari anọ na iri itoolu na atọ

494

Nari anọ na iri itoolu na anọ

495

Nari anọ na iri itoolu na ise

496

Nari anọ na iri itoolu na ịsịị

497

Nari anọ na iri itoolu na asaa

498

Nari anọ na iri itoolu na asatọ

499

Nari anọ na iri itoolu na itoolu

500

Nari ise

 

ISI NKE IRI NA ABỤỌ

NJḷRḷMARA NA NKENỤDḷ AGỤMAGỤ UGBA A

12.1 NKỌWA AGỤMAGỤ IGBO (Igbo Literature)

        Agụmagụ bụ edemede ma ọ bụ akọrọ akọ nke na-enye obi aṅụri, afọ ojuju, amamihe na mkpalite uche.

        Agụmagụ bụ echiche mmadụ chepụtara n’ obi ya wee dee ya dee ma ọ bụ kwupute ya n’ ọnụ nke na-enye amamihe, mkpalite nke mmụọ, obi ụtọ ma  ọ bụ obi ọjọọ nakwa afọ ojuju.

 

12.2 ỤDḷ AGỤMAGỤ ENWERE

1. Agụmagụ ọdịnaala (Oral Literature)   

2. Agụmagụ ugbua (Written Literature)

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

12.3 NKENỤDḷ AGỤMAGỤ UGBA A

        Agụmagụ ugbu a bụ echiche mmadụ chepụtara ma detuo ya n’ ime akwụkwọ ka onye ọ bụla gụọ ya. Ọ bụ nzimozi nke mmadụ chepụtara n’ uche ma dekwaa ya edee n’ akwụkwọ nke na ezipụta ka ndi si ebi ndu.

        Agụmagụ ugbu a bu enyo ndị igbo ji ahu onwe ha. E kere agụmagụ ugbo a ụzọ atọ. Ha bụ ndị a:

1. idụụazi (Prose)

2. Ejije (Drama)

3. Abụ (Poem)

 

12.4 NJỊRỊMARA AGỤMAGỤ UGBU A

1. A na- ede agụmagụ ugbu a n’ akwụkwọ.

2. Ọ na-enwe aha onye dere ya.

3. A na- egote ya n’ ahia ma na-ejidekwa ya.

4. A na-ama afọ edere akwụkwọ ahụ.

 

12.5 URU AGỤMAGỤ UGBU A BARA

1. Ọ na-eme obi ụtọ.

2. Eji ya akụziri ụmụaka omenala na asụsụ ha.

3. Ọ na-enye ego.

4. Ọ na-ahazi akparamgwa mmadụ.

 

12.6 ỤDḷ AGỤMAGỤ UGBU A ENWERE

i. Idụụazi (Prose): Idụụazi bụ akụkọ ugbu a nke n’ ezipụta ihe na-eme eme na ndu mmadụ, nke merela eme na nke ga-eme eme.

Imaatu:  Jụọ obinna, ihe ọjọọ gbaa afọ, ukwa ruo oge ya. dgz

ii. Ejije (Drama): Ejije bụ emereme nṅomi nke ndị na-eme ya na-esite na nṅomi agwa ha abụghị mee ka ndi mmadụ mụta ihe ma ọ bụ nwee obi ụtọ.

iii. Abụ(Poem): Abụ bụ nzimuozi nke si na obi pụta nke enwere ike

 

dee n’ akwụkwọ ma ọ bụ zịpụta ya n’ ọnụ nke a na-eji okwu ọkpọka ma ọ bụ okwu apiri aka ma ọ bụ nke okwu bụ igbazipụta n’ ụzọ di nke nke

        Enwere ụdị abụ dị, iche iche Ha bụ:

i. Abụ Nwa

ii. Abụ Agha

iii. Abụ Ikpe/Nkọcha

iv. Abụ otito

v. Abụ Akwa/Abụ ariri

vi. Abụ ọrụ

 

ISI NKE IRI NKE ATỌ

EKWUMEKWU BANYERE IHE Dḷ ICHE ICHE ỤMỤAKA NA-EME

13.1 Ihe ụmụaka na-emegasi n’ oge abali, na satọdee, ubochi ụka, n’ oge ezumike

A. Ihe ụmụaka Na-emegasi n’ oge abali:

Onye nkuzi ga-eji ajụjụ jụpụtasia ụmụ akwụkwọ ihe ha na-emegasi n’ oge abali dịka:

1. Inyere nne ha aka sie nri abali. Ụmụnwaanyị na-enyere nne ha aka na-esi nri mbe ụmụnwoke n’inyere nne ha aka sie nri.

2. Ịsụ ụtara akpụ iji maọ bụ gari ma esighee ha bụkwa ụmụnwoke na- eme ya.

3. iburu nri bụgara nna nwe  ụlọ n’obi ya ma ọ bụrụ na nri eghee.

4. ije bụkọrọkwa aria nri nna nwe ụlọ jiri rie nri.

5. ije kute mmri ọṅụṅụ ma mgbe a chọrọ ya ma a ma na- eri nri.

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

13.2

B. Ihe ụmụaka na –eme N’ụbochi satọdee.

1. Ọ bụ satọdee ka ụmụaka ji enyere nne nanna ha aka.

2. Ụmụ aka na- azachasi ebe niile.

3. Ụmụaka na-asụcha akwa ha.

4. Ụfọdụ ji ụbọchị satọdee arụ ihe omume enyere ha mee n’lo akwukwo.

5. Ụfọdụ Ụmụ akwụkwọ jikwa satọdee amụ ihe gbasara ịgba bọọlụ.

 

13.3

CH. Ekwemekwu maka ihe ụmụaka Na-eme N’ụbọchị ụka.

1. Ụmụaka na- eje ụlọ ụka.

2 Ụmụaka bilite n’oge n’ụtụtụ kpee ekpere, zachasia ime ụlọ na ezi – ichu mmiri, inyere nne aka sie nri tupu e jewe uka.

3. Ụmụaka na-eje mkpagharị na be ndi enyi, ndi ikwunne na-ebe ndi ọzọ di ichi iche

4. Ụfọdụ jikwa ụbọchị ụka asụchasi uwe akwụkwọ ha.

5. Ụfọdụ na – amụkwa maka ọgbụgba bọọlụ.

 

13.4

D. Ekwemekwe maka ihe ụmụaka na- eme N’ oge ezumike.

1. Ụfọdụ na -anọrọ ụlọ nyere nne na nna ha aka n’ ọrụ ugbo, n’ịzụ ahia, n’ ahia mbugharị.

2. Ụfọdụ nọ n’ime obodo na –ejiko ọnụ n’otu na –aga ọrụ ugbo igburu ego.

3. Ụfọdụ na-esi n’ime obodo gaara ndị nwe ha ma ọ bụ enyi ha njem ezumike.

4. Ụfọdụ na-esi n’obodo mepere emepe lọta n’ime obodo.

5. Ụfọdụ ndi nwe ụmụaka ha n’ebenleghari anya dị iche iche dị ka: ebe a na- azụ ụmụ anụmanụ, ụlọ oriri na ọṅụṅụ na – ewu ewu. Na ebe a na- akpa ọkụkọ, ehi na azụ.dgz.

 

ISI NKE IRI NA ANỌ.

AGWA ỌMA NA AGWA ỌJỌỌ (Good and bad character).

14.1 NKỌWA AGWA ỌMA.

Agwa ọma bụ mgbe mmadụ na- eme ezigbo omume, na- ekwu eziokwu oge niile. Ọ bụ mmadụ ikpa ezigbo agwa dịka ikele ndị nne na nna ha, ndi toro ya, ndi agbataobi ya, ndị nkuzi ya na ndị mmadụ ọ hụrụ n’ụzọ.

        Ụfọdụ n’ime agwa ọma bụ

i. ikele ekele

ii. iga ozi

iii. ikwu eziokwu

iv. inwe nsọpụrụ.

14.2 NKỌWA AGWA ỌJỌỌ

        Agwa ọjọọ bụ mgbe mmadụ anaghị eme ezigbo omume, ọ dịghị ekwu eziokwu. Ọ bụkwa mgbe mmadụ anaaghị akpa ezigbo agwa dịka itu asi, iku asiri, iwe ihe mmadụ na ike na adịghị ekwu eziokwu oge niile ụfọdụ n’ Agwa ọjọọ.

i. itụ asi

ii. iwe ihe mmadụ

iii. ilu ọgụ

iv. iku Asịrị

v. igbu mmadụ

vi. izu ohi

14.3 URU AGWA ỌMA BARA.

Agwa ọma bara ọtụtụ ezigbo uru dị ka:

i. onye na- akpa agwa ọma na-enweta ezigbo aha.

ii. Ọ na-anata ọtụtụ ihe dị iche iche.

iii. Ọ na-abụ onye eji ama atụ oge niile.

iv. Ọ na-enwe nsọpụrụ na ugwu dịrị ya.

v. Ọ na-eweta nganiihu na ihunanya na-eme mmadụ ibe ya nọ.

vi. Ọ na-ewete ogologo ndụ.

vii. Ọ na-ewete udo na Ezinaụlọ.

 

14.4 ỌGHỌM DI NA AGWA ỌJỌỌ.

1. Ọ na-ewete ajọ aha.

2 Aga na-akpọ onye ahụ ajọ mmadụ.

3. Ọ gaghi enwe ugwu na nsopụrụ.

4. Ndị mmadụ ga-akpọ ya asi.

5. Ọ na-ewete atamaahụhụ.

 

ISI NKE IRI NA ISE

AGUMAGỤ ỌDḷNAALA (ORAL LITERATURE)

15.1 NKỌWA AGỤMAGỤ ỌDḷNAALA

        Agụmagụ bụ echiche miri emi gbasara isiokwu ọ bụla nke ejiri asụsụ nka kọwapụta. Ọ bụkwa echiche n’ okwu nka ndị nnanna anyi, ndi mbu na ndị egede, gbasara ihe ha maara ma ọ bụ ihe ha nụrụ n’ akụkọ ma ọ bụ ha n’ anya.

        Agụmagụ Odinaala bụ naani n’ ọnụ ka ndị gboo na akọ ya. Ọ na- abụkanari nkeesi n’aka ndị okenye wee na -enyefe n’ aka ụmụaka.

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBONKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

 

 

15.2 Ụdịrị Agụmagụ Ọdinaala.

Enwere ngbalaba atọ ndi a:

i. Akụkọ (story)

ii. Abụ (poem)

iii. ejije (play)

 AKỤKỌ N’ AGỤMAGỤ ỌDḷNAALA.

E nwere akụkọ n’ụdị iche iche.

i. Akụkọ ifo.

ii Akụkọ okike.

iiiAkụkọnegwu.

iv. Akụkọ ndiichị.

A. Akụkọ Ifo: Nke abụ akụkọ nke emeghị eme mana a na amụta ọtụtụ ihe n’ime ya. Akụkọ ifo bụ akụkọ ndị ahụ mere n’ ala mmadụ n’ ala mmụọ, n’ala ụmụ anụmanụ. Ọ bụ akụkọ gbasara ihe metụtara ihe chukwu kere eke.

Usoro akụkọ ifo si ebido.

Chakpii ………………………………………………Wọọ

Nkita ṅyara akpa ……………………………….. Nsi agwu na ọha

Enwere akụkọ m ga- akọrọ ụnu ………….kọọrọ anyi ka obi dị anyi mma.

 

Ọmụmaatụ Akụkọ ifo

N’ akụkọ gbasara ọmalinze amaghị aha Eze bi n’otu obodo nke enweghị nwa nwoke. Mana Eze a dupurụ ndị mmadụ Arọchuwku. N’ Arọchukwu ka chukwu gwara ha ihe. Eze ga- eme tupu ya amụta nwa nwoke. Eze mere ihe a gwara ya. Maọbụ site n’ aka nwunye ya ọ kpọrọ asi ka e sịrị nweta nwa nwoke. Nke a mere ka eze kpọghachi nwaanyị ya ahụ, wu oro ya ezigbo ụlọ. Ọ bidokwara hụwa nwaanyị a n’ anya nke ukwu.

 

B. ABỤ: Nke a bụ otu n’ ime agụmagụ ọdịnaala enwere. Ọ bụ n’ ụdị okwu ọnụ ka ana-ekwu ya. Ọ na-adị n’ ọgbara na ọgbara.

Enwere ụdi abụ dị iche iche.

1. Abụ nwa: Imaatụ

Onye mere nwa n’ ebe awa

Egbe merenwa n’ ebe akwa

Weta uziza, weta ose

Weta amala gere nge ofe

Ka ụmu nnụnụ Lachaa ya

Egbe oo, Egbe oo.

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

ii. Abụ Agha: Imaatụ

Nzogbu ……………………. Enyi mba enyi

Nzogbu ……………………. Enyi mba enyi

Zogbuo tigbuo …………. Enyi mba enyi

Zogbuo nwoke …………. Enyi mba enyi

Zogbuo nwaanyi ………. Enyi mba enyi

 

iii. Abụ ọrụ: Imaatụ

Nwa nnụnụ nwa nnụnụ nta

Tụrụzanza, Tụrụnza

Ị nọ nga ahu eme gini?

Turuzanza, Turuzanza

A na m atụrụ nne m ose

Turuzanza, Turuzanza

iv. Abụ Otito

a. Chineke nna, mma mma ekele ee

 Chineke nna, mma mma ekele ee (2X)

 

b. Mma mma dịrị gị, chineke

mma mma dịrị gị, onye oma(2x)

 

Ch. EJIJE: Nke a bụ egwuregwu ndị, ahụ edeghị ede n’ ime akwụkwọ.

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

ii. kpu kpumkpu ogene ……………………………….. Ogene ogene ogene

kpu kpumkpu ogene ……………………………….. Ogene ogene ogene

Onye na-akpu Ogene ……………………………….. Ogene ogene ogene

Mụ na-akpu ogene ……………………………….. Ogene ogene ogene

Moo! Moo! ……………………………….. Ogene ogene

Maa! Maa!  ……………………………….. Ogene ogene

 

15.3 URU AGỤMAGỤ ỌDINAALA BARA

1. Ọ na-eme obi ụtọ.

2. E ji ya akuzịrị ụmụaka omenaala na asụsụ ha.

3. Ọ na-eme ka a nwee ezi mmekọrịta.

4. Ọ na-enya aka imata ndu nna nna anyi ha biri.

5. Ọ na-enya ego dịka ịgụ na ịgba egwu, ịgba mgba, iti mmọnwụ, ịgba bọọlu. dgz

6. Ọ na-eme ka anyị mụta ka esi akọ akụkọ.

15.4 ỌGHỌM Dḷ N’ AGỤMAGỤ ỌDḷNAALA

1. Ọ na-eme ka mmadụ merụọ ahụ dịka mgba a na-achụ ọrọ ma ọ bụ mgbe a na-agba mgba maọbụ bọọlu.

2. Ọ na- eme ka tụọ mmadụ. Ọtụtụ agụmagụ ọdịnaala na-atụ egwu.

3. Ọ na-ebute ịgwọ ọgwụ dịka n’ iti mmanụ.

4. Ọ na-ebute ịkpọ asi dika mgbe mmadụ nụchara ka esi gbuo onye nke ya ma ọ bụ ndị obodo ya. Ịkpọ asị na-adịkwa n’ etiti ndị na-eme egwuregwu.

 

ISI NKE IRI NA ỊSỊỊ

ỊGỤ OGE, ỤBỌCHI, IZU

16.1 NKỌWA IHE BU ỊGỤ OGE (IGBO TIME)

        Ịgụ oge bụ usoro ndị mmadụ ji agwa ibe ha mgba ha chọrọ ime ihe dika mgbe ha chọrọ ije be mmadu, mgbe ha chọrọ ije ọrụ na mgbe ha chọrọ ime ihe ndị ọzọ. dgz

16.2 ETU NDI IGBO SI AGỤ OGE MGBE GBOO

Haji ihe ndi a amata oge.

i. Aka ọrụ: Ha na-eji aka ọrụ ndị ụfọdụ dịka ndị ọkụ azụ, ndị na-ete nkwu were ekwu oge.

ii. Ahịa: Ụfọdụ na-asi, “Bia ma uje ahịa gbabie maobu ahịa lawa”.

iii. Oke ọkụkọ: Ụfọdụ na-asi, “Bia ma oke akụkọ kwaa akwa mbu” ụfọdụ asị “Bia ma ọkụkọ Labasia ụra”.

iv. Anyanwụ: Ụfọdụ na-asi “Bia ma anyanwụ gbajuo igwe maọ bụọ ma onyinyo nọrọ n’ ọbọ ụkwụ.

16.3 ỊGỤ OGE ELEKERE

Ụfọdụ okwu ndị metụtara ọgụgụ oge ndị igbo bụ ndị a:

 

Okwu gbasi ara ya

Related words

Oge

Time

Awa

Hour

Elekere

O’clock

Nkeji

Minute

Izu

Four days

Izu asaa

One month

Afọ

Year

Ntabinaya

Second

Ụtụtụ

Morning

Ehihie

Afternoon

Ọfọduru

To            

 

Ojirila

After

Mgbede

Evening

Ụbọchi

Day

Izuụka

A week

Ọnwa

Month

Ọkara

Half

Taa

Today

Ugbua

Now

Ụnyaahụ

Yesterday

Echi

Tomorrow

Abali

Night

 NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

16.4 ỊGỤ OGE ỤBỌCHỊ

A. Ndị igbo nwere ahia anọ ha na-azụ n’ ala igbo. Ahịa ndị a bụ:

i. Nkwọ

ii. Eke

iii. Ọrie

iv. Afọ

 

        Ha jikwa ahịa ndị a agụ oge. Mmadụ nwere ike si gi, “Bia be m ụbọchị Nkwo na-abịa, eke gaa Eke, taa bu atọ maọbụ echi”.

B. ḷgụ oge izu asaa

Izu asaa dị mkpa na ndu igbo niile. Ya bụ:

Sonde

Monde

Tuuzdee

Wenezdee

Tọọzdee

Fridee

Satọdee

Ch. Ọnwa ole di n’ afọ. Ha bụ ndị a:

Janụari

Febrụari

Maachị

Aprel

Mee

Junu

Julani

Ọgọọstu

Septemba

Ọktoba

Nọvemba

Disemba

 

ISI NKE IRI NA ASAA

EKELE NDḷ IGBO

17.1 NKỌWA EKELE NDI IGBO

        Ndị igbo were ekele dịka nnukwu ihe. N’ etiti ndị igbo, a na-ewe onye anaghị ekele ekele dịka ajọ mmadụ. Ọ bụkwa nkwenye ndị igbo na mmadụ ga-ebu ụzọ kelee onye tọrọ ya.

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

17.2 ỤDỊ EKELE DỊ ICHE ICHE

Ụfọdụ ekele dị iche iche bụ ndị a:

Ekele Utụtụ ---------Ịbọọlachi

                ---------Ịsaalachi

                ---------Ụtụtụ ọma

Ekele Ehihie       --------       Ehihie ọma

                ---------Ndewo

Ekele Abali --------       Abali ọma

                ---------Mgbade ọma

Ekele ma achọọ ilaba ura     --------       Kachifo

                                ---------Kachibọọ

Ekele mmadụ nye gi ihe       --------       Daalu

                                --------       Ndewọ

Ekele Onye na-eme njem     --------       gaa nke ọma

                                --------       Ijee ọma

                                --------       Ịga wala

Ekele onye nlot njem   --------Nnọọ

                                --------Ịbatago

                                --------Ịbiala

Ekele onye na-aga ahịa        --------Ahịaọma

Ekele onye ihe mere    --------Ndo

                                --------Jisie ike

                                --------Nwee ndidi

Ekele onye na-arụ ọrụ  --------Daalụ ọrụ  dgz

                                       

 

ISI NKE IRI NA ASATỌ

NRI NDḷ IGBO NA AHḷA NDḷ IGBO

18.1 AHA NRI NDḷ IGBO Dḷ ICHE ICHE BỤ NDỊ A:

1. Ọka (Maize)

2. Ojoko (Plantain)

3. Ede (Cocoa yam)

4. Osikapa (Rice)

5. Agwa (Beans)

6. Ji (Yam)

7. Abacha (African salad)

8. Akidi (Native beans)

9. Ji nnu (Sweet potato)

10. Akpụ (Cassava)

11. Ụkwa (Bread fruit)

12. Anyụ (Pumpkin)

 

18.2 AHA OFE NDḷ IGBO BỤ NDḷ A:

1. Ofe egwusi (Melon soup)

2. Ofe ọgbọnọ (Ogbono soup)

3. Ofe akwụkwọ nri (vegetable soup)

4. Ofe nsara (Watery soup)

5. Ofe ede (Cocoayam soup)

6. Ofe ọkwụrụ (Okro soup)

7. Ofe banga (Banga soup)

8. Ofe Ọkazi (Okazi soup)

9. Ofe ụtazi (Utazi soup)

10. Ofe ọha (Oha soup)

 

18.3 IHE NDḷ EJI ESI OFE BỤ NDḷ A:

Akwụkwọ nri (vegetables)

Mmanụ nri (Palm oil)

Mmanụ ọkpapa (Vegetable oil)

Egwusi (Melon)

Ose (Pepper)

Nnu (Salt)

Azụ (Fish)

Anụ (Meat)

Yabasi (Onion)

Ede (Cocoayam)

Ero (Mushroom)

Mmiri (Water)

Azụ isha (Crayfish)

 

18.4 IHE NDḷ A NA-AZỤTA N’ AHḷA

Ọpapa (Groundnut)

Mmanụ ọpapa (Groundnut Oil)

Ute (Mat)

Eri (Thread)

Okpu (Cap)

Ude (Pomade)

Ncha (Soap)

Akwa (Cloth)

Ube (Pear)

Oroma (Orange)

Azụ-Ọkpọọ (Dried fish)

Ọka (Maize/Corn)

Mmanu (Oil)

Okporoko (Stock fish)

Bọọlu (Ball)

Efere (Plate)

Ọgụ (Hoe)

Agwa (Beans) wdzg

 

 

ISI NKE IRI NA ITOOLU

19.1 NKỌWA OKWU ỤFỌDỤ GBARA ỌKPỤRỤKPỤ

Enwere ọtụtụ okwu gbara okpụrụkpụ n’ asụsụ igbo: ụfọdụ n’ ime ha bụ ndi a:

 

IGBO

BEKEE

Asambodo

Certificate

Mkposi

Toilet

Nzere

Degree

Ụlọ nga

Prison

Dịmgba

Convulsion

Ụkwara

Cough

Ụkwara nta

Tuberculosis

Ahụ ọcha

Leprosy

Amahia

Tooth ache

Mfu obi

Confidence

Ekwu mmụọ

Shrine

Akancha

Bar of soap

Biko

Excuse

Enyi mmiri

Hippopotamus

Inyinya igwe

Bicycle

Pọmpụ

Tap

Nchu nta

Campaign

Nzụkọ nnọchite anya

House of Representatives

Atụmatụ iwe ego

Appropriation Bill

Ego mmawapụta

Budget

Okwupụta

Speaker

Sineeti

Senate

Agụiyi

Crocodile      

 

Torotoro

Turkey

Obi

Heart

Omenaala

Custom

Omenaala

Tradition

Ewumewu

Institution

Erimekpe

Inheritance

Sekọndịrị

Secondary

Mahadum

University

Koleeji

College

Izu

Area

Ịsọ mpi

Competition

Ọgbọrọgbọdọ

Public society

Inyinya

Horse

Nkọwa ekwu

Dictionary

Njemnlete

Excursion

Ọchịchị onyekwuoucheya

Democrarcy

Ọdụm

Lion

Agụ

Leopard

Ichoku

Parrot

Ụlọ ego

Bank

Ekwenti

Telephone

 

 

                                                            ISI NKE IRI ABỤỌ

EDEMEDE NDUZI EZINAỤLỌ

20.1 NKỌWA EZINAỤLỌ (FAMILY)

Ezinaụlọ bụ ebe obibi mmadụ. Ndị n’ ebi n’ ezinaụlọ bụ Nne, Nna Ụmụaka na ndị ezi ha . N’ omenaala ndi Bekee, Ezinaụlọ bụ nanị nwoke na nwunye ya na ụmụaka ha. Ma na nke ndị igbo, ọdịghị otu a. Ezinaụlọ ndi igbo bụ dị na nwunye maọbụ ịnyọm, ụmụaka ha, ndị ọgọ ha, ụmụnna na ikwu na ibe.

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

20.2 ỤDỊ EZINAỤLỌ ENWERE

Enwere udị Ezinaụlọ atọ, Ha bụ ndị a:

i. Ezinaụlọ otu  mkpuke (Nuclear family)

ii. Ezinaụlọ ụbara mkpuke (Extended family)

iii. Ezinaụlọ mbasa (Polygmous family)

 

i. EZINAỤLỌ OTU MKPUKE: Ụdị ezinaụlọ a na-enwe otu  ekwu ọkụ n’ ihi na ọ bụ otu nwanyị ka a na-alụ ebe dị otu a. ọ bụ ebe enwere naanị, nne, nna na ụmụaka, nakwa ndi binyere ha dika ọhụ maọ bụ odibo.

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

20.3 ỌRỤ EZINAỤLỌ NA NDU NDḷ IGBO

A. ỌRỤ NNA N’ EZINAỤLỌ

i. Nna bu ya bụ onyeisi n’ ezinaụlọ.

ii. Nna ga na-ahụ na ndi be ya na-eriji afọ.

iii. Nna ga-akụziri ụmụ ya ndị ha na ha bụ nwanne.

iv. Nna ga-akpọ ụmụ ya ndị nwoke eje nzụkọ ụmụ nna, nzụkọ ogbe

na nzụkọ obodo.

v. Nna ga-ahụ ya kwụọrọ ụmụ ya ụgwọ akwụkwọ gooro ha akwa ma zụọ ha n’ ọrụ ezinaụlọ.

B. ỌRỤ NNE N’ EZINAỤLỌ

i. Nne ga-elezi ụmụ ya anya nke ọma.

ii. Ọ bu ọrụ dịịrị nne isi nri nye ụmụ aka ya.

iii. Nna ga-asa ụmụ aka ahụ ma hụ na ha na-adị ọcha.

iv. Nne ga-azụlite ụmụ ya ndị nwanyi n’ obi ezi naụlọ.

v. Ọ ga-akụziri ụmụ ya etu esi ekele ekele.

CH. ỌRỤ ỤMỤAKA N’ EZINAỤLỌ

i. Ụmụaka ga na-enye nne na nna ha nsọpụrụ ya na ndị toro ha.

ii. Ụmụaka ga-asụ akwa.

iii. Ụmụaka gana-ekwu eziokwu.

iv. Izacha ezi na isacha efere bụ ọrụ dịịrị ụmụaka n’ ezinaụlọ.

v. Ụmụaka ga- enyere nne na nna ha aka n’ ọrụ ugbo.

vi. Ụmụaka na- akpata nku., ichute mmiri na ịdị ọcha nke onwe ya.

 

ISI NKE IRI ABỤỌ NA OTU

AKWỤKWỌ AGỤMAGỤ A HỌPỤTARA (ABỤ)

21.1 NNYOCHA AKWỤKWỌ ABỤ

 Abụ adịghị ka akụkọ. Abụ anaghi ekwupụtacha okwu bowam. A gụchaa abụ, enwe ike hụ ihe o na – ekwu. Lee usoro a ga na-agbaso:

i. Aha abụ na ụdị abụ ahụ.

ii. Aha odee na isiokwu ọ na-ede.

iii. Usoro nhazi abụ ahụ.

iv.Asụsụ nka ewebatara.

v. Ndaba maọ bụ adabaghi.

vi. Nchịkọta ih abụ na-ekwu maka ya.

        ka anyi were otu abụ n’ akwụkwọ a họpụtara wee nye

 

Ọmụmaatụ.

Echiche bụ akwụkwọ a họpụtara n’ abụ. Nke anyi chọrọ itule bụ Echiche dị n’ ihu akwụkwọ 26 n’ akwụkwọ nke ochie ma ọ bụ ihu akwụkwọ 33 na mbipụta echiche nke ọhụrụ.

 

ECHICHE

Obi na-akụ m kpụm kpụm.

Nanị ngiringa nkata ka m bụ ugbu a.

Ọchị m dika nwaanyị eze mfo.

Ọchị anaghị achị n’ oge ụgụrụ.

N’ otu ntabi anya ka m jere ebe dum.

Anọ m n’ aba, anọ m n’ ọnịcha.

Ọ bụ mmanya ga-agwọ m ọrịa?

Mana nnụnụ fepụrụ n’ ala bere n’ okpoki kwube.

Bụ ebe ọ nọ ka ọ ka nọkwa.

Ọ bụghị iberibe ka mmadụ dị?

Nchekasi! Ndokasi! Atu ndu! Ezuike!

Bu ihe mmadụ wetara onwe ya.

Echiche chi chere ka mma.

 

i. Abụ a họpụtara: ECHICHE

ii. Aha abụ: Echiche n’ ihu 26 ma ọ bụ n’ ihu 33 na nke e bipụtara ọhụrụ.

iii. Odee: R.O Eziubo na J.I Anọwai. otu n’ ime ha dere abụ a.

iv. Ụdị abụ: Echiche bụ abụ Nkọcha ma ọ bụ abụ ikpe.

v. Isiokwu: Ndị ode ji abụ a akọcha ndị mmadụ na-echegbu onwe ha n’ echiche.

vi. Usoro nhazi abụ: Ndị ode haziri abụ a na nkebi anọ. A haziri abụ a na nkeji na nkeji.

Nkebi nke mbu: -------Ahiriokwu anọ

Nkeji nke abụọ: --------Ahiriokwu ise

Nkeji nke atọ: ----------Ahiriokwu ise

vii. Asụsụ Nka: Asụsụ nka ndị a batara n’ abụ a:

a. Nghọtasinaụda dịka: kpụm, kpụm, kpụm

b. Myiri dịka “Ọchị m dịka nwaanyi eze mfọ”

ch. Ajusaghi dịka “ọ bụ mmanya ga-agwo m ọria?”  “ọ bụghị iberiibe ka mmadụ dị?”

d. Akpalaokwu dịka “atụ ndụ!”  “ezu ike!”

e. Ilu dịka “Nnụnụ fepụrụ n’ ala bere n’ okpọkikwube”.  “Bu ebe ọ nọ ka ọ kaọka nọkwa.”

viii. Ndaba ma ọ bụ adabaghị: Abụ a dabara adaba.

ix. NCHỊKỌTA: Ndị mmadụ ka e jiri a bụ a gwa ka ha were nwayọọ na-adogbu onwe ha n’ echiche. Echiche nke chi cheere mmadụ ka mma.

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

1. Ga eriju afọ.

2. Amaghị njọ ahịa, azụrụ azụghị ha na enweta Ọru.

3. Na enweta nnukwu ego.

4. Na-enwe ezigbo aha. Dgz.

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ATỌ

AKỤKỤ AHỤ MMADỤ DỊ ICHE ICHE

23.1 NKỌWA AKỤKỤ AHỤ MMADỤ (Part of the body)

        Akụkụ ahụ mmadụ bụ akụkụ dị iche iche nke mebere mmadụ dịka ọnụ, anya, aka, ụkwụ na akụkụ ndi ọzọ dị iche iche. Akụkụ ahụ mmadụ enwere ọrụ ọ na-arụ na ahụ mmadụ.

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

23.2 ỤDỊ AKỤKỤ AHỤ MMADỤ DỊ ICHE ICHE

 

IGBO

BEKEE

Isi

Head

Anya

Eye

Imi

Nose

Nti

Ear

Ire

Tongue

Ọnụ

Mouth

Eze

Teeth

Igbiri

Gum

Aka

Hand

Mkpisiaka

Finger

Mbọaka

Finger nail

Obiaka/Imeaka

Palm

Ụkwụ

Leg

Ukwu

Waist

Ara

Breast

Afọ

Stomach

Ike

Buttock

Egbugbere ọnụ

Lip

Ikpere

Knee

Ubu/Ukuubu

Shoulder

Obi

Chest

Aji ahụ

Body hair                        

Ntụtụ

Hair

Agba

Jaw

Olu

Neck

Azụ

Back

Mbọukwu

Toe-nail

Ikpere aka

Elbow

Abụ

Ampit

 

23.3 ỌRỤ AKỤKỤ AHỤ NDḷ A BỤ:

Aka ---- Eji m aka ede ihe.

Ọnụ ------ Eji m ọnụ ekwu okwu/ire ihe.

Imi ------ Eji m imi m eku ume.

Ikpere ---- Eji m ikpere m esekpu ala ikpe ekpere.

Eze ----- Eji m eze m ata nri m na anụ.

Anya ----- Eji m anya ahụ ụzọ.

Ụkwụ ----- Eji m ụkwụ aga ije.

Afọ ----- Afọ bụ ebe nri anyi riri n’ anọ.

Ara ----- Eji mara azụ nwa.

Nti ------- Eji n nti anụ ihe.

 

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ANỌ

NZIZA OZI

24.1 NKỌWA NZIZA OZI

        Nziza ozi bụ ụzọ dị iche iche ndị, mmadụ si amata ihe na-eme n’ obodo, n’ ogbo na ụwa niile dị iche iche.

24.2 ỤDḷ NZIZA OZI ENWERE

i. Nziza ozi Nkeọdịnaala.

ii. Nzizza ozi Nke ugbua.

A. Nziza ozi Nke Odinaala: Nke a pụtarakari ihe n’ oge mgboo gboo. Ọ bụkari eze obodo n’ ezipu “Ọma ekwe” Ka ọ gaa gwa ndị obodo ihe na-eme na obodo ya.

Ụzọ dị iche iche esi eziza ozi mgbe ochie bụ ndị a:

i. Okwu Ọnụ: Na mgbe ochie, a na-edunye mmadụ ozi gwa ya ihe ọ ga-ezi onye a chọrọ ka o zie ozi

ii. Ikụ Ekwe/Ogele: Obodo ọ bụla n’ oge gboo nwere ọkụ ekwe ma ọ bụ ọkụ ogele. Ọ ga-ezi ozi a mgbe ọ maara na mmadụ niile nọ n’  ụlọ.

iii. Ikoro: Ejika ikoro ezi mgbe gboo.

iv. Ekwe Eze: Nke a bụkwa ekwe dị nnukwu mkpa n’ obodo. Ọ bụ ya ka eji agwa ọha na eze na okenye di mkpa n’ obodo anwụọla.

v. Egbe: Ejikwa egbe ezi ozi mgbe ochie. O nwere egbe a ga-agba, ọ bụrụ ikpo nzụkọ

vi. Ọja: Mgbe a na-agba mgba odinaala, ọ bụ ọja ka eji akpọ ọmụ okorobịa ọkụ. Onye ọja fụọ ya, ọ bụ ịgwa ụmụ okorobịa oge eji eje mgbe eruola. O nwekwara udiopi ike eji ezi ndi ọchị agha ozi.

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

B. Nziza ozi nke ugbua: Ọ bụ ụzọ ndi bekee si ezi ozi ọ na-abụkari ndi gara akwụkwọ na-eziza ozi nke ugbua.

Uzo ọgbara ọhụrụ esi ezisa osi ugbua:

i. Ide leta: Ọ bụ ụzọ mmadụ si ezi ozi n’ ụzọ leta. Ọha obodo chọọ

ịkpọ nzụkọ ha edee sakụla

ii. Redio: Ọ bụ redio ka gọọmenti si ezisara ọha na eze ozi. Ejikwa redio eweputa egwu ma ọ bụ ihe ọhụrụ a chọrọ iweputara ka ọha na eze nụ ya.

iii. Ekwe nti: Ọ bụ n’afọ 1999 ka president Obasanjo webataara anyi ekwe nti ọtụtụ ndi mmadụ na- akpa ekwe nti ha n’aka na – ezi ndi mmadu ozi mgbe ọbụla ha chọrọ.

iv. Tiivii: Ọ bụ ọrụ redio na- arụ ka tiivii na- arụkwa. A ga na –ahụkwa onye ahụanya na tiivii

v. Kọmputa: E ji kọmputa ezi ozi na ebi akwụkwọ. Ọ dịghị ọrụ e jighi Kọmpụta arụ. Ọ bụ site na kọmpụta ka anyi si emeta nke anyi na- akpọ.

a. E-meel (E. mail)

b. websaiti (website www.)

vi. Akwụkwọ Akụkọ: Nke a bụ akwụkwọ a na ebipụta kwa ụbọchi. Ọ na-ebu ọtụtụ akụkọ dị iche iche n’ebe niile nakwa ihe ọ bụla na- eme n’ụwa.

NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA  1.1 NDḷ IGBO

24.3 URU IZIZA OZI BARA.

1. Ọ na – eme ka ndị mata ihe n’a- eme n’obodo.

2. A na- esite na ya amata ụlọ ọrụ chọrọ ndị ọrụ dị iche iche.

3. Ọ na- agba mpu dị n’obodo n’anwụ.

4. Ọ na- abawanye amamiihe.

5. A na esi na ya eme ka ndị mmadụ mata ngwa ahịa dị n’ahịa.

 

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ISE.

EGWU NDḷ IGBO.

25.1 NKỌWA: Egwu ndị igbo

        Egwu bụ ụzọ mmadụ si egosipụta ebunuche ya. Ọ bụ ndị mmadụ na-echepụta egwu guo ya agụọ. Ọ na- abụkari onyinyechi, ọtụtụ ndi tiri egwu bụ ọ natara chi.

25.2 ENWERE ỤDỊ EGWU DỊ ICHE ICHE. HA BỤ NDḷ:

1. N’Anambra, eji egwu MKPỌKITI mara umunze.

2. N’Abia Steeti, eji egwu IKPIRIKPE mara Ọhafia.

3. N’Anioma, eji gwu AMALA ma ọ bụ ỌSỌDE mara ha.

4. N’Ebonyi, eji egwu NWANWIITE akpọtụ Afikpo.

5. N’Abia, e ji egwu OJOOJO akpọtu Arochukwu.

6. Egwu Atụrị Ọgwụ.

7. Egwu Ogene.

8. Egwu Egedege.

9. Egwu ụka.

10. Egwu ekpiri.

25.3 NGWA EGWU ỤFỌDỤ

i. Arọ.

ii. Ogene.

iii Ekwe.

Iv. Udu.

v. Ọja.

vi.Iyọrọ

vii. ḷchaka.

25.4 URU EGWU BARA

i. Ọ na – enye Obi anụri.

ii. Ọ na- enye ego.

iii. Eji ya akụziri ụmụaka ihe dị mkpa oge ụfọdụ.

iv. Eji ya akwalite Omenaala.

v. O na- eme ka ndị mmadụ wee mmekọrịta mmadụ na ibe ya.

                                       

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ỊSỊỊ

EGWUREGWU ỤMỤAKA

26.1 NKỌWA: EGWUREGWU

        Egwuregwu bụ mmegharị ahụ nke na- eme ka nzimozi zuru oke pụta.  Egwuregwu bụ otu ụzọ n’ime ngalaba agụmagụ ọdinaala, nke jupụtara na mmeghariahụ dịka ndị mbụ siri wee mee ya.

26.2 ỤDỊ EGWUREGWU DỊ ICHE ENWERE.

i. Egwuregwu maka mgba.

ii. Egwuregwu maka Agha.

iii. Egwuregwu egwu ọma.

iv. Egwuregwu nzuzo.

v. Egwuregwu ụmụaka ma ọ bụ egwu Ụmụntakiri.

vi. Ikpo Ọga.

vii. Iti mmanụ

viii. Mpipo

                Ọmụmaatụ.

i. Egwu Agha:

        Onye akpala nwa agụ aka n’odu ma ọ dị ndu ma o nwụrụ, onye akpala Agụ aka n’ọdụ ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ. Onye akpala Agu aka n’ ọdụ.

ii. Egwuregwu Umuaka:

        Kedu onye ga- abụ ọyị m?

        Kedu onye ga- abụ ọyị m?

        Kedu onye ga- abụ ọyị m?

        Onye ga-abu ọyị m?

Ọyị mee!

        A hula m ọyị m

        A hula m ọyị m

        A hula m ọyị m

Onye ga –abụ ọyị m?

        Ọyị mee!                           

iii. Egwuregwu ọnwa.

Kpu kpumkpu ogene --- Ogene Ogene

Kpu kpumkpụ ogene --- Ogene Ogene

Onye na-akpụ ogene ---- Ogene Ogene

Ewu na-akpụ ogene ---- Ogene Ogene

Maa! Maa!

 

26.3 URU Ọ BARA

1. Ọ na-enyi obi ụtọ.

2. Ọ na-eweta udo.

3. Ọ na-enye ezumiike.

4. Ọ na-abawanye amamiihe.

5. Eji ya akụziri ụmụaka omenaala.

 

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ASAA

AKWỤKWỌ AGỤMAGỤ A HỌPỤTARA (Ejije, Aba na Iduuazi)

27.1 NKỌWA: Nnyocha akwụkwọ: Mmiri ọkụ Eji egbu mbe. (Idụụazi)

ka anyị jiri usoro a nyocha akwụkwọ a:

a. Ode akwụkwọ: Maazi Tony Ubesie. Tony bụ onye Egwu achi nke dị n’ okpuru ọchịchị ime obodo oji riva n’ Enugwu steeti.

b. Ndị mbipụta akwụkwọ: Ndị Longman Naijiria Ltd.

Ch. Afo mbipụta akwụkwọ: 1974

d. Nchịkọta Akụkọ:

i. Nwunye maazị okafọ na Nwunye maazị ụzọdịmma na-ese okwu.

ii. Esemokwu a wee fere di ha

iii. Maazi okafọ wee were nsi gbuchapụ ụmụaka ụzọdimma.

iv. Maazi ụzọdimma wee jiri iwe ọkụ mmiri mma gbuo maazi okafọ.

v. E wee jide ya, kpee ya ikpe, ma ya ikpe ọnwụ wee kwugbuo ya.

vi. O teghị aka ọrịakụ ụzọdịmma wee nwụọ.

vii. Ha wee hapụ otu mkpụrụ nwa nwoke ha mụtara, aha ya bụ

Enyi nwa mgbei.

viii. Enyi wee baa n’ ibi ndu ọjọọ. O sooro ndị ajọ otu baa n’ izu ohi

ix. Ohi nke ya bụ sam.

x. Ndị uwe ojii emee nta imo ka aka kpara ya, mana o weghi isi.

xi. N’ ikpe azụ, O bere nwata ọ na-enye ọzụzụ n’ izu ohi agbaa ama ihe aka jiri kpara Enyi.

xii. E wee tụọ ya mkporo

xiii. Aha nwa ahụ gbara ama bụ chukwudị.

xv. Ka Enyi si na nga lọta, o cheghariri bịa biwe ezi ndu.

E. Isiokwu dị n’ akụkọ: Akụkọ dị n’ akwụkwọ a bụ akụkọ mgba anya mmiri isiokwu dị na ya nwere ike buru:

i. “Mmadụ ime ihe ọjọọ adighi mma” Maọbụ.

ii. “Mmadụ ibo obo n’ onwe ya adịghị mma”

 

USORO NNYOCHA NDḷ ỌZỌ

1. Nhazi akụkọ

Onye na-enyocha akwụkwọ nwere ike hazie akụkọ etu masịrị ya. N’ebe a, anyị nwere ike hazie ya n’ụzọ anọ ndị a:

a. Bido n’ogbogbu maazi ụzọdịmma gburu maazị okafọ ruo n’ oge enyi si n’ụlọ nwanne nna ya bụ ebuzo gbapu (Bido n’ihu I ruo 19).

b. Mgbe enyi bidoro mụwa ọrụ n’aka ndị ohi ruo mgbe o lara be ha bụ Ndiabia. (ihu 20 ruo 49).

Ch. Mgbe enyi laghachiri Enugwu ruo mgbe e jidere ya tụọ ya nga (ihu 50 rue 65)

d. Ndu enyi n’ ikpeazụ (ihu 66 ruo 67)

2. Agwa dị n’ akụkọ : Ọ bụ enyi bu isi dokpụ nti n’akụkọ di n’akwụkwọ a. were isiokwu ndị a nyocha agwa ya site n’ichọta etu o siri mee omume.

i. Chọpụta ebe ọ kpara agwa dịka onye nwere akọ na uche.

ii. Chota ebe o zugasiri ohi di iche iche.

iii. Ole ebe enyi kpara agwa dikwa onye nwere anya ukwu?

iv. O nwere ebe ọ kpara agwa dika onye nwere obi ebe.

v. Ole ebe o gosi gasiri na ya bụ nwoke gbasiri ike mmadụ?

3. Akanka

        Akanka na- egosi etu ode siri were asụsụ dee akwụkwọ ya. Ọ bụrụ na odere ya n’asụsụ igbo dika nke a anyi na enyocha, o jikwa ụdị asụsụ ahụ nke na egosi na asụsụ igbo doro ya anya? O webata chakwara ihe dika ilu, ukabuilu, ndika, mburu na mmemmadụ n’ebe ha kwesiri idi? O jikwa igbo izugbe wee dee ya. dgz.

27.2 NNYOCHA ABỤ “ỌKỌCHỊ”

1. Aha Abụ: Aha ya bụ ‘ọkọchị’

2. Aha ode: Ọ ka bụkwa mmadụ abụọ a, Ezeuko R.O na Anowai J.I

3. Nkeji Ole? Ọ dị nkeji atọ.

4. Ahịrịokwu ole dị n’otu nkeji?

i. Nkeji nke mbu nwere ahịrịokwu ise

ii. Nkeji nke mbu nwere ahịrịokwu ise

iii. Nkeji nke mbu nwere ahịrịokwu ịsịị.          

ABU……  IHU 25 nke akwụkwọ abụ lee ya: ỌKỌCHỊ

        Nwa gị bụ ọsisọọ.

        Anyụọla mmadụ anya.

        Onye baa n’ụlọ okwu.

        Onye pụta n’ụlọ Okwu.

        Ọkọchi

        I bụ nshansha mmiri

        Na-agba ahụ gharaghara

        I butere agụụ mmiri

        Mee ndị ọrụ ugbo ino nkiti

Ọkọchị

! na- emekwa ezigbo ihe

Ụmụ nnụnụ na- enwere gi ānụrị.

I mereala asọghị oyi

Na –eme mkpụrụ ihe ka ha kaa.

        Gị mere na mmadụ na- apụ ọrịrịrị uchichi.

5. Usoro Nhazi: Odee haziri abụ ya na nkeji atọ. Nkeji nke mbu dị ahịrịokwu ise. Nke abụọ dị ahịrịokwu isii. Nke atọ dị ahịrịokwu ịsịị.

6. Asụsụ Nka:

i. Mmemmadụ: Lee ahịrịokwu mbu: Nwa gị bụ ọsisọọ.

Anyụọla mmadụ anya.

ii. Mburu: Lee ahịrịokwu a:

Ị bụ nshansha mmiri.

Na- agba ahụ gharaghara.

 

27.3 NNYOCHA EJIJE

        “NKA Dḷ NA NTI”

1. Aha akwụkwọ                    “NKA Dḷ NA NTI”

2. Ụdị agụmgụ ọ ụ                  Ejije a rọrọ arọ

3. Aha onye dere akwụkwọ                Maazị Okoro, B.C.

4. Afọ Mbịpụta      1982

5. Ndị Mbịpụta       Evans Publishers Nig Ltd.

6. Ebe Mbịpụta       Ibadan

7. Ebe Ihe mere     Eji ntọala ala ngwa nke dị n’Abia steeti na obodo ndị gbara ya okirikiri wee dee akwụkwọ a.

8. Isiokwu dị n’akwụkwọ nka dị na nti nke a pụtara na onye gee nti n’ezigbo ndụmọdụ e nyere ya na ọ ga –anote ndu aka, na ọ ga- aka nka. Onye egechi kwanu nti n’ ezigbo ndụmọdụ; ọ ga- anwụ n’oge erughị eru.

9. Nchịkọta akụkọ: Maazi Okoro B.C. na ezipụta n’akwụkwọ ejije a etu o nwa okorọbia aha ya bụ Njoku siri ghara ige nti na ndụmọdụ nne ya na nna ya na ndị enyi ya na-enye ya. Ọ kpochiri nti ya. Ajọ ndu niile o biri karịchaa n’ịchụ nwaanyi, ma ndị nkiti ma ndị nọ na dị mere ka o nwụọ ọnwụ okorobia ọnwụ ya site kwara n’aka nwaanyị.

27.4 USORO NHAZI

A. Anyi nwere ike hazie ejije a ụzọ atọ:

i. Nke mbụ: mmalite ịdị na mma Njọkụ na otu Nwaanyị a na-akpọ. Ezinwaanyị. Njọkụ hụrụ ya n’ anya nke ukwuu mana ọ hụghị Njọkụ n’ anya. Naanị ego ya ka ọ hụrụ n’ anya. Njọkụ chefụọ ndụmọdụ ndị enyi ya isepụ onwe ya n’ ebe Ezinwaanyị nọ.

ii. Nke Abụọ: site na mgbe ọdachi kwudoro. Njoku. O wee daa n’ azumahia ọ na azu. Ezinwaanyị wee gbafuo n’ ebe ọ nọ.

iii. Nke Atọ: Site na mbilite n’ ahịa Njọkụ o wee laghachikwa n’ ọnọdụ ya nwee ego ọzọ, zụọ ụgbọ ala buru ya lọta n’ obodo ya bụ umuanụmbe. Ọ gwara nne ya na nna ya na ya ga-eje Aba jee hụ Ezinwaanyị. Ha dọrọ ya aka na nti ka ọ gharakwa ịga be nwaanyị a lụrụla dị. Ọ kachiri nti chọrọ Ezinwaanyi gaa n’ ụlọ dị ya. Ebe ahụ ka ọ nọrọ zute ọnwụ ya.

 

B. Agwa Ndị pụtara ihe N’ Ejije a: ka anyị nyochaa agwa ndị a:

iv. Njọkụ ọ bụ nwoke a bụ isi dokpu nti n’ ejije a. Ọ bụ ya bụ OKEDIKE n’ ejije a. Anyị chọpụtara akparamagwa ndị a n’ ebe ọ nọ

a. Ọ bụ onye na-agha mbo n’ ịchụta ego

b. Njọkụ dịka onye oriri.

ch. Njọkụ dịka onye na-abụ o daa, o bilikwa ọzọ.

d. Nkọkụ dịka onye mkpochi nti.

e. Njọkụ dịka ọchụ nwaanyi.

27.5 AGWA ṆDỊ ỌZỌ PỤTARA IHE

A. Oji na nwunye ya bu ikodie: Anyi ga-atule mmadụ abụọ ndị a. Ha bụ ndị ụmụanumbe ọ bụ ha mụrụ Njọkụ. Ha kpara agwa ọma ndị a.

i. Ha na-ebi ndu ezigbo ezinaụlọ: Ha’ na-ejiko aka ọnụ enye ụmụ ha ndụmọdụ ga-abara ha uru. Ha adịghị ka ezinaụlọ ụfọdụ ebe nne maọbu nna na-adonyere nwa ya na-akpa ajọ agwa ukwu. Ha jịkọrọ aka ọnụ kagbuo ọchịchọ Njọku ịlụ nwaanyị mba mmiri. Ha jikọkwara aka ọnụ gbaa mbọ ịgbọchi Njọkụ ịchọrọ Ezinwaanyi gawa n’ ụlọ dị ya n’ aba. Ndụmọdụ ha kụrụ afọ n’ ala.

ii. Dịka ndị ha na mmadụ ibe ha na-enwe ezi mmekọrịta: mgbe mmadụ nwunahụrụ maazị Azụbụike, maazị ọjị na nwunye ya gbara ya mgbaru. ọjị nyere ya okwu nkasi obi

iii. Dịka dị na nwunye na-ebi n’ udo: ọ dịghị ebe anyi hụrụ ka ọjị na nwunye ya na-ese okwu. Ha abụọ jịkọrọ aka ọnụ n’ inye nwa ha nwoke Njoku ndumodu ka o sepụ aka n’ agwa ọjọọ

B EZINWAANYḷ: Anyi chọpụtara ihe ndị a n’ ebe ezinwaanyị nọ.

i. Ọ bụ nwata akwụkwọ ejighị akwụkwọ ya kpọrọ ihe.

ii. Naani mkpa ya bụ isogharị ụmụnwoke, na-aghọ gbu ha na-anakọrọ ha ego.

iii. Ọ dịghị mgbe ọ hụrụ Njọkụ n’ anya. Naanị ego Njọkụ ka ọ hụrụ n’ anya.

iv. Mgbe Njọkụ dara n’ ahịa ya, Ezinwaanyị gbafuo ga lụọ dị ọzọ.                                          

v. Ọ bụ agwa ọjọọ ọnọnadịachọdị ya ranyere Njọkụ n’ ọnwụ ya.

vi. Ọ dịghị ezigbo agwe anyi chọpụtara n’ Ezinwaanyi.

vii. Aha obodo nyere nwaanyi a adabaghị adaba. Aha ya aka abụ ajọ nwaanyi.

CH. Eze, Agu, Chima na Adikwu: mmadụ anọ ndị a bụ enyi Njọkụ. Anyi chọpụtara omume ndị a n’ aka ha:

i. Ndi a na-enya enyi ha ezigbo ndụmọdụ. Ha na-enye Njọkụ ndụmọdụ bara uru gbasara mmekọrịta ya na umu nwaanyi. Njọkụ egeghị ha ntị.

ii. Dịka ndi oriri: Ha bụ ndị oriri. Ha na-aga ụlọ oriri na nkwari ebe ha na-anọ na-eri na-anu ka a na-anwụ anwụ

iii. Dịka ndi na-emu enyi ha emu azụ: Anyi chọpụtara na mmadụ anọ ndi a nụjuo mmanya afọ ha ebido muwe enyi ha nwoke bụ Njọkụ emu azụ. Ọ bụ site na nkata ha na-akpa ka ha nụjuru nkwu afọ ka ha nọ kọwapụta na ebe Njọkụ siri baa ọgaranya bụ ihe ndị mmadụ o zuru mgbe ọkụ ghara ahịa Aba.

27.6 OMENAALA DI N’ EJIJE A

A. Maazị okoro B.C. zipụta Omenaala abụọ n’ akwụkwọ ejije a. ha bụ:

i. Ije mgbarụ.

ii. Omenaala ọjị n’ ebe mmadu Nwụrụ

B. Asusu Nka di n’ ejije a:

Anyị chọpụtara ndị a:

i. Ụkabụilu: Nke a dị abụọ Akụkọ ọjị kọrọ maka ọzọdimgba na Agadị Nwaanyi n’ ihu 14. Nke a bụ ụkabụilu. Ọ bụkwa akụkọ ntọọchi. ụkabụilu ọzọ dị n’ ihu 40. Nke ahụ akụkọ chima kọrọ n’ ụlọ oriri na nkwari.

ii. Okwu si n’ Akwụkwọ Nsọ: Lee ihu 31 ebe o dere “onye nwụrụ anwụ anaghị eto jaa. Nke a bụ Okwu si n’ Akwukwọ Nsọ ndị ụka kraist leekwa ihu 38 ebe o dere na Akwụkwọ Nsọ kwụrụ na ihe “I ji tụnyere mmadụ ka a ga-eji atụnyere gi”. Chima webatakwara okwu

                                               

ndị ụka kraịst mgbe o siri n’ ihu 59 “………. O bụ n’ ihi ndị ọjọọ ka jisọs jiri bịa n’ ụwa”

iii. Olumba: Ọ bụ eziokwu na ejiri igbo izugbe dee ejije a mana maazị okoro echezọghịkwa na ọ bụ n’ ala Ngwa ka a mụrụ ya. Ọ bụkwa ebe ya nọ too. Ọ bụ ya mere o jiri webata ọtụtụ okwu olu ndị Ngwa. Ọ bụkwa ya kpatara O jiri wepụta ihu akwụkwọ abụọ na ọkara ịkọwa ihe okwu olumba ndị a bụ n’ igbo izugbọ. Guo ha nke ọma.

 

AJỤJỤ NWALE

1. Kedụ nke pụtara Nari ise?

a. 5

b. 50

ch. 500

d. 5000

2. Ụdaume igbo dị ole

a. atọ

b. asatọ

ch. itoolu

d. anọ

3. Mgbochiume igbo dị ole

a. iri abụọ

b. iri atọ

ch. iri abụọ na asatọ

d. iri abụọ na ịsịị

4. Mkpụrụabịchịị igbo dị ole

a. iri atọ na ịsịị

b. iri atọ na asaa

ch. iri abụọ na ịsịị

d. iri ạtọ

5. Kedụ steeti abụghi nke ndị igbo

a. Legọọsu

b. Imo

ch. Anambra

d. Enugu

6. Họpụta nke ejighị asụsụ eme

a. Akụziri mmadu ihe

b. Akparịta ụka

ch. Azụ ahia

d. Akwa ụkwara

7. Ihe eji ama mba bụ

a. Asụsụ

b. Obodo

ch. Olumba

d. Igbo izugbe

8. Asụsụ e jiri mara igbo bụ

a. olumbe

b. Asụsụ

ch. Igbo

d. Obodo

9. Olee nke bụ akara ajụjụ?

a. !

b. *

ch. “ ”

d. ?

10. Nzogbu Nzogbu!

        Enyi mba enyi!!

        Zogbuo Nwoke!

        Enyi mba enyi!!

 

Nke a bụ egwu

a. Agha

b. Akwa

ch. Ọnwa

d. Nwa

11. Na bekee, ọ dịka otu n’ ime ndị a adịghị n’ igbo

a. z

b. x

ch. o

d. kp

12. E kere Agụmagụ ọdịnaala ụzọ

a. Abụọ

b. Anọ

ch. Ise

d. Atọ

13. Nke kwesiri ịdị n’ngwucha ahịrịokwu ọbụla bụ;

a. Rịkọm

b. Kpọm

ch. Kpọm kpọm

d. Kpọmrikọm

14. Ọ fọdụrụ nkeji ise ka ọ kụọ elekere abụọ nke ehihie pụtara:

a. 1. 55am

b. 1. 05pm

ch. 2. 05pm

d. 1. 55pm

15. O jirila nkeji iri abụọ na ise gafee elekere anọ nke uhuruchi.

a. 4. 25am

b. 4. 25 pm

ch. 4. 20pm

d. 4. 20am

16. Akara edemede ji egosipụta mbuụzo bụ:

a. Akarauhie

b. Rịkọm

ch. Rịkọm elu

d. Kpọm.

17. Ezinaụlọ ndị igbo gbasara

a. Nne

b. Nna

ch. Ụmụ

d. Ha niile

18. Otu n’ime ihe ndị a abụghị ọrụ ụmụaka n’ezinaụlọ

a. Iweta ego nri

b. ịzacha ụlọ

ch. Ịsachaefere

d. Isi nri.

19. Egwu ejiri mara ụmụnze bụ:

a. Egwu mgbaji

b. Nkwa ụmụ Aghọghọ

ch. Mkpọkiti

d. Disko

20. Nke a bụ aha egwu ndị obodo ọhafia.

a. Abigbo

b. Ikpirikpe

ch. Egedeege

d. Mgbaji.