NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA 1.1 NDḷ IGBO
ISI NKE MBU
NKỌWA NDḷ NA ASỤSỤ HA
1.1 NDḷ IGBO
Ndị igbo bụ ndị ahụ bi n’ ebe a maara dịka ala igbo, ma nweekwa asụsụ igbo dịka asụsụ nne na nna ha. Ndị igbo bụ ndị bi n’ ọwụwa anyanwụ mba Naịjịria. Ihe eji mara mba ma ọ bụ obodo ọ bụla bụ na ha ga-enweriri ebe ha bị na ya.
Abia n’ ọwụwa Anyanwụ Naijịrịa ebe ndị igbo bi, ọ bụ naanị ha, ọ bụ naanị ha bi na steeti ise ndi a:
a. Abịa
b. Anambra
ch. Ebọnyị
d. Enugwu
e. Imo
f. E nwekwara steeti ndị ọzọ ebe ndị igbo so biri dịka:
i. Akwa ịbọm
ii. Kros Riva
iii. Delta
Agbụrụ dị iche iche na Naijịrịa gbara ndị Igbo gburugburu. Na mgbago ugwu, ndị ha na ndị igbo gbara bụ igbala, idoma na Tiv. Na ndị da, ọ bụrụ ndị ijọ (Ijaw), Urobo (Urhobo) na isoko, n’ ọwụwa anyanwụ ọ bụrụ ha na efiti (Efik) na Ibịbịo. A gafee ọdịda anyanwụ ọ bụrụ ha na ndị Edo.
Mmekọrịta ndị Igbo na ndi agbataobi ha metụtara omenala, usoro ọchịchị na usoro achụmunta akụnụba. Site n’ ụzọ dị iche iche, tụmadu site n’ akụkọ ndịịche, anyi na-aghọta na ọ bụ ndị igala na ndị Edo ka ha na Igbo ka nwee mmekọrịta n’ oge gboo.
Ndị Enugwu Ezike nke dị na mgbago Nsukka na ndị igala gbara
agbataobi. Ha na-alụkọrịta dị na nwunye. Ụfọdụ ndị Enugwu Ezike dịka ndị unadụ na-egbu egbugbu dịka ndị igala. Ha na-azakwa ndị igala. Ufodu na-aza ataa.
Ndị Aguleri na ndị igala nke dịkwa na kogi steeti gbakwara agbataobi. Ọ bụ osimiri Anambra ma ọ bụ omambala kewara ndị igala na ndị Aguleri
Ndị Igbo ụfọdụ bị na delta steeti na ndị Edo (Iduu) gbara agbataobi. Ndi ọ bụla na- esi n’ aka ibe ha gbaziri ma ọ bụ omena-ala ma ọ bụ okwu ụfọdụ.
1.3 AKỤKỌ GBASARA EBE NDḷ IGBO SI MMALITE
Agbụrụ ọ bụla nwere akụkọ ha na-akọ bụ etu agbụrụ ha siri malite.
Ndị Yoruba kwenyere na ọ bụ oduduwa bụ nna ndị Yoruba. A mụghi ya amụ. Ọ si n’ elu igwe wụdata n’ ala wee mụbawazie ndị Yoruba.
Ndị Awụsa Kwenyere na ọ bụ kano be ebe mbu, nna mbu ha siri malite.
Ndị Igbo nwere otụtụ akụkọ gbasara etu ha siri malite. Ide akwụkwọ abiaghị ala igbo n’ oge. Ndị ọ bụla na- akọ na- ekwu na ọ bụ ha bụ ndị mbu bịara biri n’ ala igbo.
E nwekwara ndị kwenyere na ndị igbo esịghị ebe ọ bụla bịa. Ndị dị otu a na-akọwa na ndị igbo malitere ndu ha n’ Awka na Nri Oweriri na ọrlụ na okigwe, Ọ bụzi ebe ndị a ka ha sitere gbasaa. Ụfọdụ n’ ime ndị kwenyere n’ echichi a na-akọwa na ndi igbo malitere ndu ha na mpahara ọrlụ na owerri na mgbagwo oshimiri omabala tupu ha wee rute Awka na Nri.
Ụfọdụ sịrị na ndị Igbo sitere n’ agbụrụ ndị juu. Ha gbadoro ụkwụ n’ ihe ndi a wee na-ekwu:
A.Ndị Igbo na-akpa agwa ka ndị juu:
i. Ha na achụkari akụnaụba nke ụwa a.
ii. Ha amaghi ihe bụ ezụmike.
iii. Ha dị ike ọrụ nke ukwuu.
iv. Afọ anaghi eju ha eju n’ ịchu ego.
v. Ha anaghị efe eze ha ofufe dịka ndị agbụrụ ndị ọzọ.
Otu a kwa ka ọ dị n’ agbụrụ ndị juu.
B. Ụfọdụ omenaala ha na ndị juu yiri bu:
i. Ha na-ebe ugwu dịka ndị juu.
ii. Ha na-eme mmemme ọmụgwọ.
iii. Ha na-eme mmemme ịgụ nwa ọhụrụ aha.
1.4 NJIRIMARA NDI IGBO (Characteristics of the Igbo People)
a. Ndị igbo na-asụ asụsụ Igbo.
b. Ha na-enwe amamiihe.
ch. Ndị Igbo na-azụkarị ahịa.
d. Ha kwenyere n’ egbe bere ugo bere.
e. E ji erimeri ndị a mara ndị Igbo dika akpụ, ji, ofe onugbu, ofe ọra. na ndị ọzọ dị iche iche.
f. Ejikwa Ejije a mara ndị Igbo.
1.5 NGWE EJIJE NDI IGBO (IGBO COSTUMES)
Okpu (Cap)
Okpu mme (Red cap)
Mkpara (Staff)
Uwe mwuda (Long gown)
Abụba ugo (Eagles feather)
Akpụkpọụkwụ (Shoes)
Aka (bead)
Ịchafụ (Scalf)
Irika (Ring)
Ụdọ (Robe)
Ọlanti (Earring)
Ụkwụ akwa (Wrapper)
ISI NKE ABỤỌ
NJḷRḷMARA NA ỌRỤ ASỤSỤ (LANGUAGE)
2.1 NKỌWA ASỤSỤ
Asụsụ bụ mmerkọrịta na-adị n’ etiti mmadụ na ibe ya, obodo na obodo, mba na mba.
Asụsụ bụ okwu mmadụ kwuru n’ ọnụ nke ya n’ ibe ya ji emekọrịta ma ọ bụ agwarịta onwe ha okwu. Ọ bụ naanị mmadụ nwere ike isụ asụsụ doro anya ma ụmụ anụmanụ ndị ọzọ na-eme ụnara ma ọ bụ bee ube dị iche iche ma ịhe ndịa abụghị asụsụ.
Mmadụ na- esitekwa n’ asụsụ azipụta ebumnobi ya. E nwere ọtụtụ asụsụ dị iche iche na Naịjịrịa ma naani atọ n’ ime ha kacha pụta ihe. Atọ ahụ bụ Igbo, Awusa na Yoruba.
2.2 URU ASỤSỤ BARA
a. Mmadu ji asụsụ akọwapụta ebumnobi ya.
b. Asụsụ na-egosi mba maọbụ obodo mmadu siri pụta.
ch. Eji asụsụ akuziri ụmụaka ihe n’ ụlọ akwụkwọ.
d. Eji asụsụ azipụta omnaala na agụmagụ mba.
e. Eji asụsụ ezirita ozi n’ akwụkwọ n’ ikuku.
f. Asụsụ na- eme ka mmadụ na ibe ya ghọta onwe ha.
g. Eji asụsụ ekele ekele.
h. Eji asụsụ arịọ arịrọ.
i. Asụsụ na-eme ka mmadụ nwee ike ịgụ ihe edere n’ akwụkwọ.
2.3 NJḷRḷMARA ASỤSỤ
1. Asụsụ na-eto eto ma ọ kwusi otito, ọ nwụọ.
2. Ọ bụ naanị mmadụ nwere asụsụ
3. A ga-ebụ ụzọ mụta ịsụ asụsụ tupu odide ya.
4. Asụsụ nwere nhazi na usoro esi asụ ya.
5. Asụsụ ọ bụla nwere ohere ịnabata okwu dị n’ asụsụ ndị ọzọ.
6. Asụsụ ọ bụla nwere izugbe ya, n’ ọsụsụ na n’ odide.
7. Eji asụsụ azipụta omenaala mba.
8. Eji asụsụ ama mba.
ISI NKE ATỌ
ỤDAASỤSỤ IGBO NA USORO ODIDE IGBO
3.1 ABỊCHỊỊ IGBO (IGBO ALPHABETS)
Abịchịị Igbo bụ ederde eji anọchite mkpụrụụda (fonim) digasi n’ asụsụ. Ọ bụ mkpụrụabịchịị Igbo ka na- akpọ mkpụrụedemede Igbo ma ọ bụ mkpụrụasụsụ Igbo.
Mkpụrụabịchịị eji ede Igbo ugbu a gbasoro nsoroedide komitii onwu nke a nabatara n’ afọ 1961.
Abịchịị Igbo dị iri atọ na isii (36) Ha bụ ndi a:
Ndị obere(Small letters)
a b ch d e f g
gb gh gw h i ị j
k kp kw l m n ṅ
nw ny o ọ p r s
sh t u ụ v w y
z.
Ndị Nnukwu (Big Letters)
A B CH D E F G
GB GH GW H I Ị J
K KP KW L M N Ṅ
NW NY O Ọ P R S
SH T U Ụ V W Y
Z.
3.2 NJḷRḷMARA ABỊCHỊỊ IGBO
1. Ọ bụ mkpụrụ abịchịị ka a na-akpọ mkpụrụedemede ma ọ bụ mkpụrụ asụsụ
2. Ọ bụ mkpụrụ abịchịị ka eji anọchite mkpụrụụda ma ọ bụ fonim digasi n’ asụsụ.
3. Mkpụrụabịchịị Igbo dị iri atọ na isii
4. Ekere mkpụrụabịchịị Igbo ụzọ abụọ: ụdaume na mgbochiume.
5. Ụdaume Igbo dị asatọ: a e i ị o ọ u ụ.
6. Mgbochiume Igbo dị iri abụọ na asatọ.
3.3 E KERE MKPỤRỤEDEMEDE IGBO ỤZỌ ABỤỌ HA BỤ
1. Ụdaume (Vowel)
2. Mgbochiume (Consonant)
Ụdaume dị asatọ ndị a:
A E I Ị O Ọ U Ụ
Mgbochiume dị iri abụọ na asatọ ndị a:
b ch d f g gb gh gw
h j k kp kw l m n
ṅ nw ny p r s sh t
v w y z
ISI NKE ANỌ
4.1 IJI MKPỤRỤ EDEMEDE MEBE MKPỤRỤ OKWU
A: Anya (Eye)
Aziza (Broom)
B: Bọọlu (Ball)
Bia (Come)
Bata (Come in)
CH: Chee (Think)
Chọọ (Find)
Chịagozie (God’s blessing)
D: Dibia (Native doctor)
Dọkitọ (Doctor)
Di (Husband)
E: Efere (Plate)
Eze (King)
Ego (Money)
F: Fee (Fly)
Fuo (Get missing)
Foto (Picture)
G: Gaa (Go)
Gụọ (Count)
Gi (What)
GB: Gbuo (Kill)
Gbaa (Shoot)
Gbọọ (Vomit)
GH: Ghee (Fry)
Ghọta (Understanding)
Ghọpụ (Plunk)
GW: Gwuo (Dig)
Gwọọ (Cure)
Gwee (Crush)
H: Ha (They)
Huo (Roast)
Hapụ (Live it)
I: Imi (Nose)
Iko (Cup)
Isi (Head)
Ị: Ịgba (Drum)
Ịba (Yellow fever)
Ịchafụ (Scalf)
J: Jee (Go)
Ji: (Yam)
Jere(Go to)
K: Kobo (Money name)
Kee (divide)
Kedu (How)
KP: Kpọọ (Call)
Kpee (Report)
Kpata (Plunk)
KW: Kwee (Sing)
Kwaa (Sew)
Kwuru (Said)
L: Lee (See)
Lụọ (Fight)
Lọta (Return)
M: Mma (Knife)
Metu (Touch)
Mmadụ (Human being)
N: Nnu (Sat)
Nri (Food)
Ngozi (Blessing)
Ṅ: Ṅuo (Drink)
Ṅụria (Rejoice)
Ṅọrọ (Stay)
Nw: Nwa (Child)
Nwụọ (Die)
Nwalee(Child look)
NY: Nyere (Give)
Nyetu (Give to)
Nyem (Give me)
O: Obe (Cross)
Osisi (Tree)
Obi (Heart)
Ọ: Ọnwa (Sun)
Ọkụ (Fire)
Ọjị (Kola)
P: Pụọ (Go out)
Para (Carry)
Papa (Father)
R: Rie (Eat)
Ree (Sell)
Ria (Climb)
S: Sie (Cook)
See (Draw)
Saa (Wash)
SH: Shovelu (Shove)
Sheti (Shirt)
Isha (Crayfish)
T: Tii (Tea)
Tebulu (Table)
Tee (Scrub)
U: Ube (Pear)
Uru (Gain)
Ugwu (Prestige)
Ụ: Ụkwụ (Leg)
Ụtara (Cain)
Ụzo (Door)
V: Vọpụ (Uproot)
Votuo (To remove)
Vọọ (Scatter)
W: Wepu (Takeaway)
Weta (Bring)
Waya (Wire)
Y: Yie (Resemble)
Ya (He, She)
Yabasi (Onions)
Z: Zapụ (Sweep)
Zụọ (Buy)
Zọọ (Save)
ISI NKE ISE
5.1 ỤDAUME (VOWEL)
Ụdaume bụ mkpụrụdaasụsụ eji nkupụta ume akpọpụta n’ enweghị mgbochi n’ oghere ọnụ.
Ụdaume Igbo dị asatọ. Ha bụ ndị a:
A E I Ị O Ọ U Ụ
E kewara udaume Igbo ụzọ abụọ: Ha bụ ndi a:
a. Ụdamfe (Otu A): a ị ọ ụ
b. Ụdaarọ (Otu E): e i o u
Iji ha mee mkpụrụokwu
|
OTU A |
OTU E |
|
Aki |
Eku |
|
Azụ |
Ozi |
|
Ịtụ |
Obe |
|
Ọnụ |
Ube |
|
Ụzọ |
Udo |
5.2 MGBOCHIUME (CONSONANT)
Mgbochiume bụ mkpụrụ Abịchịị ndị fọrọ ka e wepụchara ụdaume.
Mgbochiume bụ mkpụrụ ụdaasụsụ ana-enwe Mgbochi n’ ikuku so mkpọpụta ha site na mmetụkọ ogan okwu na ibe ya.
Mgbochiume Igbo dị iri abụọ na asatọ. Ha bụ ndị a:
b ch d f g gb gh gw h
j k kp kw l m n ṅ nw
ny p r s sh t v w y
z.
5.3 ỤDAMKPI (TWICE LETTER)
E nwere mkpụrụ Abịchịị ndị gbara mkpi. Ha dị Itoolu. Ha bụ ndị a: ch, gb, gh, gw, kp, kw, nw, ny, sh.
5.4 MKPỤRỤ ABỊCHỊỊ NGE (SINGLE LETTERS)
Ndị ọzọ na-abataghị na ndị gbara mkpi ka a na-akpọ Abịchịị Nge. Ha bụ ndị a: Ha dị iri abụọ na asaa (27).
a b d e f
g i ị k l
m n ṅ o ọ
p r s t u
ụ v w y z
5.5 MYIRIỤDAUME (SYLLABIC NASALS)
Myiriụdaume bụ mkpụrụasụsụ ndị ahụ yiri udaume na mkpọpụta. Ya bụ mgbe a na-akpọ ha n’ odide, ha bụ mgbochiume. Myiriụdaume di naani abụọ ndi a “M” na “N”.
Ọmụmaatụ
|
M |
N |
|
Mmiri |
Nne |
|
Mmanụ |
Nna |
|
Mma |
Nnụnụ |
|
Mmadụ |
Nzụkọ |
ISI NKE ỊSỊỊ
AKARA EDEMEDE (PUNCTUATION MARKS)
6.1 NKỌWA AKARA EDEMEDE
Akara edemede bụ akara dị iche iche a na-etinye n’ ihe e dere ede iji zipụta mkpọpụta, ụda, ọrụ na nghọta ya n’ ụzọ doro anya. Akara edemede bụ akara ndị ahụ anyi na-etinye n’ ahịrịokwu ka ha gosi ebe anyi kuru ume, ebe anyi jụrụ ajụjụ, ebe anyi tiri mkpu.dgz. itinye akara edemede dịka ha kwesiri dị nnukwu mkpa iji mee ka ghara inwe nghọtahie n’ ihe edere.
6.2 ỤDḷ AKARA EDEMEDE Dḷ ICHE ICHE
|
Akara edemede |
Aha Igbo ha |
Aha bekee ha |
|
. |
Kpọm |
Full stop |
|
, |
Rikọm |
Comma |
|
: |
Kpọm kpọm |
Colon |
|
; |
Kpọmrịkọm |
Semi colon |
|
? |
Akara ajụjụ |
Question mark |
|
! |
Akara mkpu |
Exclamation mark |
|
n' |
Rịkọm elu |
Apostrophe |
|
|
Akara uhie |
Hyphen |
|
“ ” |
Rịkọm ngwu |
Quotation mark |
|
( ) |
Akara mgbodo |
Bracket |
|
/ / ____ |
Akara udaolu |
Tone mark |
|
… |
Akara nkwubiri |
Ellipsis |
|
ᴧ |
Akara mmagba |
Omission
|
6.3 NKỌWA ỤDỊ AKARA EDEMEDE Dḷ ICHE ICHE
A. KPỌM [ .]
Kpọm bụ ntụpọ a na-etinye iji gosi nkwusi ahịrịokwu nke na-abụghị mkpu ma ọ bụ ajụjụ.
Ọmụmaatụ:
1. Nkechi jere ahia.
2. Mmadụka riri nri.
3. Mmiri na-ezo n’ udu mmiri.
4. Nne m mara mma.
5. Ahụ m bụ obi.
A na- etinyekwa kpọm n’ aha mkpirisi ma ọ bụ iji gosi okwu a na- ederughị n’ isi.
Ọmụmaatụ:
i. Mz. (maazi)
ii. N.A. Nwafor
iii. W.A.E.C = West African Examination Council
iv. dgz. = diri gawazie
v. ork = Oriaku
vi. G.C.E = General Certificate Examination
vii. Rv. = Reverend
B. RỊKỌM [,]
Rịkọm bụ akara edemede eji gosi nkuru ume tupu ekwutọpụ ihe a na-ekwu.
Ọmụmaatụ:
i. Adakụ zụtara ji, ede, mmanụ, nnu na azụ, mgbe o jere ahia.
ii. Ha gakatara ije, gbawa ọsọ.
iii. Anyi gara ahia, ma anyi ahụghi nnu ka anyi ji ahụ ose.
iv. Ọ gbagidoro ọsọ, o wee daa.
v. E ruo ọnịcha, a ga-ahụ osimiri Naija.
Ch. KPỌM KPỌM[:]
E ji kpọmrịkọm egosi ebe okuku ume toturu eto, ebe a jịkọrọ usoro okwu dị iche iche, ndị na-ekwụ maka otu ihe na ndị gaara ịbụ ahịrịokwu nọọrọ onwe ha iche iche ma a bịa zia jikọta ha ọnụ.
Ọmụmaatụ:
i. Ọ zụtara ihe ndi a: akara, agidi, azụ na ogili.
ii. Nke a bụ ndi so ya bia: mmadụka, Nkechi na Onyinye.
iii. O nyere onyinye dị iche dika: moto, ego na akwa.
iv. Ụbọchi ahụ aṅụri ekwughị onye ọ bụla rie nri: Ụmụ akwụkwọ anyi niile gafere n’ ule Igbo.
v. Ndị gara ahia bụ ndị a: Mmesọma, Ndidi, na Nneameka.
D. KPỌMRỊKỌM [;]
Nke a na-ekewa ahịrịokwu abụọ zuru ezu ma ha enweghị njiko n’ etiti ha.
Ọmụmaatụ:
i. Onyinye mụrụ nwa; nwoke ka ọ mụrụ.
ii. Nkechi zara ụlọ; ọ chọrọ ihi ụra
iii. Nne ya were iwe; narakwa ya ihe ya.
iv. A hụ kwghịị na-egbu okenye; e kwuo a nụghịị na-egbu nwata.
v. Ahụ adịghị ya; ọ gawala ụlọ ọgwụ.
E. AKARA AJỤJỤ [?]
Akara ajụjụ bụ akaraedemede eji akara ajụjụ egosi nkwusi ebe a jụrụ ajụjụ
Ọmụmaatụ:
i. Gini bụ aha gị?
ii. Kedụ ka ịmere?
iii. Chisom ọ nọ n’ ụlọ?
iv. Mmadụ ole biara?
v. Gịnị na-eme gị?
F. AKARA MKPU [!]
A na-etinye akara mkpu iji gosi ihe eji iti mkpu kwụpụta dị ka okwu dapụtara mmadụ n’ ọnụ na mberede site n’ ihe mere n’ ike, na mwute, n’ ujo maọbụ na nkụja.
Ọmụmaatụ:
i. Hia! Ọkụ anyụọ.
ii. Chei! Ọnwụ dị egwu.
iii. Onyinye o!
iv. Chimu o o o!
v. Hey! Were nwayọọ.
G. RỊKỌM ELU [n’]
Rịkọm elu dị ụzọ abụọ. Nke mbu bụ nke eji ezipụta mbuụzo.
Ọmụmaatụ
i. Ewu nọ n’ elu ụlọ.
ii. Nkechi bi n’ aba.
iii. Ụlọ ha dị n’ ahia.
iv. Jisọs gara ije n’ elu mmiri.
v. Uwe m dị n’ ime akpati.
Nke abụọ bụ nke eji ezipụta mgbochiume dị ka
i. Azụ dị na mmiri.
ii. Ngozi bi na legosi.
iii. Ụkwụ ya kụtụrụ na bọọlụ.
iv. Uwe m dabara na mmiri.
v. Amaka bi na Nnewi.
GB. AKARA UHIE [-]
Akara uhie na-apụtakari n’ ahịrịokwu oge ọ na- arụ ọrụ dị ka nyemakangwaa.
Ọmụmaatụ:
i. Ada na-azụ ụlọ.
ii. Nwata ahụ ka ga – eje ije.
iii. Uchenna ga – esi ofe echi.
iv. Nwanne m na – asụ ede.
v. Onye isi ụlọ m na – ede ihe n’ akwụkwọ.
ISI NKE ASAA
7.1 AHỊRỊOKWU (SENTENCE)
Ahịrịokwu bụ mkpụrụokwu ole na ole gara n’ ezigbo usoro nwere ngwaa, echiche nanghọta zuru oke. Ka ahịrịokwu wee zuo ezigbo oke, ọ ga – enweriri onye maọbụ ihe ọ na-ekwu maka ya nwekwa ihe ekwuru maka onye ma ọ bụ ihe ahụ.
Ọmụmaatụ:
i. Nụọ
ii. Rie
iii. Taa
iv. Obi bi n’ legosu.
v. Nkechi jere ahia.
7.2 ỤDḷ AHỊRỊOKWU IGBO ENWERE
1. Ahịrịmfe (Simple sentence)
2. Ahịrịnha (Compund sentence)
3. Ahịrịukwu (Multiple sentence)
4. Ahịrịmgbagwo (Complex sentence)
5. Ahịrịajụjụ (Interrogative sentence)
7.3 NKỌWA IHE BỤ AHḷRḷMFE
Ahịrịmfe bụ ahịrịokwu na – enwe naanị otu ngwaa nke na – ezipụta naanị otu echiche na nghọta.
Ọmụmaatụ:
a. Obi churu mmiri.
b. Okeke jere ahia.
ch. O gwuru mmiri.
d. Ada gbara ọsọ.
e. Chisom na – achi ọchị.
Ọmụmaatụ:
|
S/N |
Ahịrịmfe Nkwe |
Ahịrịmfe Nju |
|
i. |
Obi Churu mmiri |
Obi echughị mmiri |
|
ii. |
Okeke jere ahia |
Okeke ejeghị ahia |
|
iii. |
O gwuru mmiri |
O gwughị mmiri |
|
iv. |
Ada gbara ọsọ |
Ada gbaghị ọsọ |
|
v. |
Chisom na-achị ọchị |
Chisom anaghị achị ọchị |
|
vi. |
Uche bụ Ụkọchukwu |
Nche abụghị Ụkọcukwu |
|
vii. |
Azubuike zuru ohi |
Azubuike ezughị ohi |
|
viii. |
Ada bụ nwa chukwu |
Ada abụghi nwa chukwu |
|
ix. |
O nwere ego |
O nweghị ego |
|
x. |
Ebere siri ofe Akwụ |
Ebere esighị ofe Akwụ |
|
xi |
Ọriakụ nwere Ugboelu |
Ọriakụ enweghị Ugboelu |
ISI NKE ASATỌ
NRỤKỌRỊTA ỌRỤ NA URU Ọ BABA
8.1 NKỌWA IHE BỤ NRỤKỌRỊTA ỌRỤ
Nrụkọrịta ọrụ bụ mmadụ na ibe ya inọrọ n’ otu ụlọ ọrụ na arụkọrịta ọrụ. N’ ụlọ ọrụ di iche iche a na – adị ọtụtụ mmadịị na – arụkọrịta ọrụ. N’ ụlọ ọrụ ụfọdụ ọ na – abụ naanị ụmụnwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyi.
Nrụkọrịta ọrụ na – aka nke ọzọ bụ mgbe mmadu abụọ ma ọ bụ karịa tụrụ arọ, kwe kọrịta na ha ga-adị na enyere onwe ha aka.
Ọmụmaatụ: Ọrụ mmadụ abụọ ma ọ bụ karia bụ ndị a:
i. Ichụ nta.
ii. Ọrụ ugbo
iii. Ọrụ isụ akwa
iv. Iza ụlọ
v. Isụ mmanụ nri dgz
8.2 URU Dḷ NA NRỤKỌRỊTA ỌRỤ
1. Ime ka ọrụ dị mfe: Nrụkọrịta ọrụ na – eme ka ọrụ ahụ dị mfe.
2. Iweta obi Aṅụrị: N’ ebe a dị ọtụtụ mmadụ na – amụ mee ka iwe onye ọ dị n’ obi dajụọ. A rụkata ọrụ e zurutụ ike nọ kọọ kpa amụ dị na ya.
3. Iweta Agbammbo: Ebe ọ bụla enwere ọtụtụ mmadụ na-arụkọrita ọrụ ọnụ, a gana – enwe agbammbo.
4. Iweta ịdị Uchu: Ịdị uchu ọrụ bụ mmadu igba mbo were ọrụ ọna – arụ dịka ọrụ nke aka ya.
5. Ikwalite mmekọrịta mmadụ Na Ibe ya: Ụfọdu mmadụ anaghị enwe ezi mmekọrịta n’ ezinaụlọ na mana, Ezi mmekọrịta dị n’ ụlọ ọrụ na ezinaụlọ, ọganịịhụ ga na-adị n’ ụlọ ọrụ ahụ nakwa azinaụlọ.
8.3 ỌGHỌM Dḷ N’ ỊRỤKỌRITA ỌRỤ
1. Ụfụ Anya: Ụfọdụ na – atajiri ibe na anya n’ ihi na e buliri ha n’ okwa kari ha.
2. Akpọmasị: Ụfọdụ ndị ọrụ ahụ na – akpọ onwe ha asi.
3. Ọgba Agbara: Ọ bụrụ ụlọ ọrụ ebe enweghị mmekọrịta, ndị ajọ mmadụ n’ ime ha na- agba mbọ mebie obi ndị na – arụsị ọrụ ike wee ka e nwee ọgba aghara.
4. Idọghachi ụlọ ọrụ Azụ: Ụfọdụ ụlọ ọrụ nwere ọtụtụ ndi njọ mmadụ na – adọla ụlọ ọrụ ahụ azụ.
ISI NKE ITOOLU
NTỤGHARỊ AHḷRḷOKWU (TRANSLATION)
9.1 NKỌWA NTỤGHARỊ:
Ntụgharị bụ ịsụgharị ihe dị n’otu asụsụ ka ọ dị n’asụsụ ọzọ, ka echiche, nghọta na mpụtara ya bụrụ otu.
9.2 IHE MGBAKWASA UKWU MAKA NTỤGHARỊ
1. Gụọ ihe enyere gi ọtụtụ ugboro iji mata echiche na ebmnuche di na ya.
2. Ntụgharị mkpụrụokwu ga-adị na mkpụrụokwu nke ahịrịokwu ga- adi n’ ahịrịokwu nke nkeji edemede ga- adịkwa na nkeji edemede. (paragraph)
3. Na ntụgharị, a gaghi etinye echiche ọzọ ma ọ bụ wepụ ewepu. Ọmụmaatụ:
“ He went to the market” ga- abụ “Ọ gara ahia” Ọ gaghị abụ “Ọ gara igote ihe n’ ahịa”.
4. E nwere ilu, akpalaokwu na atụmatụ okwu bekee a ga-eji nke igbo ya na nke bekee ahụ nwere otu echiche na mpụtara tụgharịa ya.
Ọmụmaatụ:
“A stitch in time, saves nine” ga- abụ “E mee ngwa ngwa emeghara ọdachị” “There is no smoke without fire” ga- abụ “Awọ anaghị agha ọsọ ehihie n’efu”.
9.3 NTỤGHARỊ IHE EDERE NA BEKEE N’IGBO
|
Bekee |
Igbo |
|
Bread |
Achicha |
|
Time |
Oge |
|
O’clock |
Elekere |
|
Minute |
Nkeji |
|
Tall |
Ogologo |
|
Male |
Nwoke |
|
White |
Ọcha |
|
Truth |
Eziokwu |
|
Water |
Mmiri |
|
December |
Disemba |
|
November |
Novemba |
|
October |
Ọktoba |
|
Sunday |
Sonde |
|
Tuesday |
Tuzudee |
|
Assignment |
Ihe omume |
|
Reported |
Okwungwon |
|
Plural |
Ụbara |
|
Singular |
Mkpolu |
|
Padlock |
Igodo |
|
Paragraph |
Nkeji edemede |
|
Sentence |
Ahịrịokwu |
|
Teacher |
Onyenkuzi |
|
Food |
Nri |
|
Moon |
Ọnwa |
|
Poem |
Abụ |
9.4 NTỤGHARỊ AHỊRỊOKWU NA ILU.
|
|
Bekee |
Igbo |
|
1. |
I should have come there. |
A garam abịa ebe ahu. |
|
2. |
Adamma has take in. |
Adamma adila ime. |
|
3. |
Nkechi went to market. |
Nkechi jere ahịa. |
|
4. |
She bought some meat. |
Ọ zụtara anụ. |
|
5. |
There is no smoke without fire. |
Awọ anaghị agba ọsọ ehihie n’efu. |
|
6. |
The man gave me one thousand naira. |
Nwoke ahụ nyere m otu puku naira. |
|
7. |
His uncle deliberately stood up. |
Nwanne nna ya nke nwoke kpachara anya kwuru ọtọ. |
|
8. |
The patient's dog eats the fattest bone. |
Onye ndidi na- eri azụ ukpoo. |
|
9. |
Ngozi took the first position. |
Ngozi gbara onye nke mbu. |
|
10. |
Obi is the son of the soil. |
Obi bụ nwa amaala. |
ISI NKE IRI
AHỤIKE NDḷ NTỌRỌBỊA
10.1 NKỌWA MAKA NDḷ NTỌRỌBḷA
Ntọrọbia bụ ndị gbara bido n’ afọ iri na asatọ wee ruo ihe dịka afọ iri atọ. Ọ bụrụ onye nwaanyị anyi akpọọ ya nwa aghọghọbịa.
Ahụike pụtara oge mmadụ enweghiọrịa ọ bụla na-enye ya nsogbu, iri ezigbo nri na inwe ezumiike na-eme ka mmadụ nwee ahụike oge niile.
10.2 Mgbanwe n’ ahụ Ntọrọbịa
Mgbe mmadụ si na nwa baa na ntọrọbịa, a na-ahụ ihe mgbanwe ndị a n’ahụ ha:
1. Olu ha na-agbanwe: Olu ha na-adabu gịrịgịrị ga-agbanwe na-edekpuzi edekpu olu ha ga-esi n’ olu nwanta wee dawazie ka olu nna ma ọ bụ nne.
2. Ụtọ Ha: Ha ga-adị ka ihe a manyere eriri dọtia ya ogologo. Ha na-ala n’ elu wee toruo etu onye ahụ ga-etodebe.
3. Aji digasi ha n’ ahụ: Aji digasi ha n’ ahụ ga-eto na-eji oji.
4. Omume ha na-agbanwe.
5. Ịchọwa mmekọrịta Nwoke na Nwaanyị: Ha ga-ebido pinyewere onwe ha anya.
10.3 ỌRḷA Dḷ ICHE ICHE
1. Ọrịa mmekọrịta nwoke Na Nwaanyi dika HIV/AIDS, Ọria nsi nwaanyi, na ọkọ ọjọọ.
2. Ọrịa iba: Nke a bu ọrịa zuru ọha niile ọnụ n’ ala ndị isi ojii ebe anwunta na-ata ọ dịghị onye ọ bụla ọ họrọ.
3. Ọrịa Taifọịdị: Ọrịa bụkwa ọria so emesi ndị ntọrọbịa ike
4. Ọrịa Hapataitiisi: Ọrịa sokwa n’ ihe ndị ntọrọbịa na-aria. Ndị ụfọdụ na-akpọ ya ịba ojii.
10.4 ỤZỌ MGBOCHI ỌRỊA NDḷ A
1. Ịgbara mmekọrịta nwoke na Nwaanyị ọsọ.
2. Ọrịa ibe: Ha nwekwara ike na- agba ọgwụ ndị na – egbu anwunta ka ọ ghara ita ha.
3. Ndebe onwe na gburugburu ọcha.
5. Igba ọgwụ mgbochi.
ISI NKE IRI NA OTU
ỌNỤỌGỤGỤ (Numerals) (1-500)
11.1 NKỌWA ỌNỤỌGỤGỤ
Ọnụọgụgụ bụ usoro ọgụgụ n’ igbo. Ọnụogụgụ so n’ otu n’ ime nkeji asụsụ e nwere n’ igbo. Eji ọnụọgụgụ ezipụta ole ihe dị. Nwekwa nke a na-agụ n’ ụzọ ego dịka kobo, Naira abụọ.
ỌMỤMAATỤ
|
BEKEE |
IGBO |
|
0 |
Efu |
|
1 |
Otu |
|
2 |
Abụọ |
|
3 |
Atọ |
|
4 |
Anọ |
|
5 |
ise |
|
6. |
ịsịị |
|
7. |
Asaa |
|
8 |
Asatọ |
|
9 |
Itoolu |
|
10 |
Iri |
|
11 |
Iri na otu |
|
12 |
Iri na abụọ |
|
13 |
Iri na atọ |
|
14 |
Iri na anọ |
|
15 |
Iri na ise |
|
16 |
Iri na ịsịị |
|
17 |
Iri na asaa |
|
18. |
Iri na asatọ |
|
19 |
Iri na itoolu |
|
20 |
Iri abụọ |
|
21 |
Iri abụọ na otu |
|
22. |
Iri abụọ na abụọ |
|
23 |
Iri abụọ na atọ |
|
24 |
Iri abụọ na anọ |
|
25 |
Iri abụọ na ise |
|
26 |
Iri abụọ na ịsịị |
|
27 |
Iri abụọ na asaa |
|
28 |
Iri abụọ na asatọ |
|
29 |
Iri abụọ na itoolu |
|
30 |
Iri atọ |
|
31 |
Iri atọ na otu |
|
32 |
Iri atọ na abụọ |
|
33 |
Iri atọ na atọ |
|
34 |
Iri atọ na anọ |
|
35 |
Iri atọ na ise |
|
36 |
Iri atọ na ịsịị |
|
37 |
Iri atọ na asaa |
|
38 |
Iri atọ na asatọ |
|
39 |
Iri atọ na itoolu |
|
40 |
Iri anọ |
|
41 |
Iri anọ na otu |
|
42 |
Iri anọ na abụọ |
|
43 |
Iri anọ na atọ |
|
44 |
Iri anọ na anọ |
|
45 |
Iri anọ na ise |
|
46 |
Iri anọ na ịsịị |
|
47 |
Iri anọ na asaa |
|
48 |
Iri anọ na asatọ |
|
49 |
Iri anọ na itoolu |
|
50 |
Iri ise |
|
51 |
Iri ise na otu |
|
52 |
Iri ise na abụọ |
|
53 |
Iri ise na atọ |
|
54 |
Iri ise na anọ |
|
55 |
Iri ise na ise |
|
56 |
Iri ise na ịsịị |
|
57 |
Iri ise na asaa |
|
58 |
Iri ise na asatọ |
|
59 |
Iri ise na itoolu |
|
60 |
Iri ịsịị |
|
61 |
Iri ịsịị na otu |
|
62 |
Iri ịsịị na abụọ |
|
63 |
Iri ịsịị na atọ |
|
64 |
Iri ịsịị na anọ |
|
65 |
Iri ịsịị na ise |
|
66 |
Iri ịsịị na ịsịị |
|
67 |
Iri ịsịị na asaa |
|
68 |
Iri ịsịị na asatọ |
|
69 |
Iri ịsịị na itoolu |
|
70 |
Iri asaa |
|
71 |
Iri asaa na otu |
|
72 |
Iri asaa na abụọ |
|
73 |
Iri asaa na atọ |
|
74 |
Iri asaa na anọ |
|
75 |
Iri asaa na ise |
|
76 |
Iri asaa na ịsịị |
|
77 |
Iri asaa na asaa |
|
78 |
Iri asaa na asatọ |
|
79 |
Iri asaa na itoolu |
|
80 |
Iri asatọ |
|
81 |
Iri asatọ na otu |
|
82 |
Iri asatọ na abụọ |
|
83 |
Iri asatọ na atọ |
|
84 |
Iri asatọ na anọ |
|
85 |
Iri asatọ na ise |
|
86 |
Iri asatọ na ịsịị |
|
87 |
Iri asatọ na asaa |
|
88 |
Iri asatọ na asatọ |
|
89 |
Iri asatọ na itoolu |
|
90 |
Iri itoolu |
|
91 |
Iri itoolu na otu |
|
92 |
Iri itoolu na abụọ |
|
93 |
Iri itoolu na atọ |
|
94 |
Iri itoolu na anọ |
|
95 |
Iri itoolu na ise |
|
96 |
Iri itoolu na ịsịị |
|
97 |
Iri itoolu na asaa |
|
98 |
Iri itoolu na asatọ |
|
99 |
Iri itoolu na itoolu |
|
100 |
Otu nari |
|
101 |
Nari na otu |
|
102 |
Nari na abụọ |
|
103 |
Nari na atọ |
|
104 |
Nari na anọ |
|
105 |
Nari na ise |
|
106 |
Nari na ịsịị |
|
107 |
Nari na asaa |
|
108 |
Nari na asatọ |
|
109 |
Nari na itoolu |
|
110 |
Nari na iri |
|
111 |
Nari na iri na otu |
|
112 |
Nari na iri na abụọ |
|
113 |
Nari na iri na atọ |
|
114 |
Nari na iri na anọ |
|
115 |
Nari na iri na ise |
|
116 |
Nari na iri na ịsịị |
|
117 |
Nari na iri na asaa |
|
118 |
Nari na iri na asatọ |
|
119 |
Nari na iri na itoolu |
|
120 |
Nari na iri abụọ |
|
121 |
Nari na iri abụọ na otu |
|
122 |
Nari na iri abụọ na abụọ |
|
123 |
Nari na iri abụọ na atọ |
|
124 |
Nari na iri abụọ na anọ |
|
125 |
Nari na iri abụọ na ise |
|
126 |
Nari na iri abụọ na ịsịị |
|
127 |
Nari na iri abụọ na asaa |
|
128 |
Nari na iri abụọ na asatọ |
|
129 |
Nari na iri abụọ na itoolu |
|
130 |
Nari na iri atọ |
|
131 |
Nari na iri atọ na otu |
|
132 |
Nari na iri atọ na abụọ |
|
133 |
Nari na iri atọ na atọ |
|
134 |
Nari na iri atọ na anọ |
|
135 |
Nari na iri atọ na ise |
|
136 |
Nari na iri atọ na ịsịị |
|
137 |
Nari na iri atọ na asaa |
|
138 |
Nari na iri atọ na asatọ |
|
139 |
Nari na iri atọ na itoolu |
|
140 |
Nari na iri anọ |
|
141 |
Nari na iri anọ na otu |
|
142 |
Nari na iri anọ na abụọ |
|
143 |
Nari na iri anọ na atọ |
|
144 |
Nari na iri anọ na anọ |
|
145 |
Nari na iri anọ na ise |
|
146 |
Nari na iri anọ na ịsịị |
|
147 |
Nari na iri anọ na asaa |
|
148 |
Nari na iri anọ na asatọ |
|
149 |
Nari na iri anọ na itoolu |
|
150 |
Nari na iri ise |
|
151 |
Nari na iri ise na otu |
|
152 |
Nari na iri ise na abụọ |
|
153 |
Nari na iri ise na atọ |
|
154 |
Nari na iri ise na anọ |
|
155 |
Nari na iri ise na ise |
|
156 |
Nari na iri ise na ịsịị |
|
157 |
Nari na iri ise na asaa |
|
158 |
Nari na iri ise na asatọ |
|
159 |
Nari na iri ise na itoolu |
|
160 |
Nari na iri ịsịị |
|
161 |
Nari na iri ịsịị na otu |
|
162 |
Nari na iri ịsịị na abụọ |
|
163 |
Nari na iri ịsịị na atọ |
|
164 |
Nari na iri ịsịị na anọ |
|
165 |
Nari na iri ịsịị na ise |
|
166 |
Nari na iri ịsịị na ịsịị |
|
167 |
Nari na iri ịsịị na asaa |
|
168 |
Nari na iri ịsịị na asatọ |
|
169 |
Nari na iri ịsịị na itoolu |
|
170 |
Nari na iri asaa |
|
171 |
Nari na iri asaa na otu |
|
172 |
Nari na iri asaa na abụọ |
|
173 |
Nari na iri asaa na atọ |
|
174 |
Nari na iri asaa na anọ |
|
175 |
Nari na iri asaa na ise |
|
176 |
Nari na iri asaa na ịsịị |
|
177 |
Nari na iri asaa na asaa |
|
178 |
Nari na iri asaa na asatọ |
|
|
|
179 |
Nari na iri asaa na itoolu |
|
|
|
180 |
Nari na iri asatọ |
|
|
|
181 |
Nari na iri asatọ na otu |
|
|
|
182 |
Nari na iri asatọ na abụọ |
|
|
|
183 |
Nari na iri asatọ na atọ |
|
|
|
184 |
Nari na iri asatọ na anọ |
|
|
|
185 |
Nari na iri asatọ na ise |
|
|
|
186 |
Nari iri asatọ na ịsịị |
|
|
|
187 |
Nari iri asatọ na asaa |
|
|
|
188 |
Nari iri asatọ na asatọ |
|
|
|
189 |
Nari iri asatọ na itoolu |
|
|
|
190 |
Nari iri itoolu |
|
|
|
191 |
Nari iri itoolu na otu |
|
|
|
192 |
Nari iri itoolu na abụọ |
|
|
|
193 |
Nari iri itoolu na atọ |
|
|
|
194 |
Nari iri itoolu na anọ |
|
|
|
195 |
Nari iri itoolu na ise |
|
|
|
196 |
Nari iri itoolu na ịsịị |
|
|
|
197 |
Nari iri itoolu na asaa |
|
|
|
198 |
Nari iri itoolu na asatọ |
|
|
|
199 |
Nari iri itoolu na itoolu |
|
|
|
200 |
Nari abụọ |
|
|
|
201 |
Nari abụọ na otu |
|
|
|
202 |
Nari abụọ na abụọ |
|
|
|
203 |
Nari abụọ na atọ |
|
|
|
204 |
Nari abụọ na anọ |
|
|
|
205 |
Nari abụọ na ise |
|
|
|
206 |
Nari abụọ na ịsịị |
|
|
|
207 |
Nari abụọ na asaa |
|
|
|
208 |
Nari abụọ na asatọ |
|
|
|
209 |
Nari abụọ na itoolu |
||
|
210 |
Nari abụọ na iri |
||
|
211 |
Nari abụọ na iri na otu |
||
|
212 |
Nari abụọ na iri na abụọ |
||
|
213 |
Nari abụọ na iri na atọ |
||
|
214 |
Nari abụọ na iri na anọ |
||
|
215 |
Nari abụọ na iri na ise |
||
|
216 |
Nari abụọ na iri na ịsịị |
||
|
217 |
Nari abụọ na iri na asaa |
||
|
218 |
Nari abụọ na iri na asatọ |
||
|
219 |
Nari abụọ na iri na itoolu |
||
|
220 |
Nari abụọ na iri abụọ |
||
|
221 |
Nari abụọ na iri abụọ abụọ na otu |
||
|
222 |
Nari abụọ na iri abụọ na abụọ |
||
|
223 |
Nari abụọ na iri abụọ na atọ |
||
|
224 |
Nari abụọ na iri abụọ na anọ |
||
|
225 |
Nari abụọ na iri abụọ na ise |
||
|
226 |
Nari abụọ na iri abụọ na ịsịị |
||
|
227 |
Nari abụọ na iri abụọ na asaa |
||
|
228 |
Nari abụọ buo na iri abụọ na asatọ |
||
|
229 |
Nari abụọ na iri abụọ na itoolu |
||
|
230 |
Nari abụọ na iri atọ |
||
|
231 |
Nari abụọ na iri atọ na otu |
||
|
232 |
Nari abụọ na iri atọ na abụọ |
||
|
233 |
Nari abụọ na iri atọ na atọ |
||
|
234 |
Nari abụọ na iri atọ na anọ |
||
|
235 |
Nari abụọ na iri atọ na ise |
||
|
236 |
Nari abụọ na iri atọ na ịsịị |
||
|
237 |
Nari abụọ na iri atọ na asaa |
||
|
238 |
Nari abụọ na iri atọ na asatọ |
||
|
239 |
Nari abụọ na iri atọ na itoolu |
||
|
240 |
Nari abụọ na iri anọ |
|
241 |
Nari abụọ na iri anọ na otu |
|
242 |
Nari abụọ na iri anọ na abụọ |
|
243 |
Nari abụọ na iri anọ na atọ |
|
244 |
Nari abụọ na iri anọ na anọ |
|
245 |
Nari abụọ na iri anọ na ise |
|
246 |
Nari abụọ na iri anọ na ịsịị |
|
247 |
Nari abụọ na iri anọ na asaa |
|
248 |
Nari abụọ na iri anọ na asatọ |
|
249 |
Nari abụọ na iri anọ na itoolu |
|
250 |
Nari abụọ na iri ise |
|
251 |
Nari abụọ na iri ise na otu |
|
252 |
Nari abụọ na iri ise na abụọ |
|
253 |
Nari abụọ na iri ise na atọ |
|
254 |
Nari abụọ na iri ise na anọ |
|
255 |
Nari abụọ na iri ise na ise |
|
256 |
Nari abụọ na iri ise na ịsịị |
|
257 |
Nari abụọ na iri ise na asaa |
|
258 |
Nari abụọ na iri ise na asatọ |
|
259 |
Nari abụọ na iri ise na itoolu |
|
260 |
Nari abụọ na iri ịsịị |
|
261 |
Nari abụọ na iri ịsịị na otu |
|
262 |
Nari abụọ na iri ịsịị na abụọ |
|
263 |
Nari abụọ na iri ịsịị na atọ |
|
264 |
Nari abụọ na iri ịsịị na anọ |
|
265 |
Nari abụọ na iri ịsịị na ise |
|
266 |
Nari abụọ na iri ịsịị na ịsịị |
|
267 |
Nari abụọ na iri ịsịị na asaa |
|
268 |
Nari abụọ na iri ịsịị na asatọ |
|
269 |
Nari abụọ na iri ịsịị na itoolu |
|
270 |
Nari abụọ na iri asaa 43 |
|
271 |
Nari abụọ na iri asaa na otu |
|
272 |
Nari abụọ na iri asaa na abụọ |
|
273 |
Nari abụọ na iri asaa na atọ |
|
274 |
Nari abụọ na iri asaa na anọ |
|
275 |
Nari abụọ na iri asaa na ise |
|
276 |
Nari abụọ na iri asaa na ịsịị |
|
277 |
Nari abụọ na iri asaa na asaa |
|
278 |
Nari abụọ na iri asaa na asatọ |
|
279 |
Nari abụọ na iri asaa na itoolu |
|
280 |
Nari abụọ na iri asatọ |
|
281 |
Nari abụọ na iri asatọ na otu |
|
282 |
Nari abụọ na iri asatọ na abụọ |
|
283 |
Nari abụọ na iri asatọ na atọ |
|
284 |
Nari abụọ na iri asatọ na anọ |
|
285 |
Nari abụọ na iri asatọ na ise |
|
286 |
Nari abụọ na iri asatọ na ịsịị |
|
287 |
Nari abụọ na iri asatọ na asaa |
|
288 |
Nari abụọ na iri asatọ na asatọ |
|
289 |
Nari abụọ na iri asatọ na itoolu |
|
290 |
Nari abụọ na iri itoolu |
|
291 |
Nari abụọ na iri itoolu na otu |
|
292 |
Nari abụọ na iri itoolu na abụọ |
|
293 |
Nari abụọ na iri itoolu na atọ |
|
294 |
Nari abụọ na iri itoolu na anọ |
|
295 |
Nari abụọ na iri itoolu na ise |
|
296 |
Nari abụọ na iri itoolu na ịsịị |
|
297 |
Nari abụọ na iri itoolu na asaa |
|
298 |
Nari abụọ na iri itoolu na asatọ |
|
299 |
Nari abụọ na iri itoolu na itoolu |
|
300 |
Nari atọ |
|
301 |
Nari atọ na otu |
|
302 |
Nari atọ na abụọ |
|
303 |
Nari atọ na atọ |
|
304 |
Nari atọ na anọ |
|
305 |
Nari atọ na ise |
|
306 |
Nari atọ na ịsịị |
|
307 |
Nari atọ na asaa |
|
308 |
Nari atọ na asatọ |
|
309 |
Nari atọ na itoolu |
|
310 |
Nari atọ na iri |
|
311 |
Nari atọ na iri na otu |
|
312 |
Nari atọ na iri na abụọ |
|
313 |
Nari atọ na iri na atọ |
|
314 |
Nari atọ na iri na anọ |
|
315 |
Nari atọ na iri na ise |
|
316 |
Nari atọ na iri na ịsịị |
|
317 |
Nari atọ na iri na asaa |
|
318 |
Nari atọ na iri na asatọ |
|
319 |
Nari atọ na iri na itoolu |
|
320 |
Nari atọ na iri abụọ |
|
321 |
Nari atọ na iri abụọ na otu |
|
322 |
Nari atọ na iri abụọ na abụọ |
|
323 |
Nari atọ na iri abụọ na atọ |
|
324 |
Nari atọ na iri abụọ na anọ |
|
325 |
Nari atọ na iri abụọ na ise |
|
326 |
Nari atọ na iri abụọ na ịsịị |
|
327 |
Nari atọ na iri abụọ na asaa |
|
328 |
Nari atọ na iri abụọ na asatọ |
|
329 |
Nari atọ na iri abụọ na itoolu |
|
330 |
Nari atọ na iri atọ |
|
331 |
Nari atọ na iri atọ na otu |
|
332 |
Nari atọ na iri atọ na abụọ |
|
333 |
Nari ato na iri atọ na atọ |
|
334 |
Nari atọ na iri atọ na anọ |
|
335 |
Nari atọ na iri atọ na ise |
|
336 |
Nari atọ na iri atọ na ịsịị |
|
337 |
Nari atọ na iri atọ na asaa |
|
338 |
Nari atọ na iri atọ na asatọ |
|
339 |
Nari atọ na iri atọ na itoolu |
|
340 |
Nari atọ na iri anọ |
|
341 |
Nari atọ na iri anọ na otu |
|
342 |
Nari atọ na iri anọ n a abụọ |
|
343 |
Nari atọ na iri anọ na atọ |
|
344 |
Nari atọ na iri anọ na anọ |
|
345 |
Nari atọ na iri anọ na ise |
|
346 |
Nari atọ na iri anọ na ịsịị |
|
347 |
Nari atọ na iri anọ na asaa |
|
348 |
Nari atọ na iri anọ na asatọ |
|
349 |
Nari atọ na iri anọ na itoolu |
|
350 |
Nari atọ na iri ise |
|
351 |
Nari atọ na iri ise na otu |
|
352 |
Nari atọ na iri ise na abụọ |
|
353 |
Nari atọ ato na iri ise na atọ |
|
354 |
Nari atọ na iri ise na anọ |
|
355 |
Nari atọ na iri ise na ise |
|
356 |
Nari atọ na iri ise na ịsịị |
|
357 |
Nari atọ na iri ise na asaa |
|
358 |
Nari atọ na iri ise na asatọ |
|
359 |
Nari atọ na iri ise na itoolu |
|
360 |
Nari atọ na iri ịsịị |
|
361 |
Nari atọ na iri ịsịị na otu |
|
362 |
Nari atọ na iri ịsịị na abụọ |
|
363 |
Nari atọ na iri ịsịị na atọ |
|
364 |
Nari atọ na iri ịsịị na anọ |
|
365 |
Nari atọ na iri ịsịị na ise |
|
366 |
Nari atọ na iri ịsịị na ịsịị |
|
367 |
Nari atọ na iri ịsịị na asaa |
|
368 |
Nari atọ na iri ịsịị na asatọ |
|
369 |
Nari atọ na iri ịsịị na itoolu |
|
370 |
Nari atọ na iri asaa |
|
371 |
Nari atọ na iri asaa na otu |
|
372 |
Nari atọ ato na iri asaa na abụọ |
|
373 |
Nari atọ na iri asaa na atọ |
|
374 |
Nari atọ na iri asaa na anọ |
|
375 |
Nari atọ na iri asaa na ise |
|
376 |
Nari atọ na iri asaa na ịsịị |
|
377 |
Nari atọ na iri asaa na asaa |
|
378 |
Nari atọ na iri asaa na asatọ |
|
379 |
Nari atọ na iri asaa na itoolu |
|
380 |
Nari atọ na iri asatọ |
|
381 |
Nari atọ na iri asatọ na otu |
|
382 |
Nari atọ na iri asatọ na abụọ |
|
383 |
Nari atọ na iri asatọ na atọ |
|
384 |
Nari atọ na iri asatọ na anọ |
|
385 |
Nari atọ na iri asatọ na ise |
|
386 |
Nari atọ na iri asatọ na ịsịị |
|
387 |
Nari atọ na iri asatọ na asaa |
|
388 |
Nari atọ na iri asatọ na asatọ |
|
389 |
Nari atọ na iri asatọ na itoolu |
|
390 |
Nari atọ na iri itoolu |
|
391 |
Nari atọ na iri itoolu na otu |
|
392 |
Nari atọ na iri itoolu na abụọ |
|
393 |
Nari atọ na iri itoolu na atọ |
|
394 |
Nari atọ na iri itoolu na anọ |
|
395 |
Nari atọ na iri itoolu na ise |
|
396 |
Nari atọ na iri itoolu na ịsịị |
|
397 |
Nari atọ na iri itoolu na asaa |
|
398 |
Nari atọ na iri itoolu na asatọ |
|
399 |
Nari atọ na iri itoolu na itoolu |
|
400 |
Nari anọ |
|
401 |
Nari anọ na otu |
|
402 |
Nari anọ na abụọ |
|
403 |
Nari anọ na atọ |
|
404 |
Nari anọ na anọ |
|
405 |
Nari anọ na ise |
|
406 |
Nari anọ na ịsịị |
|
407 |
Nari anọ na asaa |
|
408 |
Nari anọ na asatọ |
|
409 |
Nari anọ na itoolu |
|
410 |
Nari anọ na iri |
|
411 |
Nari anọ na iri na otu |
|
412 |
Nari anọ na iri na abụọ |
|
413 |
Nari anọ na iri na atọ |
|
414 |
Nari anọ na iri na anọ |
|
415 |
Nari anọ na iri na ise |
|
416 |
Nari anọ na iri na ịsịị |
|
417 |
Nari anọ na iri na asaa |
|
418 |
Nari anọ na iri na asatọ |
|
419 |
Nari anọ na iri na itoolu |
|
420 |
Nari anọ na iri abụọ |
|
421 |
Nari anọ na iri abụọ na otu |
|
422 |
Nari anọ na iri abụọ na abụọ |
|
423 |
Nari anọ na iri abụọ na atọ |
|
424 |
Nari anọ na iri abụọ na anọ |
|
425 |
Nari anọ na iri abụọ na ise |
|
426 |
Nari anọ na iri abụọ na ịsịị |
|
427 |
Nari anọ na iri abụọ na asaa |
|
428 |
Nari anọ na iri abụọ na asatọ |
|
429 |
Nari anọ na iri abụọ na itoolu |
|
430 |
Nari anọ na iri atọ |
|
431 |
Nari anọ na iri atọ na otu |
|
432 |
Nari anọ na iri atọ na abụọ |
|
433 |
Nari anọ na iri atọ na atọ |
|
434 |
Nari anọ na iri atọ na anọ |
|
435 |
Nari anọ na iri atọ na ise |
|
436 |
Nari anọ na iri atọ na ịsịị |
|
437 |
Nari anọ na iri atọ na asaa |
|
438 |
Nari anọ na iri atọ na asatọ |
|
439 |
Nari anọ na iri atọ na itoolu |
|
440 |
Nari anọ na iri anọ |
|
441 |
Nari anọ na iri anọ na otu |
|
442 |
Nari anọ na iri anọ na abụọ |
|
443 |
Nari anọ na iri anọ na atọ |
|
444 |
Nari anọ na iri anọ na anọ |
|
445 |
Nari anọ na iri anọ na ise |
|
446 |
Nari anọ na iri anọ na ịsịị |
|
447 |
Nari anọ na iri anọ na asaa |
|
448 |
Nari anọ na iri anọ na asatọ |
|
449 |
Nari anọ na iri anọ na itoolu |
|
450 |
Nari anọ na iri ise |
|
451 |
Nari anọ na iri ise na otu |
|
452 |
Nari anọ na iri ise na abụọ |
|
453 |
Nari anọ na iri ise na atọ |
|
454 |
Nari anọ na iri ise na anọ |
|
455 |
Nari anọ na iri ise na ise |
|
456 |
Nari anọ na iri ise na ịsịị |
|
457 |
Nari anọ na iri ise na asaa |
|
458 |
Nari anọ na iri ise na asato |
|
459 |
Nari anọ na iri ise na itoolu |
|
460 |
Nari anọ na iri ịsịị |
|
461 |
Nari anọ na iri ịsịị na otu |
|
462 |
Nari anọ na iri ịsịị na abụọ |
|
463 |
Nari anọ na iri ịsịị na atọ |
|
464 |
Nari anọ na iri ịsịị na anọ |
|
465 |
Nari anọ na iri ịsịị na ise |
|
466 |
Nari anọ na iri ịsịị na ịsịị |
|
467 |
Nari anọ na iri ịsịị na asaa |
|
468 |
Nari anọ na iri ịsịị na asatọ |
|
469 |
Nari anọ na iri ịsịị na itoolu |
|
470 |
Nari anọ na iri asaa |
|
471 |
Nari anọ na iri asaa na otu |
|
472 |
Nari anọ na iri asaa na abụọ |
|
473 |
Nari anọ na iri asaa na atọ |
|
474 |
Nari anọ na iri asaa na anọ |
|
475 |
Nari anọ na iri asaa na ise |
|
476 |
Nari anọ na iri asaa na ịsịị |
|
477 |
Nari anọ na iri asaa na asaa |
|
478 |
Nari anọ na iri asaa na asatọ |
|
479 |
Nari anọ na iri asaa na itoolu |
|
480 |
Nari anọ na iri asatọ |
|
481 |
Nari anọ na iri asatọ na otu |
|
482 |
Nari anọ na iri asatọ na abụọ |
|
483 |
Nari anọ na iri asatọ na atọ |
|
484 |
Nari anọ na iri asatọ na anọ |
|
485 |
Nari anọ na iri asatọ na ise |
|
486 |
Nari anọ na iri asatọ na ịsịị |
|
487 |
Nari anọ na iri asatọ na asaa |
|
488 |
Nari anọ na iri asato na asatọ |
|
489 |
Nari anọ na iri asato na itoolu |
|
490 |
Nari anọ na iri itoolu |
|
491 |
Nari anọ na iri itoolu na otu |
|
492 |
Nari anọ na iri itoolu na abụọ |
|
493 |
Nari anọ na iri itoolu na atọ |
|
494 |
Nari anọ na iri itoolu na anọ |
|
495 |
Nari anọ na iri itoolu na ise |
|
496 |
Nari anọ na iri itoolu na ịsịị |
|
497 |
Nari anọ na iri itoolu na asaa |
|
498 |
Nari anọ na iri itoolu na asatọ |
|
499 |
Nari anọ na iri itoolu na itoolu |
|
500 |
Nari ise |
ISI NKE IRI NA ABỤỌ
NJḷRḷMARA NA NKENỤDḷ AGỤMAGỤ UGBA A
12.1 NKỌWA AGỤMAGỤ IGBO (Igbo Literature)
Agụmagụ bụ edemede ma ọ bụ akọrọ akọ nke na-enye obi aṅụri, afọ ojuju, amamihe na mkpalite uche.
Agụmagụ bụ echiche mmadụ chepụtara n’ obi ya wee dee ya dee ma ọ bụ kwupute ya n’ ọnụ nke na-enye amamihe, mkpalite nke mmụọ, obi ụtọ ma ọ bụ obi ọjọọ nakwa afọ ojuju.
12.2 ỤDḷ AGỤMAGỤ ENWERE
1. Agụmagụ ọdịnaala (Oral Literature)
2. Agụmagụ ugbua (Written Literature)
12.3 NKENỤDḷ AGỤMAGỤ UGBA A
Agụmagụ ugbu a bụ echiche mmadụ chepụtara ma detuo ya n’ ime akwụkwọ ka onye ọ bụla gụọ ya. Ọ bụ nzimozi nke mmadụ chepụtara n’ uche ma dekwaa ya edee n’ akwụkwọ nke na ezipụta ka ndi si ebi ndu.
Agụmagụ ugbu a bu enyo ndị igbo ji ahu onwe ha. E kere agụmagụ ugbo a ụzọ atọ. Ha bụ ndị a:
1. idụụazi (Prose)
2. Ejije (Drama)
3. Abụ (Poem)
12.4 NJỊRỊMARA AGỤMAGỤ UGBU A
1. A na- ede agụmagụ ugbu a n’ akwụkwọ.
2. Ọ na-enwe aha onye dere ya.
3. A na- egote ya n’ ahia ma na-ejidekwa ya.
4. A na-ama afọ edere akwụkwọ ahụ.
12.5 URU AGỤMAGỤ UGBU A BARA
1. Ọ na-eme obi ụtọ.
2. Eji ya akụziri ụmụaka omenala na asụsụ ha.
3. Ọ na-enye ego.
4. Ọ na-ahazi akparamgwa mmadụ.
12.6 ỤDḷ AGỤMAGỤ UGBU A ENWERE
i. Idụụazi (Prose): Idụụazi bụ akụkọ ugbu a nke n’ ezipụta ihe na-eme eme na ndu mmadụ, nke merela eme na nke ga-eme eme.
Imaatu: Jụọ obinna, ihe ọjọọ gbaa afọ, ukwa ruo oge ya. dgz
ii. Ejije (Drama): Ejije bụ emereme nṅomi nke ndị na-eme ya na-esite na nṅomi agwa ha abụghị mee ka ndi mmadụ mụta ihe ma ọ bụ nwee obi ụtọ.
iii. Abụ(Poem): Abụ bụ nzimuozi nke si na obi pụta nke enwere ike
dee n’ akwụkwọ ma ọ bụ zịpụta ya n’ ọnụ nke a na-eji okwu ọkpọka ma ọ bụ okwu apiri aka ma ọ bụ nke okwu bụ igbazipụta n’ ụzọ di nke nke
Enwere ụdị abụ dị, iche iche Ha bụ:
i. Abụ Nwa
ii. Abụ Agha
iii. Abụ Ikpe/Nkọcha
iv. Abụ otito
v. Abụ Akwa/Abụ ariri
vi. Abụ ọrụ
ISI NKE IRI NKE ATỌ
EKWUMEKWU BANYERE IHE Dḷ ICHE ICHE ỤMỤAKA NA-EME
13.1 Ihe ụmụaka na-emegasi n’ oge abali, na satọdee, ubochi ụka, n’ oge ezumike
A. Ihe ụmụaka Na-emegasi n’ oge abali:
Onye nkuzi ga-eji ajụjụ jụpụtasia ụmụ akwụkwọ ihe ha na-emegasi n’ oge abali dịka:
1. Inyere nne ha aka sie nri abali. Ụmụnwaanyị na-enyere nne ha aka na-esi nri mbe ụmụnwoke n’inyere nne ha aka sie nri.
2. Ịsụ ụtara akpụ iji maọ bụ gari ma esighee ha bụkwa ụmụnwoke na- eme ya.
3. iburu nri bụgara nna nwe ụlọ n’obi ya ma ọ bụrụ na nri eghee.
4. ije bụkọrọkwa aria nri nna nwe ụlọ jiri rie nri.
5. ije kute mmri ọṅụṅụ ma mgbe a chọrọ ya ma a ma na- eri nri.
13.2
B. Ihe ụmụaka na –eme N’ụbochi satọdee.
1. Ọ bụ satọdee ka ụmụaka ji enyere nne nanna ha aka.
2. Ụmụ aka na- azachasi ebe niile.
3. Ụmụaka na-asụcha akwa ha.
4. Ụfọdụ ji ụbọchị satọdee arụ ihe omume enyere ha mee n’lo akwukwo.
5. Ụfọdụ Ụmụ akwụkwọ jikwa satọdee amụ ihe gbasara ịgba bọọlụ.
13.3
CH. Ekwemekwu maka ihe ụmụaka Na-eme N’ụbọchị ụka.
1. Ụmụaka na- eje ụlọ ụka.
2 Ụmụaka bilite n’oge n’ụtụtụ kpee ekpere, zachasia ime ụlọ na ezi – ichu mmiri, inyere nne aka sie nri tupu e jewe uka.
3. Ụmụaka na-eje mkpagharị na be ndi enyi, ndi ikwunne na-ebe ndi ọzọ di ichi iche
4. Ụfọdụ jikwa ụbọchị ụka asụchasi uwe akwụkwọ ha.
5. Ụfọdụ na – amụkwa maka ọgbụgba bọọlụ.
13.4
D. Ekwemekwe maka ihe ụmụaka na- eme N’ oge ezumike.
1. Ụfọdụ na -anọrọ ụlọ nyere nne na nna ha aka n’ ọrụ ugbo, n’ịzụ ahia, n’ ahia mbugharị.
2. Ụfọdụ nọ n’ime obodo na –ejiko ọnụ n’otu na –aga ọrụ ugbo igburu ego.
3. Ụfọdụ na-esi n’ime obodo gaara ndị nwe ha ma ọ bụ enyi ha njem ezumike.
4. Ụfọdụ na-esi n’obodo mepere emepe lọta n’ime obodo.
5. Ụfọdụ ndi nwe ụmụaka ha n’ebenleghari anya dị iche iche dị ka: ebe a na- azụ ụmụ anụmanụ, ụlọ oriri na ọṅụṅụ na – ewu ewu. Na ebe a na- akpa ọkụkọ, ehi na azụ.dgz.
ISI NKE IRI NA ANỌ.
AGWA ỌMA NA AGWA ỌJỌỌ (Good and bad character).
14.1 NKỌWA AGWA ỌMA.
Agwa ọma bụ mgbe mmadụ na- eme ezigbo omume, na- ekwu eziokwu oge niile. Ọ bụ mmadụ ikpa ezigbo agwa dịka ikele ndị nne na nna ha, ndi toro ya, ndi agbataobi ya, ndị nkuzi ya na ndị mmadụ ọ hụrụ n’ụzọ.
Ụfọdụ n’ime agwa ọma bụ
i. ikele ekele
ii. iga ozi
iii. ikwu eziokwu
iv. inwe nsọpụrụ.
14.2 NKỌWA AGWA ỌJỌỌ
Agwa ọjọọ bụ mgbe mmadụ anaghị eme ezigbo omume, ọ dịghị ekwu eziokwu. Ọ bụkwa mgbe mmadụ anaaghị akpa ezigbo agwa dịka itu asi, iku asiri, iwe ihe mmadụ na ike na adịghị ekwu eziokwu oge niile ụfọdụ n’ Agwa ọjọọ.
i. itụ asi
ii. iwe ihe mmadụ
iii. ilu ọgụ
iv. iku Asịrị
v. igbu mmadụ
vi. izu ohi
14.3 URU AGWA ỌMA BARA.
Agwa ọma bara ọtụtụ ezigbo uru dị ka:
i. onye na- akpa agwa ọma na-enweta ezigbo aha.
ii. Ọ na-anata ọtụtụ ihe dị iche iche.
iii. Ọ na-abụ onye eji ama atụ oge niile.
iv. Ọ na-enwe nsọpụrụ na ugwu dịrị ya.
v. Ọ na-eweta nganiihu na ihunanya na-eme mmadụ ibe ya nọ.
vi. Ọ na-ewete ogologo ndụ.
vii. Ọ na-ewete udo na Ezinaụlọ.
14.4 ỌGHỌM DI NA AGWA ỌJỌỌ.
1. Ọ na-ewete ajọ aha.
2 Aga na-akpọ onye ahụ ajọ mmadụ.
3. Ọ gaghi enwe ugwu na nsopụrụ.
4. Ndị mmadụ ga-akpọ ya asi.
5. Ọ na-ewete atamaahụhụ.
ISI NKE IRI NA ISE
AGUMAGỤ ỌDḷNAALA (ORAL LITERATURE)
15.1 NKỌWA AGỤMAGỤ ỌDḷNAALA
Agụmagụ bụ echiche miri emi gbasara isiokwu ọ bụla nke ejiri asụsụ nka kọwapụta. Ọ bụkwa echiche n’ okwu nka ndị nnanna anyi, ndi mbu na ndị egede, gbasara ihe ha maara ma ọ bụ ihe ha nụrụ n’ akụkọ ma ọ bụ ha n’ anya.
Agụmagụ Odinaala bụ naani n’ ọnụ ka ndị gboo na akọ ya. Ọ na- abụkanari nkeesi n’aka ndị okenye wee na -enyefe n’ aka ụmụaka.


15.2 Ụdịrị Agụmagụ Ọdinaala.
Enwere ngbalaba atọ ndi a:
i. Akụkọ (story)
ii. Abụ (poem)
iii. ejije (play)
AKỤKỌ N’ AGỤMAGỤ ỌDḷNAALA.
E nwere akụkọ n’ụdị iche iche.
i. Akụkọ ifo.
ii Akụkọ okike.
iiiAkụkọnegwu.
iv. Akụkọ ndiichị.
A. Akụkọ Ifo: Nke abụ akụkọ nke emeghị eme mana a na amụta ọtụtụ ihe n’ime ya. Akụkọ ifo bụ akụkọ ndị ahụ mere n’ ala mmadụ n’ ala mmụọ, n’ala ụmụ anụmanụ. Ọ bụ akụkọ gbasara ihe metụtara ihe chukwu kere eke.
Usoro akụkọ ifo si ebido.
Chakpii ………………………………………………Wọọ
Nkita ṅyara akpa ……………………………….. Nsi agwu na ọha
Enwere akụkọ m ga- akọrọ ụnu ………….kọọrọ anyi ka obi dị anyi mma.
Ọmụmaatụ Akụkọ ifo
N’ akụkọ gbasara ọmalinze amaghị aha Eze bi n’otu obodo nke enweghị nwa nwoke. Mana Eze a dupurụ ndị mmadụ Arọchuwku. N’ Arọchukwu ka chukwu gwara ha ihe. Eze ga- eme tupu ya amụta nwa nwoke. Eze mere ihe a gwara ya. Maọbụ site n’ aka nwunye ya ọ kpọrọ asi ka e sịrị nweta nwa nwoke. Nke a mere ka eze kpọghachi nwaanyị ya ahụ, wu oro ya ezigbo ụlọ. Ọ bidokwara hụwa nwaanyị a n’ anya nke ukwu.
B. ABỤ: Nke a bụ otu n’ ime agụmagụ ọdịnaala enwere. Ọ bụ n’ ụdị okwu ọnụ ka ana-ekwu ya. Ọ na-adị n’ ọgbara na ọgbara.
Enwere ụdi abụ dị iche iche.
1. Abụ nwa: Imaatụ
Onye mere nwa n’ ebe awa
Egbe merenwa n’ ebe akwa
Weta uziza, weta ose
Weta amala gere nge ofe
Ka ụmu nnụnụ Lachaa ya
Egbe oo, Egbe oo.
ii. Abụ Agha: Imaatụ
Nzogbu ……………………. Enyi mba enyi
Nzogbu ……………………. Enyi mba enyi
Zogbuo tigbuo …………. Enyi mba enyi
Zogbuo nwoke …………. Enyi mba enyi
Zogbuo nwaanyi ………. Enyi mba enyi
iii. Abụ ọrụ: Imaatụ
Nwa nnụnụ nwa nnụnụ nta
Tụrụzanza, Tụrụnza
Ị nọ nga ahu eme gini?
Turuzanza, Turuzanza
A na m atụrụ nne m ose
Turuzanza, Turuzanza
iv. Abụ Otito
a. Chineke nna, mma mma ekele ee
Chineke nna, mma mma ekele ee (2X)
b. Mma mma dịrị gị, chineke
mma mma dịrị gị, onye oma(2x)
Ch. EJIJE: Nke a bụ egwuregwu ndị, ahụ edeghị ede n’ ime akwụkwọ.
ii. kpu kpumkpu ogene ……………………………….. Ogene ogene ogene
kpu kpumkpu ogene ……………………………….. Ogene ogene ogene
Onye na-akpu Ogene ……………………………….. Ogene ogene ogene
Mụ na-akpu ogene ……………………………….. Ogene ogene ogene
Moo! Moo! ……………………………….. Ogene ogene
Maa! Maa! ……………………………….. Ogene ogene
15.3 URU AGỤMAGỤ ỌDINAALA BARA
1. Ọ na-eme obi ụtọ.
2. E ji ya akuzịrị ụmụaka omenaala na asụsụ ha.
3. Ọ na-eme ka a nwee ezi mmekọrịta.
4. Ọ na-enya aka imata ndu nna nna anyi ha biri.
5. Ọ na-enya ego dịka ịgụ na ịgba egwu, ịgba mgba, iti mmọnwụ, ịgba bọọlu. dgz
6. Ọ na-eme ka anyị mụta ka esi akọ akụkọ.
15.4 ỌGHỌM Dḷ N’ AGỤMAGỤ ỌDḷNAALA
1. Ọ na-eme ka mmadụ merụọ ahụ dịka mgba a na-achụ ọrọ ma ọ bụ mgbe a na-agba mgba maọbụ bọọlu.
2. Ọ na- eme ka tụọ mmadụ. Ọtụtụ agụmagụ ọdịnaala na-atụ egwu.
3. Ọ na-ebute ịgwọ ọgwụ dịka n’ iti mmanụ.
4. Ọ na-ebute ịkpọ asi dika mgbe mmadụ nụchara ka esi gbuo onye nke ya ma ọ bụ ndị obodo ya. Ịkpọ asị na-adịkwa n’ etiti ndị na-eme egwuregwu.
ISI NKE IRI NA ỊSỊỊ
ỊGỤ OGE, ỤBỌCHI, IZU
16.1 NKỌWA IHE BU ỊGỤ OGE (IGBO TIME)
Ịgụ oge bụ usoro ndị mmadụ ji agwa ibe ha mgba ha chọrọ ime ihe dika mgbe ha chọrọ ije be mmadu, mgbe ha chọrọ ije ọrụ na mgbe ha chọrọ ime ihe ndị ọzọ. dgz
16.2 ETU NDI IGBO SI AGỤ OGE MGBE GBOO
Haji ihe ndi a amata oge.
i. Aka ọrụ: Ha na-eji aka ọrụ ndị ụfọdụ dịka ndị ọkụ azụ, ndị na-ete nkwu were ekwu oge.
ii. Ahịa: Ụfọdụ na-asi, “Bia ma uje ahịa gbabie maobu ahịa lawa”.
iii. Oke ọkụkọ: Ụfọdụ na-asi, “Bia ma oke akụkọ kwaa akwa mbu” ụfọdụ asị “Bia ma ọkụkọ Labasia ụra”.
iv. Anyanwụ: Ụfọdụ na-asi “Bia ma anyanwụ gbajuo igwe maọ bụọ ma onyinyo nọrọ n’ ọbọ ụkwụ.
16.3 ỊGỤ OGE ELEKERE
Ụfọdụ okwu ndị metụtara ọgụgụ oge ndị igbo bụ ndị a:
|
Okwu gbasi ara ya |
Related words |
|
Oge |
Time |
|
Awa |
Hour |
|
Elekere |
O’clock |
|
Nkeji |
Minute |
|
Izu |
Four days |
|
Izu asaa |
One month |
|
Afọ |
Year |
|
Ntabinaya |
Second |
|
Ụtụtụ |
Morning |
|
Ehihie |
Afternoon |
|
Ọfọduru |
To |
|
Ojirila |
After |
|
Mgbede |
Evening |
|
Ụbọchi |
Day |
|
Izuụka |
A week |
|
Ọnwa |
Month |
|
Ọkara |
Half |
|
Taa |
Today |
|
Ugbua |
Now |
|
Ụnyaahụ |
Yesterday |
|
Echi |
Tomorrow |
|
Abali |
Night |
16.4 ỊGỤ OGE ỤBỌCHỊ
A. Ndị igbo nwere ahia anọ ha na-azụ n’ ala igbo. Ahịa ndị a bụ:
i. Nkwọ
ii. Eke
iii. Ọrie
iv. Afọ
Ha jikwa ahịa ndị a agụ oge. Mmadụ nwere ike si gi, “Bia be m ụbọchị Nkwo na-abịa, eke gaa Eke, taa bu atọ maọbụ echi”.
B. ḷgụ oge izu asaa
Izu asaa dị mkpa na ndu igbo niile. Ya bụ:
Sonde
Monde
Tuuzdee
Wenezdee
Tọọzdee
Fridee
Satọdee
Ch. Ọnwa ole di n’ afọ. Ha bụ ndị a:
Janụari
Febrụari
Maachị
Aprel
Mee
Junu
Julani
Ọgọọstu
Septemba
Ọktoba
Nọvemba
Disemba
ISI NKE IRI NA ASAA
EKELE NDḷ IGBO
17.1 NKỌWA EKELE NDI IGBO
Ndị igbo were ekele dịka nnukwu ihe. N’ etiti ndị igbo, a na-ewe onye anaghị ekele ekele dịka ajọ mmadụ. Ọ bụkwa nkwenye ndị igbo na mmadụ ga-ebu ụzọ kelee onye tọrọ ya.
17.2 ỤDỊ EKELE DỊ ICHE ICHE
Ụfọdụ ekele dị iche iche bụ ndị a:
Ekele Utụtụ ---------Ịbọọlachi
---------Ịsaalachi
---------Ụtụtụ ọma
Ekele Ehihie -------- Ehihie ọma
---------Ndewo
Ekele Abali -------- Abali ọma
---------Mgbade ọma
Ekele ma achọọ ilaba ura -------- Kachifo
---------Kachibọọ
Ekele mmadụ nye gi ihe -------- Daalu
-------- Ndewọ
Ekele Onye na-eme njem -------- gaa nke ọma
-------- Ijee ọma
-------- Ịga wala
Ekele onye nlot njem --------Nnọọ
--------Ịbatago
--------Ịbiala
Ekele onye na-aga ahịa --------Ahịaọma
Ekele onye ihe mere --------Ndo
--------Jisie ike
--------Nwee ndidi
Ekele onye na-arụ ọrụ --------Daalụ ọrụ dgz
ISI NKE IRI NA ASATỌ
NRI NDḷ IGBO NA AHḷA NDḷ IGBO
18.1 AHA NRI NDḷ IGBO Dḷ ICHE ICHE BỤ NDỊ A:
1. Ọka (Maize)
2. Ojoko (Plantain)
3. Ede (Cocoa yam)
4. Osikapa (Rice)
5. Agwa (Beans)
6. Ji (Yam)
7. Abacha (African salad)
8. Akidi (Native beans)
9. Ji nnu (Sweet potato)
10. Akpụ (Cassava)
11. Ụkwa (Bread fruit)
12. Anyụ (Pumpkin)
18.2 AHA OFE NDḷ IGBO BỤ NDḷ A:
1. Ofe egwusi (Melon soup)
2. Ofe ọgbọnọ (Ogbono soup)
3. Ofe akwụkwọ nri (vegetable soup)
4. Ofe nsara (Watery soup)
5. Ofe ede (Cocoayam soup)
6. Ofe ọkwụrụ (Okro soup)
7. Ofe banga (Banga soup)
8. Ofe Ọkazi (Okazi soup)
9. Ofe ụtazi (Utazi soup)
10. Ofe ọha (Oha soup)
18.3 IHE NDḷ EJI ESI OFE BỤ NDḷ A:
Akwụkwọ nri (vegetables)
Mmanụ nri (Palm oil)
Mmanụ ọkpapa (Vegetable oil)
Egwusi (Melon)
Ose (Pepper)
Nnu (Salt)
Azụ (Fish)
Anụ (Meat)
Yabasi (Onion)
Ede (Cocoayam)
Ero (Mushroom)
Mmiri (Water)
Azụ isha (Crayfish)
18.4 IHE NDḷ A NA-AZỤTA N’ AHḷA
Ọpapa (Groundnut)
Mmanụ ọpapa (Groundnut Oil)
Ute (Mat)
Eri (Thread)
Okpu (Cap)
Ude (Pomade)
Ncha (Soap)
Akwa (Cloth)
Ube (Pear)
Oroma (Orange)
Azụ-Ọkpọọ (Dried fish)
Ọka (Maize/Corn)
Mmanu (Oil)
Okporoko (Stock fish)
Bọọlu (Ball)
Efere (Plate)
Ọgụ (Hoe)
Agwa (Beans) wdzg
ISI NKE IRI NA ITOOLU
19.1 NKỌWA OKWU ỤFỌDỤ GBARA ỌKPỤRỤKPỤ
Enwere ọtụtụ okwu gbara okpụrụkpụ n’ asụsụ igbo: ụfọdụ n’ ime ha bụ ndi a:
|
IGBO |
BEKEE |
|
Asambodo |
Certificate |
|
Mkposi |
Toilet |
|
Nzere |
Degree |
|
Ụlọ nga |
Prison |
|
Dịmgba |
Convulsion |
|
Ụkwara |
Cough |
|
Ụkwara nta |
Tuberculosis |
|
Ahụ ọcha |
Leprosy |
|
Amahia |
Tooth ache |
|
Mfu obi |
Confidence |
|
Ekwu mmụọ |
Shrine |
|
Akancha |
Bar of soap |
|
Biko |
Excuse |
|
Enyi mmiri |
Hippopotamus |
|
Inyinya igwe |
Bicycle |
|
Pọmpụ |
Tap |
|
Nchu nta |
Campaign |
|
Nzụkọ nnọchite anya |
House of Representatives |
|
Atụmatụ iwe ego |
Appropriation Bill |
|
Ego mmawapụta |
Budget |
|
Okwupụta |
Speaker |
|
Sineeti |
Senate |
|
Agụiyi |
Crocodile |
|
Torotoro |
Turkey |
|
Obi |
Heart |
|
Omenaala |
Custom |
|
Omenaala |
Tradition |
|
Ewumewu |
Institution |
|
Erimekpe |
Inheritance |
|
Sekọndịrị |
Secondary |
|
Mahadum |
University |
|
Koleeji |
College |
|
Izu |
Area |
|
Ịsọ mpi |
Competition |
|
Ọgbọrọgbọdọ |
Public society |
|
Inyinya |
Horse |
|
Nkọwa ekwu |
Dictionary |
|
Njemnlete |
Excursion |
|
Ọchịchị onyekwuoucheya |
Democrarcy |
|
Ọdụm |
Lion |
|
Agụ |
Leopard |
|
Ichoku |
Parrot |
|
Ụlọ ego |
Bank |
|
Ekwenti |
Telephone |
ISI NKE IRI ABỤỌ
EDEMEDE NDUZI EZINAỤLỌ
20.1 NKỌWA EZINAỤLỌ (FAMILY)
Ezinaụlọ bụ ebe obibi mmadụ. Ndị n’ ebi n’ ezinaụlọ bụ Nne, Nna Ụmụaka na ndị ezi ha . N’ omenaala ndi Bekee, Ezinaụlọ bụ nanị nwoke na nwunye ya na ụmụaka ha. Ma na nke ndị igbo, ọdịghị otu a. Ezinaụlọ ndi igbo bụ dị na nwunye maọbụ ịnyọm, ụmụaka ha, ndị ọgọ ha, ụmụnna na ikwu na ibe.
20.2 ỤDỊ EZINAỤLỌ ENWERE
Enwere udị Ezinaụlọ atọ, Ha bụ ndị a:
i. Ezinaụlọ otu mkpuke (Nuclear family)
ii. Ezinaụlọ ụbara mkpuke (Extended family)
iii. Ezinaụlọ mbasa (Polygmous family)
i. EZINAỤLỌ OTU MKPUKE: Ụdị ezinaụlọ a na-enwe otu ekwu ọkụ n’ ihi na ọ bụ otu nwanyị ka a na-alụ ebe dị otu a. ọ bụ ebe enwere naanị, nne, nna na ụmụaka, nakwa ndi binyere ha dika ọhụ maọ bụ odibo.
20.3 ỌRỤ EZINAỤLỌ NA NDU NDḷ IGBO
A. ỌRỤ NNA N’ EZINAỤLỌ
i. Nna bu ya bụ onyeisi n’ ezinaụlọ.
ii. Nna ga na-ahụ na ndi be ya na-eriji afọ.
iii. Nna ga-akụziri ụmụ ya ndị ha na ha bụ nwanne.
iv. Nna ga-akpọ ụmụ ya ndị nwoke eje nzụkọ ụmụ nna, nzụkọ ogbe
na nzụkọ obodo.
v. Nna ga-ahụ ya kwụọrọ ụmụ ya ụgwọ akwụkwọ gooro ha akwa ma zụọ ha n’ ọrụ ezinaụlọ.
B. ỌRỤ NNE N’ EZINAỤLỌ
i. Nne ga-elezi ụmụ ya anya nke ọma.
ii. Ọ bu ọrụ dịịrị nne isi nri nye ụmụ aka ya.
iii. Nna ga-asa ụmụ aka ahụ ma hụ na ha na-adị ọcha.
iv. Nne ga-azụlite ụmụ ya ndị nwanyi n’ obi ezi naụlọ.
v. Ọ ga-akụziri ụmụ ya etu esi ekele ekele.
CH. ỌRỤ ỤMỤAKA N’ EZINAỤLỌ
i. Ụmụaka ga na-enye nne na nna ha nsọpụrụ ya na ndị toro ha.
ii. Ụmụaka ga-asụ akwa.
iii. Ụmụaka gana-ekwu eziokwu.
iv. Izacha ezi na isacha efere bụ ọrụ dịịrị ụmụaka n’ ezinaụlọ.
v. Ụmụaka ga- enyere nne na nna ha aka n’ ọrụ ugbo.
vi. Ụmụaka na- akpata nku., ichute mmiri na ịdị ọcha nke onwe ya.
ISI NKE IRI ABỤỌ NA OTU
AKWỤKWỌ AGỤMAGỤ A HỌPỤTARA (ABỤ)
21.1 NNYOCHA AKWỤKWỌ ABỤ
Abụ adịghị ka akụkọ. Abụ anaghi ekwupụtacha okwu bowam. A gụchaa abụ, enwe ike hụ ihe o na – ekwu. Lee usoro a ga na-agbaso:
i. Aha abụ na ụdị abụ ahụ.
ii. Aha odee na isiokwu ọ na-ede.
iii. Usoro nhazi abụ ahụ.
iv.Asụsụ nka ewebatara.
v. Ndaba maọ bụ adabaghi.
vi. Nchịkọta ih abụ na-ekwu maka ya.
ka anyi were otu abụ n’ akwụkwọ a họpụtara wee nye
Ọmụmaatụ.
Echiche bụ akwụkwọ a họpụtara n’ abụ. Nke anyi chọrọ itule bụ Echiche dị n’ ihu akwụkwọ 26 n’ akwụkwọ nke ochie ma ọ bụ ihu akwụkwọ 33 na mbipụta echiche nke ọhụrụ.
ECHICHE
Obi na-akụ m kpụm kpụm.
Nanị ngiringa nkata ka m bụ ugbu a.
Ọchị m dika nwaanyị eze mfo.
Ọchị anaghị achị n’ oge ụgụrụ.
N’ otu ntabi anya ka m jere ebe dum.
Anọ m n’ aba, anọ m n’ ọnịcha.
Ọ bụ mmanya ga-agwọ m ọrịa?
Mana nnụnụ fepụrụ n’ ala bere n’ okpoki kwube.
Bụ ebe ọ nọ ka ọ ka nọkwa.
Ọ bụghị iberibe ka mmadụ dị?
Nchekasi! Ndokasi! Atu ndu! Ezuike!
Bu ihe mmadụ wetara onwe ya.
Echiche chi chere ka mma.
i. Abụ a họpụtara: ECHICHE
ii. Aha abụ: Echiche n’ ihu 26 ma ọ bụ n’ ihu 33 na nke e bipụtara ọhụrụ.
iii. Odee: R.O Eziubo na J.I Anọwai. otu n’ ime ha dere abụ a.
iv. Ụdị abụ: Echiche bụ abụ Nkọcha ma ọ bụ abụ ikpe.
v. Isiokwu: Ndị ode ji abụ a akọcha ndị mmadụ na-echegbu onwe ha n’ echiche.
vi. Usoro nhazi abụ: Ndị ode haziri abụ a na nkebi anọ. A haziri abụ a na nkeji na nkeji.
Nkebi nke mbu: -------Ahiriokwu anọ
Nkeji nke abụọ: --------Ahiriokwu ise
Nkeji nke atọ: ----------Ahiriokwu ise
vii. Asụsụ Nka: Asụsụ nka ndị a batara n’ abụ a:
a. Nghọtasinaụda dịka: kpụm, kpụm, kpụm
b. Myiri dịka “Ọchị m dịka nwaanyi eze mfọ”
ch. Ajusaghi dịka “ọ bụ mmanya ga-agwo m ọria?” “ọ bụghị iberiibe ka mmadụ dị?”
d. Akpalaokwu dịka “atụ ndụ!” “ezu ike!”
e. Ilu dịka “Nnụnụ fepụrụ n’ ala bere n’ okpọkikwube”. “Bu ebe ọ nọ ka ọ kaọka nọkwa.”
viii. Ndaba ma ọ bụ adabaghị: Abụ a dabara adaba.
ix. NCHỊKỌTA: Ndị mmadụ ka e jiri a bụ a gwa ka ha were nwayọọ na-adogbu onwe ha n’ echiche. Echiche nke chi cheere mmadụ ka mma.
1. Ga eriju afọ.
2. Amaghị njọ ahịa, azụrụ azụghị ha na enweta Ọru.
3. Na enweta nnukwu ego.
4. Na-enwe ezigbo aha. Dgz.
ISI NKE IRI ABỤỌ NA ATỌ
AKỤKỤ AHỤ MMADỤ DỊ ICHE ICHE
23.1 NKỌWA AKỤKỤ AHỤ MMADỤ (Part of the body)
Akụkụ ahụ mmadụ bụ akụkụ dị iche iche nke mebere mmadụ dịka ọnụ, anya, aka, ụkwụ na akụkụ ndi ọzọ dị iche iche. Akụkụ ahụ mmadụ enwere ọrụ ọ na-arụ na ahụ mmadụ.
23.2 ỤDỊ AKỤKỤ AHỤ MMADỤ DỊ ICHE ICHE
|
IGBO |
BEKEE |
|
Isi |
Head |
|
Anya |
Eye |
|
Imi |
Nose |
|
Nti |
Ear |
|
Ire |
Tongue |
|
Ọnụ |
Mouth |
|
Eze |
Teeth |
|
Igbiri |
Gum |
|
Aka |
Hand |
|
Mkpisiaka |
Finger |
|
Mbọaka |
Finger nail |
|
Obiaka/Imeaka |
Palm |
|
Ụkwụ |
Leg |
|
Ukwu |
Waist |
|
Ara |
Breast |
|
Afọ |
Stomach |
|
Ike |
Buttock |
|
Egbugbere ọnụ |
Lip |
|
Ikpere |
Knee |
|
Ubu/Ukuubu |
Shoulder |
|
Obi |
Chest |
|
Aji ahụ |
Body hair |
|
Ntụtụ |
Hair |
|
Agba |
Jaw |
|
Olu |
Neck |
|
Azụ |
Back |
|
Mbọukwu |
Toe-nail |
|
Ikpere aka |
Elbow |
|
Abụ |
Ampit |
23.3 ỌRỤ AKỤKỤ AHỤ NDḷ A BỤ:
Aka ---- Eji m aka ede ihe.
Ọnụ ------ Eji m ọnụ ekwu okwu/ire ihe.
Imi ------ Eji m imi m eku ume.
Ikpere ---- Eji m ikpere m esekpu ala ikpe ekpere.
Eze ----- Eji m eze m ata nri m na anụ.
Anya ----- Eji m anya ahụ ụzọ.
Ụkwụ ----- Eji m ụkwụ aga ije.
Afọ ----- Afọ bụ ebe nri anyi riri n’ anọ.
Ara ----- Eji mara azụ nwa.
Nti ------- Eji n nti anụ ihe.
ISI NKE IRI ABỤỌ NA ANỌ
NZIZA OZI
24.1 NKỌWA NZIZA OZI
Nziza ozi bụ ụzọ dị iche iche ndị, mmadụ si amata ihe na-eme n’ obodo, n’ ogbo na ụwa niile dị iche iche.
24.2 ỤDḷ NZIZA OZI ENWERE
i. Nziza ozi Nkeọdịnaala.
ii. Nzizza ozi Nke ugbua.
A. Nziza ozi Nke Odinaala: Nke a pụtarakari ihe n’ oge mgboo gboo. Ọ bụkari eze obodo n’ ezipu “Ọma ekwe” Ka ọ gaa gwa ndị obodo ihe na-eme na obodo ya.
Ụzọ dị iche iche esi eziza ozi mgbe ochie bụ ndị a:
i. Okwu Ọnụ: Na mgbe ochie, a na-edunye mmadụ ozi gwa ya ihe ọ ga-ezi onye a chọrọ ka o zie ozi
ii. Ikụ Ekwe/Ogele: Obodo ọ bụla n’ oge gboo nwere ọkụ ekwe ma ọ bụ ọkụ ogele. Ọ ga-ezi ozi a mgbe ọ maara na mmadụ niile nọ n’ ụlọ.
iii. Ikoro: Ejika ikoro ezi mgbe gboo.
iv. Ekwe Eze: Nke a bụkwa ekwe dị nnukwu mkpa n’ obodo. Ọ bụ ya ka eji agwa ọha na eze na okenye di mkpa n’ obodo anwụọla.
v. Egbe: Ejikwa egbe ezi ozi mgbe ochie. O nwere egbe a ga-agba, ọ bụrụ ikpo nzụkọ
vi. Ọja: Mgbe a na-agba mgba odinaala, ọ bụ ọja ka eji akpọ ọmụ okorobịa ọkụ. Onye ọja fụọ ya, ọ bụ ịgwa ụmụ okorobịa oge eji eje mgbe eruola. O nwekwara udiopi ike eji ezi ndi ọchị agha ozi.
B. Nziza ozi nke ugbua: Ọ bụ ụzọ ndi bekee si ezi ozi ọ na-abụkari ndi gara akwụkwọ na-eziza ozi nke ugbua.
Uzo ọgbara ọhụrụ esi ezisa osi ugbua:
i. Ide leta: Ọ bụ ụzọ mmadụ si ezi ozi n’ ụzọ leta. Ọha obodo chọọ
ịkpọ nzụkọ ha edee sakụla
ii. Redio: Ọ bụ redio ka gọọmenti si ezisara ọha na eze ozi. Ejikwa redio eweputa egwu ma ọ bụ ihe ọhụrụ a chọrọ iweputara ka ọha na eze nụ ya.
iii. Ekwe nti: Ọ bụ n’afọ 1999 ka president Obasanjo webataara anyi ekwe nti ọtụtụ ndi mmadụ na- akpa ekwe nti ha n’aka na – ezi ndi mmadu ozi mgbe ọbụla ha chọrọ.
iv. Tiivii: Ọ bụ ọrụ redio na- arụ ka tiivii na- arụkwa. A ga na –ahụkwa onye ahụanya na tiivii
v. Kọmputa: E ji kọmputa ezi ozi na ebi akwụkwọ. Ọ dịghị ọrụ e jighi Kọmpụta arụ. Ọ bụ site na kọmpụta ka anyi si emeta nke anyi na- akpọ.
a. E-meel (E. mail)
b. websaiti (website www.)
vi. Akwụkwọ Akụkọ: Nke a bụ akwụkwọ a na ebipụta kwa ụbọchi. Ọ na-ebu ọtụtụ akụkọ dị iche iche n’ebe niile nakwa ihe ọ bụla na- eme n’ụwa.
24.3 URU IZIZA OZI BARA.
1. Ọ na – eme ka ndị mata ihe n’a- eme n’obodo.
2. A na- esite na ya amata ụlọ ọrụ chọrọ ndị ọrụ dị iche iche.
3. Ọ na- agba mpu dị n’obodo n’anwụ.
4. Ọ na- abawanye amamiihe.
5. A na esi na ya eme ka ndị mmadụ mata ngwa ahịa dị n’ahịa.
ISI NKE IRI ABỤỌ NA ISE.
EGWU NDḷ IGBO.
25.1 NKỌWA: Egwu ndị igbo
Egwu bụ ụzọ mmadụ si egosipụta ebunuche ya. Ọ bụ ndị mmadụ na-echepụta egwu guo ya agụọ. Ọ na- abụkari onyinyechi, ọtụtụ ndi tiri egwu bụ ọ natara chi.
25.2 ENWERE ỤDỊ EGWU DỊ ICHE ICHE. HA BỤ NDḷ:
1. N’Anambra, eji egwu MKPỌKITI mara umunze.
2. N’Abia Steeti, eji egwu IKPIRIKPE mara Ọhafia.
3. N’Anioma, eji gwu AMALA ma ọ bụ ỌSỌDE mara ha.
4. N’Ebonyi, eji egwu NWANWIITE akpọtụ Afikpo.
5. N’Abia, e ji egwu OJOOJO akpọtu Arochukwu.
6. Egwu Atụrị Ọgwụ.
7. Egwu Ogene.
8. Egwu Egedege.
9. Egwu ụka.
10. Egwu ekpiri.
25.3 NGWA EGWU ỤFỌDỤ
i. Arọ.
ii. Ogene.
iii Ekwe.
Iv. Udu.
v. Ọja.
vi.Iyọrọ
vii. ḷchaka.
25.4 URU EGWU BARA
i. Ọ na – enye Obi anụri.
ii. Ọ na- enye ego.
iii. Eji ya akụziri ụmụaka ihe dị mkpa oge ụfọdụ.
iv. Eji ya akwalite Omenaala.
v. O na- eme ka ndị mmadụ wee mmekọrịta mmadụ na ibe ya.
ISI NKE IRI ABỤỌ NA ỊSỊỊ
EGWUREGWU ỤMỤAKA
26.1 NKỌWA: EGWUREGWU
Egwuregwu bụ mmegharị ahụ nke na- eme ka nzimozi zuru oke pụta. Egwuregwu bụ otu ụzọ n’ime ngalaba agụmagụ ọdinaala, nke jupụtara na mmeghariahụ dịka ndị mbụ siri wee mee ya.
26.2 ỤDỊ EGWUREGWU DỊ ICHE ENWERE.
i. Egwuregwu maka mgba.
ii. Egwuregwu maka Agha.
iii. Egwuregwu egwu ọma.
iv. Egwuregwu nzuzo.
v. Egwuregwu ụmụaka ma ọ bụ egwu Ụmụntakiri.
vi. Ikpo Ọga.
vii. Iti mmanụ
viii. Mpipo
Ọmụmaatụ.
i. Egwu Agha:
Onye akpala nwa agụ aka n’odu ma ọ dị ndu ma o nwụrụ, onye akpala Agụ aka n’ọdụ ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ. Onye akpala Agu aka n’ ọdụ.
ii. Egwuregwu Umuaka:
Kedu onye ga- abụ ọyị m?
Kedu onye ga- abụ ọyị m?
Kedu onye ga- abụ ọyị m?
Onye ga-abu ọyị m?
Ọyị mee!
A hula m ọyị m
A hula m ọyị m
A hula m ọyị m
Onye ga –abụ ọyị m?
Ọyị mee!
iii. Egwuregwu ọnwa.
Kpu kpumkpu ogene --- Ogene Ogene
Kpu kpumkpụ ogene --- Ogene Ogene
Onye na-akpụ ogene ---- Ogene Ogene
Ewu na-akpụ ogene ---- Ogene Ogene
Maa! Maa!
26.3 URU Ọ BARA
1. Ọ na-enyi obi ụtọ.
2. Ọ na-eweta udo.
3. Ọ na-enye ezumiike.
4. Ọ na-abawanye amamiihe.
5. Eji ya akụziri ụmụaka omenaala.
ISI NKE IRI ABỤỌ NA ASAA
AKWỤKWỌ AGỤMAGỤ A HỌPỤTARA (Ejije, Aba na Iduuazi)
27.1 NKỌWA: Nnyocha akwụkwọ: Mmiri ọkụ Eji egbu mbe. (Idụụazi)
ka anyị jiri usoro a nyocha akwụkwọ a:
a. Ode akwụkwọ: Maazi Tony Ubesie. Tony bụ onye Egwu achi nke dị n’ okpuru ọchịchị ime obodo oji riva n’ Enugwu steeti.
b. Ndị mbipụta akwụkwọ: Ndị Longman Naijiria Ltd.
Ch. Afo mbipụta akwụkwọ: 1974
d. Nchịkọta Akụkọ:
i. Nwunye maazị okafọ na Nwunye maazị ụzọdịmma na-ese okwu.
ii. Esemokwu a wee fere di ha
iii. Maazi okafọ wee were nsi gbuchapụ ụmụaka ụzọdimma.
iv. Maazi ụzọdimma wee jiri iwe ọkụ mmiri mma gbuo maazi okafọ.
v. E wee jide ya, kpee ya ikpe, ma ya ikpe ọnwụ wee kwugbuo ya.
vi. O teghị aka ọrịakụ ụzọdịmma wee nwụọ.
vii. Ha wee hapụ otu mkpụrụ nwa nwoke ha mụtara, aha ya bụ
Enyi nwa mgbei.
viii. Enyi wee baa n’ ibi ndu ọjọọ. O sooro ndị ajọ otu baa n’ izu ohi
ix. Ohi nke ya bụ sam.
x. Ndị uwe ojii emee nta imo ka aka kpara ya, mana o weghi isi.
xi. N’ ikpe azụ, O bere nwata ọ na-enye ọzụzụ n’ izu ohi agbaa ama ihe aka jiri kpara Enyi.
xii. E wee tụọ ya mkporo
xiii. Aha nwa ahụ gbara ama bụ chukwudị.
xv. Ka Enyi si na nga lọta, o cheghariri bịa biwe ezi ndu.
E. Isiokwu dị n’ akụkọ: Akụkọ dị n’ akwụkwọ a bụ akụkọ mgba anya mmiri isiokwu dị na ya nwere ike buru:
i. “Mmadụ ime ihe ọjọọ adighi mma” Maọbụ.
ii. “Mmadụ ibo obo n’ onwe ya adịghị mma”
USORO NNYOCHA NDḷ ỌZỌ
1. Nhazi akụkọ
Onye na-enyocha akwụkwọ nwere ike hazie akụkọ etu masịrị ya. N’ebe a, anyị nwere ike hazie ya n’ụzọ anọ ndị a:
a. Bido n’ogbogbu maazi ụzọdịmma gburu maazị okafọ ruo n’ oge enyi si n’ụlọ nwanne nna ya bụ ebuzo gbapu (Bido n’ihu I ruo 19).
b. Mgbe enyi bidoro mụwa ọrụ n’aka ndị ohi ruo mgbe o lara be ha bụ Ndiabia. (ihu 20 ruo 49).
Ch. Mgbe enyi laghachiri Enugwu ruo mgbe e jidere ya tụọ ya nga (ihu 50 rue 65)
d. Ndu enyi n’ ikpeazụ (ihu 66 ruo 67)
2. Agwa dị n’ akụkọ : Ọ bụ enyi bu isi dokpụ nti n’akụkọ di n’akwụkwọ a. were isiokwu ndị a nyocha agwa ya site n’ichọta etu o siri mee omume.
i. Chọpụta ebe ọ kpara agwa dịka onye nwere akọ na uche.
ii. Chota ebe o zugasiri ohi di iche iche.
iii. Ole ebe enyi kpara agwa dikwa onye nwere anya ukwu?
iv. O nwere ebe ọ kpara agwa dika onye nwere obi ebe.
v. Ole ebe o gosi gasiri na ya bụ nwoke gbasiri ike mmadụ?
3. Akanka
Akanka na- egosi etu ode siri were asụsụ dee akwụkwọ ya. Ọ bụrụ na odere ya n’asụsụ igbo dika nke a anyi na enyocha, o jikwa ụdị asụsụ ahụ nke na egosi na asụsụ igbo doro ya anya? O webata chakwara ihe dika ilu, ukabuilu, ndika, mburu na mmemmadụ n’ebe ha kwesiri idi? O jikwa igbo izugbe wee dee ya. dgz.
27.2 NNYOCHA ABỤ “ỌKỌCHỊ”
1. Aha Abụ: Aha ya bụ ‘ọkọchị’
2. Aha ode: Ọ ka bụkwa mmadụ abụọ a, Ezeuko R.O na Anowai J.I
3. Nkeji Ole? Ọ dị nkeji atọ.
4. Ahịrịokwu ole dị n’otu nkeji?
i. Nkeji nke mbu nwere ahịrịokwu ise
ii. Nkeji nke mbu nwere ahịrịokwu ise
iii. Nkeji nke mbu nwere ahịrịokwu ịsịị.
ABU…… IHU 25 nke akwụkwọ abụ lee ya: ỌKỌCHỊ
Nwa gị bụ ọsisọọ.
Anyụọla mmadụ anya.
Onye baa n’ụlọ okwu.
Onye pụta n’ụlọ Okwu.
Ọkọchi
I bụ nshansha mmiri
Na-agba ahụ gharaghara
I butere agụụ mmiri
Mee ndị ọrụ ugbo ino nkiti
Ọkọchị
! na- emekwa ezigbo ihe
Ụmụ nnụnụ na- enwere gi ānụrị.
I mereala asọghị oyi
Na –eme mkpụrụ ihe ka ha kaa.
Gị mere na mmadụ na- apụ ọrịrịrị uchichi.
5. Usoro Nhazi: Odee haziri abụ ya na nkeji atọ. Nkeji nke mbu dị ahịrịokwu ise. Nke abụọ dị ahịrịokwu isii. Nke atọ dị ahịrịokwu ịsịị.
6. Asụsụ Nka:
i. Mmemmadụ: Lee ahịrịokwu mbu: Nwa gị bụ ọsisọọ.
Anyụọla mmadụ anya.
ii. Mburu: Lee ahịrịokwu a:
Ị bụ nshansha mmiri.
Na- agba ahụ gharaghara.
27.3 NNYOCHA EJIJE
“NKA Dḷ NA NTI”
1. Aha akwụkwọ “NKA Dḷ NA NTI”
2. Ụdị agụmgụ ọ ụ Ejije a rọrọ arọ
3. Aha onye dere akwụkwọ Maazị Okoro, B.C.
4. Afọ Mbịpụta 1982
5. Ndị Mbịpụta Evans Publishers Nig Ltd.
6. Ebe Mbịpụta Ibadan
7. Ebe Ihe mere Eji ntọala ala ngwa nke dị n’Abia steeti na obodo ndị gbara ya okirikiri wee dee akwụkwọ a.
8. Isiokwu dị n’akwụkwọ nka dị na nti nke a pụtara na onye gee nti n’ezigbo ndụmọdụ e nyere ya na ọ ga –anote ndu aka, na ọ ga- aka nka. Onye egechi kwanu nti n’ ezigbo ndụmọdụ; ọ ga- anwụ n’oge erughị eru.
9. Nchịkọta akụkọ: Maazi Okoro B.C. na ezipụta n’akwụkwọ ejije a etu o nwa okorọbia aha ya bụ Njoku siri ghara ige nti na ndụmọdụ nne ya na nna ya na ndị enyi ya na-enye ya. Ọ kpochiri nti ya. Ajọ ndu niile o biri karịchaa n’ịchụ nwaanyi, ma ndị nkiti ma ndị nọ na dị mere ka o nwụọ ọnwụ okorobia ọnwụ ya site kwara n’aka nwaanyị.
27.4 USORO NHAZI
A. Anyi nwere ike hazie ejije a ụzọ atọ:
i. Nke mbụ: mmalite ịdị na mma Njọkụ na otu Nwaanyị a na-akpọ. Ezinwaanyị. Njọkụ hụrụ ya n’ anya nke ukwuu mana ọ hụghị Njọkụ n’ anya. Naanị ego ya ka ọ hụrụ n’ anya. Njọkụ chefụọ ndụmọdụ ndị enyi ya isepụ onwe ya n’ ebe Ezinwaanyị nọ.
ii. Nke Abụọ: site na mgbe ọdachi kwudoro. Njoku. O wee daa n’ azumahia ọ na azu. Ezinwaanyị wee gbafuo n’ ebe ọ nọ.
iii. Nke Atọ: Site na mbilite n’ ahịa Njọkụ o wee laghachikwa n’ ọnọdụ ya nwee ego ọzọ, zụọ ụgbọ ala buru ya lọta n’ obodo ya bụ umuanụmbe. Ọ gwara nne ya na nna ya na ya ga-eje Aba jee hụ Ezinwaanyị. Ha dọrọ ya aka na nti ka ọ gharakwa ịga be nwaanyị a lụrụla dị. Ọ kachiri nti chọrọ Ezinwaanyi gaa n’ ụlọ dị ya. Ebe ahụ ka ọ nọrọ zute ọnwụ ya.
B. Agwa Ndị pụtara ihe N’ Ejije a: ka anyị nyochaa agwa ndị a:
iv. Njọkụ ọ bụ nwoke a bụ isi dokpu nti n’ ejije a. Ọ bụ ya bụ OKEDIKE n’ ejije a. Anyị chọpụtara akparamagwa ndị a n’ ebe ọ nọ
a. Ọ bụ onye na-agha mbo n’ ịchụta ego
b. Njọkụ dịka onye oriri.
ch. Njọkụ dịka onye na-abụ o daa, o bilikwa ọzọ.
d. Nkọkụ dịka onye mkpochi nti.
e. Njọkụ dịka ọchụ nwaanyi.
27.5 AGWA ṆDỊ ỌZỌ PỤTARA IHE
A. Oji na nwunye ya bu ikodie: Anyi ga-atule mmadụ abụọ ndị a. Ha bụ ndị ụmụanumbe ọ bụ ha mụrụ Njọkụ. Ha kpara agwa ọma ndị a.
i. Ha na-ebi ndu ezigbo ezinaụlọ: Ha’ na-ejiko aka ọnụ enye ụmụ ha ndụmọdụ ga-abara ha uru. Ha adịghị ka ezinaụlọ ụfọdụ ebe nne maọbu nna na-adonyere nwa ya na-akpa ajọ agwa ukwu. Ha jịkọrọ aka ọnụ kagbuo ọchịchọ Njọku ịlụ nwaanyị mba mmiri. Ha jikọkwara aka ọnụ gbaa mbọ ịgbọchi Njọkụ ịchọrọ Ezinwaanyi gawa n’ ụlọ dị ya n’ aba. Ndụmọdụ ha kụrụ afọ n’ ala.
ii. Dịka ndị ha na mmadụ ibe ha na-enwe ezi mmekọrịta: mgbe mmadụ nwunahụrụ maazị Azụbụike, maazị ọjị na nwunye ya gbara ya mgbaru. ọjị nyere ya okwu nkasi obi
iii. Dịka dị na nwunye na-ebi n’ udo: ọ dịghị ebe anyi hụrụ ka ọjị na nwunye ya na-ese okwu. Ha abụọ jịkọrọ aka ọnụ n’ inye nwa ha nwoke Njoku ndumodu ka o sepụ aka n’ agwa ọjọọ
B EZINWAANYḷ: Anyi chọpụtara ihe ndị a n’ ebe ezinwaanyị nọ.
i. Ọ bụ nwata akwụkwọ ejighị akwụkwọ ya kpọrọ ihe.
ii. Naani mkpa ya bụ isogharị ụmụnwoke, na-aghọ gbu ha na-anakọrọ ha ego.
iii. Ọ dịghị mgbe ọ hụrụ Njọkụ n’ anya. Naanị ego Njọkụ ka ọ hụrụ n’ anya.
iv. Mgbe Njọkụ dara n’ ahịa ya, Ezinwaanyị gbafuo ga lụọ dị ọzọ.
v. Ọ bụ agwa ọjọọ ọnọnadịachọdị ya ranyere Njọkụ n’ ọnwụ ya.
vi. Ọ dịghị ezigbo agwe anyi chọpụtara n’ Ezinwaanyi.
vii. Aha obodo nyere nwaanyi a adabaghị adaba. Aha ya aka abụ ajọ nwaanyi.
CH. Eze, Agu, Chima na Adikwu: mmadụ anọ ndị a bụ enyi Njọkụ. Anyi chọpụtara omume ndị a n’ aka ha:
i. Ndi a na-enya enyi ha ezigbo ndụmọdụ. Ha na-enye Njọkụ ndụmọdụ bara uru gbasara mmekọrịta ya na umu nwaanyi. Njọkụ egeghị ha ntị.
ii. Dịka ndi oriri: Ha bụ ndị oriri. Ha na-aga ụlọ oriri na nkwari ebe ha na-anọ na-eri na-anu ka a na-anwụ anwụ
iii. Dịka ndi na-emu enyi ha emu azụ: Anyi chọpụtara na mmadụ anọ ndi a nụjuo mmanya afọ ha ebido muwe enyi ha nwoke bụ Njọkụ emu azụ. Ọ bụ site na nkata ha na-akpa ka ha nụjuru nkwu afọ ka ha nọ kọwapụta na ebe Njọkụ siri baa ọgaranya bụ ihe ndị mmadụ o zuru mgbe ọkụ ghara ahịa Aba.
27.6 OMENAALA DI N’ EJIJE A
A. Maazị okoro B.C. zipụta Omenaala abụọ n’ akwụkwọ ejije a. ha bụ:
i. Ije mgbarụ.
ii. Omenaala ọjị n’ ebe mmadu Nwụrụ
B. Asusu Nka di n’ ejije a:
Anyị chọpụtara ndị a:
i. Ụkabụilu: Nke a dị abụọ Akụkọ ọjị kọrọ maka ọzọdimgba na Agadị Nwaanyi n’ ihu 14. Nke a bụ ụkabụilu. Ọ bụkwa akụkọ ntọọchi. ụkabụilu ọzọ dị n’ ihu 40. Nke ahụ akụkọ chima kọrọ n’ ụlọ oriri na nkwari.
ii. Okwu si n’ Akwụkwọ Nsọ: Lee ihu 31 ebe o dere “onye nwụrụ anwụ anaghị eto jaa. Nke a bụ Okwu si n’ Akwukwọ Nsọ ndị ụka kraist leekwa ihu 38 ebe o dere na Akwụkwọ Nsọ kwụrụ na ihe “I ji tụnyere mmadụ ka a ga-eji atụnyere gi”. Chima webatakwara okwu
ndị ụka kraịst mgbe o siri n’ ihu 59 “………. O bụ n’ ihi ndị ọjọọ ka jisọs jiri bịa n’ ụwa”
iii. Olumba: Ọ bụ eziokwu na ejiri igbo izugbe dee ejije a mana maazị okoro echezọghịkwa na ọ bụ n’ ala Ngwa ka a mụrụ ya. Ọ bụkwa ebe ya nọ too. Ọ bụ ya mere o jiri webata ọtụtụ okwu olu ndị Ngwa. Ọ bụkwa ya kpatara O jiri wepụta ihu akwụkwọ abụọ na ọkara ịkọwa ihe okwu olumba ndị a bụ n’ igbo izugbọ. Guo ha nke ọma.
AJỤJỤ NWALE
1. Kedụ nke pụtara Nari ise?
a. 5
b. 50
ch. 500
d. 5000
2. Ụdaume igbo dị ole
a. atọ
b. asatọ
ch. itoolu
d. anọ
3. Mgbochiume igbo dị ole
a. iri abụọ
b. iri atọ
ch. iri abụọ na asatọ
d. iri abụọ na ịsịị
4. Mkpụrụabịchịị igbo dị ole
a. iri atọ na ịsịị
b. iri atọ na asaa
ch. iri abụọ na ịsịị
d. iri ạtọ
5. Kedụ steeti abụghi nke ndị igbo
a. Legọọsu
b. Imo
ch. Anambra
d. Enugu
6. Họpụta nke ejighị asụsụ eme
a. Akụziri mmadu ihe
b. Akparịta ụka
ch. Azụ ahia
d. Akwa ụkwara
7. Ihe eji ama mba bụ
a. Asụsụ
b. Obodo
ch. Olumba
d. Igbo izugbe
8. Asụsụ e jiri mara igbo bụ
a. olumbe
b. Asụsụ
ch. Igbo
d. Obodo
9. Olee nke bụ akara ajụjụ?
a. !
b. *
ch. “ ”
d. ?
10. Nzogbu Nzogbu!
Enyi mba enyi!!
Zogbuo Nwoke!
Enyi mba enyi!!
Nke a bụ egwu
a. Agha
b. Akwa
ch. Ọnwa
d. Nwa
11. Na bekee, ọ dịka otu n’ ime ndị a adịghị n’ igbo
a. z
b. x
ch. o
d. kp
12. E kere Agụmagụ ọdịnaala ụzọ
a. Abụọ
b. Anọ
ch. Ise
d. Atọ
13. Nke kwesiri ịdị n’ngwucha ahịrịokwu ọbụla bụ;
a. Rịkọm
b. Kpọm
ch. Kpọm kpọm
d. Kpọmrikọm
14. Ọ fọdụrụ nkeji ise ka ọ kụọ elekere abụọ nke ehihie pụtara:
a. 1. 55am
b. 1. 05pm
ch. 2. 05pm
d. 1. 55pm
15. O jirila nkeji iri abụọ na ise gafee elekere anọ nke uhuruchi.
a. 4. 25am
b. 4. 25 pm
ch. 4. 20pm
d. 4. 20am
16. Akara edemede ji egosipụta mbuụzo bụ:
a. Akarauhie
b. Rịkọm
ch. Rịkọm elu
d. Kpọm.
17. Ezinaụlọ ndị igbo gbasara
a. Nne
b. Nna
ch. Ụmụ
d. Ha niile
18. Otu n’ime ihe ndị a abụghị ọrụ ụmụaka n’ezinaụlọ
a. Iweta ego nri
b. ịzacha ụlọ
ch. Ịsachaefere
d. Isi nri.
19. Egwu ejiri mara ụmụnze bụ:
a. Egwu mgbaji
b. Nkwa ụmụ Aghọghọ
ch. Mkpọkiti
d. Disko
20. Nke a bụ aha egwu ndị obodo ọhafia.
a. Abigbo
b. Ikpirikpe
ch. Egedeege
d. Mgbaji.