ỌNỤỌGỤGỤ (Numerals)
ISI NKE MBU
ỌNỤỌGỤGỤ (Numerals)
1.1 NKỌWA ỌNỤỌGỤGỤ
Ọnụọgụgụ bụ usoro ọgụgụ n’ Igbo. Ọnụọgụgụ so n’ otu n’ ime nkejiasụsụ enwere n’ Igbo. Eji Ọnụọgụgụ ezipụta ole ihe dị nwekwa nke a na-agụ n’ ụzọ ego dika kobo, Nari abụọ
|
BEKEE |
IGBO |
|
0 |
Efu |
|
1 |
Out |
|
10 |
Iri |
|
20 |
Iri abụọ |
|
30 |
Iri atọ |
|
40 |
Iri anọ |
|
50 |
Iri ise |
|
60 |
Iri ịsịị |
|
70 |
Iri asaa |
|
80 |
Iri asatọ |
|
90 |
Iri itoolu |
|
100 |
Narị/ Otu Narị |
|
200 |
Narị abụọ |
|
300 |
Narị atọ |
|
400 |
Narị anọ |
|
500 |
Narị ise |
|
600 |
Narị ịsịị |
|
700 |
Narị asaa |
|
800 |
Narị asato |
|
900 |
Narị itoolu |
|
1000 |
Otu puku/puku |
1.2 NTINYE ỌNỤỌGỤGỤ N’ AHỊRỊOKWU
Okwesiri ka ụmụ akwụkwọ mata etu esi arụpụta ọnụọgụgụ ndị a mgbe ha buru ịbu dịka nke a:
1. 679
Ka anyi rụpụta ya n’ ahịrịokwu igbo:
600 ---- Narị ịsịị
70 ---- iri asaa
9 ----- itoolu
679: Narị ịsịị na iri asaa na itoolu
2. 786
Ka anyi rụpụta ya n’ ahịrịokwu igbo:
700 ---- Narị asaa
80 ------ iri asatọ
6 ------- ịsịị
786: Narị asaa na iri asatọ na isii
3. 799
Nrụpụta n’ ahịrịokwu Igbo:
700 ---- Narị asaa
90 ---- iri itoolu
` 9 ----- itoolu
799: Narị asaa na iri itoolu na itoolu
4. 885
Nrụpụta n’ ahịrịokwu igbo:
800 ---- Narị asatọ
80 ---- iri asatọ
5 ---- ise
885: Narị asatọ na iri asatọ na ise
5. 999
Nrụpụta n’ ahịrịokwu Igbo:
900 ------ Narị Itoolu
90 ---- Iri Itoolu
9 ------ Itoolu
999: Narị Itoolu na iri itoolu na itoolu
ISI NKE ABỤỌ
EKWUMEKWU BANYERE NRUBEISI NA NDEBIWU
2.1 NKỌWA IHE BỤ NRUBEISI
Nrubeisi bụ mmadu ime ihe a gwara ya mee. Nwa ọ bụla nwere nrubeisi na-enweta ihe ọchọrọ na ndụ, nweta ahụ na-adịkwa ogologo ndụ.
Nwata ọ bụla ga na-erubeisi na ụlọ akwụkwọ nakwa ndị nkuzi ya.
Nrubeisi abụghị naani n’ ụlọ akwụkwọ ka o jedebere. Nwata kwesikwara Ị na-erubere nne na nna ya isi n’ ụlọ dịka:
i. Izacha ezinaụlọ
ii. Ichu mmiri
iii. Iga kpata nkụ ma ọ dị na mkpa
iv. Inye aka sie erimeri a ga-eri n’ ụlọ
v. Inye aka n’ ọrụ ndị ọzọ dị n’ ezinaụlọ
2.2 NKỌWA NDEBEIWU
A. Nkọwa ihe bụ Ndebeiwu
N’ ezinaụlọ ọbụla bụ ezigbo ezinaụlọ, o nwere iwu na-achị ha dịka:
i. Ha ga na-arụsi ọrụ ike
ii. Ha agaghị na-ezu ohi
iii. Ha agaghi na-agba ama ugha w.d.z.g
Ezinaụlọ nwere iwu ndi a, na- edebe ha bụ ezinaụlọ na- edebe iwu. Ụmụaka a zụlitere n’ezinaụlọ di etu a na- abụ ụmụaka na- edebe iwu. A na- enwe ịhụnanya, Ọganiihu na nsọpụrụ n’ ezinaụlọ dị eti a.
B. Ndebeiwu N’ụlọ akwụkwọ.
Ụlọ akwụkwọ ọ bụla bụ ezigbo ụlọ akwụkwọ ga- enweriri iwu na- achi ya dịka:
i Iwu ịdị ọcha
ii. Iwu idebe gburugburu ọcha
iii. Iwu ịbịa akwụkwọ n’oge
iv. Iwu ịsọpụrụ ndị nkuzi
v. Iwu ịnọrọ nwayọọ na klaasi.
Ụmụ akwụkwọ na- edebe iwu ndị a, ha ga na-amụta akwụkwọ, ọganiihu ga –adị na ya, a ga- enwe ịhụnanya. Ụmụ akwụkwọ nọ n’ụlọ akwụkwọ dị etu a, na- erube isi n’iwu ndị a ga-abụ ndị na- edebe iwu.
2.3 URU NRUBEISI NA NDEBEIWU NA BARA ANYḷ.
i. Ha na-eme ka enwee ịhụnanya
ii. Ha na- eme ka nsọpụrụ na-adị n’obodo
iii. Ha na- eweta mmepe na ọganiihu n’obodo
iv.Ha na –egosi ndị zụrụ site na nwata
v. Ha na-egosi ndị obodo ahu dịka ndị ma ara ihe.
vi. Ebe e nwere nrubeisi na ndebeiwu, udo na-adị ebe ahụ.
vii. Obodo nwere nrubeisi na ndebeiwu, agwa ọjọrọ na 419 anaghị adịkebe na ya.
viii. Ebe e nwere nrubeisi na ndebeiwu, mmegu anaghị adị n’ ebe ahụ
ISI NKE ATỌ
NKEJIASỤSỤ (Parts of Speech).
3.1 NKỌWA: NKEJIASỤSỤ.
Nkejiasụsụ bụ ọrụ mkpụrụokwu na- arụ dịka ọnọdụ, ụda na nghọta ya si dị n’ahịrịokwu ebe ọ dị.
3.2 ỤDỊ NKEJI ASỤSỤ E NWERE
1. Mkpọaha (Noun)
2. NNọchiaha (Pronoun)
3. Ngwa (verb)
4. Nkọwaha (Nominal modifier)
5. Enyemakangwa (Auxilary verb)
6. Njịkọ (Conjuction)
7. Mbuụzọ(Preposition)
8. Nkwuwa (Adverb)
9. Ntịmkpụ (Interjection)
A. MKPỌAHA/AHA
Mkpọaha bụ mkpụrụokwu eji egosi aha ihe ọbụla nke ọnọdụ ya n’ahịrịokwu na-abụ n’ isiahịrị.
Aha bụ aha obodo, mmadụ, anụmanụ ma ọ bụ ihe dị iche iche.
Ọmụmaatụ:
|
Aha mmadụ |
Aha Obodo |
Aha anụmanụ |
Aha ihe |
|
Chiọma |
Abia |
Ewu |
Efere |
|
Mmaduka |
Nnewi |
Aturu |
Iko |
|
Onyinye |
Imo |
Oke |
Mkpisi ode |
|
Ekenechukwu |
Ọba |
Ebune |
Akwụkwọ |
|
Ebube |
Ebonyi |
Ọkukọ |
Oche |
E nwere ụdị aha dị iche iche. Ha bụ:
i. Aha aka(proper noun)
ii. Aha izugbe (common noun)
iii. Ahauche (Abstract noun)
iv. Ahaigwe (collective noun)
v. Ahankọwa (adjectival noun)
B. NNỌCHỊAHA
Nnọchịaha bụ mkpuruokwu na-anọchịte ebe aha gaara anọ dịka ndị a:
O,Ọ, Ya, Ha, Anyi Unu, g, ị, i,
Ọmụmaatụ:
a. Uche gara ahịa
Ọ gara ahia
b. Ifeoma nwere ego
O nwere ego
a. N’ebe a “Ọ” nọchịtere anya “uche”.
b. N’ebe a “O” nọchịtere anya “ifeoma”.
Ụdị Nnọchịaha dị iche iche.
1. Nnọchịonye (Personal pronoun): Nke a bụ nnọchịaha na- anọchịte aha mmadụ n’ihe ndi ọzọ a chọghị ikpo aha. E nwere nnọchịonye onye nke mbu, onye nke abụọ n’ onye nke ato.
Ọmụmaatụ:
|
Pesin (person) |
Mkpoolu(singular) |
Ubara(plural) |
|
Onye mbu |
M, mụ |
Anyi |
|
Onye abụọ |
gi, i, ị |
Unu |
|
Onye atọ |
ya, o, Ọ |
Ha. |
Ọmụmaatụ:
a. (i) Ana m abịa (mkpoolu)
(ii) Anyi na- abịa (ubara)
b. (i) I nwere akwụkwọ ahụ (mkpoolu)
(ii) unu e nwere akwụkwọ ahụ (ubara)
ch. (i) Ọ hụrụ mkpa Ọ dị (mkpoolu)
(ii) Ha hụrụ mkpa ha dị (ubara)
2. Nnọchịmpesin (Impersonal pronoun): Nkẹ a bụ nnọchiaha na- enweghi onye ma ọ bụ ihe doro anya ọ na-anọ chite kpọmkwem. Nnọchịmpesin e nwere n’asụsụ igbo bụ “A” na“E”.
Ọmụmaatụ:
i. A sịrị na mmiri zoro n’ Aba
ii. E gburu ewu
iii. A sịrị n’echi abụghị akwụkwọ
iv. E kwuru na obi ga abịa echi.
CH. NGWAA
Ngwaa bụ mkpụrụokwu na-ekwu ihe mkpọaha ma ọ bụ nnọchịaha. Ọ bụ ngwaa na-ezipiụta echiche dị n’ ahịrị okwu na ihe ahịrịokwu na-ekwu.
Ọmụmaatụ
i. Okeke gburu eru
ii. Ada bụ ite n’ ise
iii. Obi jere ahia
iv. Madụka sịrị nri
D. NKỌWAHA:
Nkọwaha bụ mkpụrụ okwu nke ọrụ ya bụ ịkọwa mkpọaha.
Nkọwaha nwere ngalaba anọ ha bụ:
i. Nkọwa(Adjective): Nkọwa bụ okwu na-akọwa mkpọaha. Okwu ufọdụ bụ nkọwa bụ ọcha, ojii, ọma, ajo, ukwu, obere, ọhụrụ ochie, mma, ogologo.
Ọmụmaatụ:
a. Nwoke Ọjọọ ahụ biara ebe a.
b. Ọkụkụ Ojii yiri akwa ise.
ch. O gotere uwe ọhụrụ.
ii. Nrụaka (Demonstrative): Nke a bụ nkọwaaha na-egosi ihe a na-ekwu maka ya site n’ ịrụta ya aka. Nrụaka enwere n’ igbo dị abụọ. Ha bụ “A” na “Ahụ”
Ọmụmaatụ:
(a) Nwaanyi a na-ere azụ.
(b) Ewu ahụ mara abụba.
(ch) Akwụkwọ a na-akuzi ụtọasụsụ igbo.
(d) Ọkụkọ ọcha ahụ mụrụ ụmụ iri abụọ.
iii. Mkpọkọta(Quantifier): Nke a bụ nkọwaaha na-egosi n’ ihe a na-ekwu maka ya bụ ihe a kpọkọtara ọnụ maọ bụ ihe dị ọtụtụ.
Ọmụmaatụ:
a. Ụmụaka niile a hụrụ ka enyere onyinye.
b. Mmadụ dum ka a chọrọ.
ch. Anyị ncha ga-agefe n’ ule.
d. Ụfọdụ mmadụ abụghị nzụkọ.
iv. Nkeonye (Pronominal Modifier): Nke a bụ nkọwaaha na-akọwa onye nwe ihe a na-ekwu maka ya.
Ọmụmaatụ:
a. Aturu m dị ime.
b. Ego anyi dị puku abụọ.
ch. Ụlọ ya buru ibu.
d. Ewu ụnụ dị ime.
E. ENYEMAKANGWAA:
Enyemakangwaa bu mkpụrụokwu na-enyere omekangwaa (Participle) aka ka o wee zuo oke dịka ngwaa. Enyemakangwaa, “NA” na-egosi ihe na-eme ugbua, ihe na-eme eme na ihe na-eme na-agawanye, “GA” na-egosi ihe ga-eme n’ ọdịniihu ebe “KA” na-egosi ihe gara ime ma o mezighịị
Omumaatu:
i. Anyi na – agụ Igbo Ugbu a.
ii. Ada ga – eje ahịa echi.
iii. Obi ka - akwọ aka tupu o rie nri.
iv. Anyi ka – abịa ebe.
F. NJIKỌ
Njikọ bụ mkpụrụokwu na-ejikọ, mkpụrụokwu, nkebịokwu, nkebịahịrị na ahịrịokwu dị iche iche.
Njikọ ụfọdụ bụ: na, ma, mana, maọbu, maka, ka, kama, tupu, tụmadị.
Ọmụmaatụ:
i. Ji na ede bụ ihe oriri.
ii. Obi na Ada bụcha ndị obodo anyi.
iii. Tupu O rie nri ọ kwọrọ aka.
iv. Nye m otu ma ọ bụ abụọ.
v. O jere ahia ma ọ zụtaghị jị.
G. MBUỤZO
Mbuụzọ bụ nkejiasụsụ na-egosi mmekọrịta dị n’ etiti mkpọaha na ibe ya. Mbuụzọ na-egosikari oge, ebe ihe nọ, ebe ihe di na ọnọdụ ejiri mee ihe.
Naani “na” ka eji mbuụzọ n’ asụsụ igbo, ma a na-ede “na” dịka mbuụzọ n’ ụzọ abụọ
i. Oge Okwu na-esote “na” bidoro na mgbochịume ma ọ bụ myịrịụdaume a ga-ede “na” n’ uju. Ọ ga-akwụrụ onwe ya.
Ọmụmaatụ:
a. Nnam bi na Legọọsụ.
b. Azụ bi na mmiri.
ch. Akpụ dị na nkata.
ii. Oge Okwu na-esote mbuụzọ “na” biadoro n’ ụdaume, a ga-ewepu “a” dị na mbuụzọ “na” ma were rịkọmelu dochie anya ya.
Ọmụmaatụ:
i. Ogechi nọ n’ oche.
ii. Chike bị n’ Aba.
iii. Ofe dị n’ elu.
H. NKWUWA:
Nkwuwa bụ nkeji asụsụ nke na-etinyeso nghọta na ngwaa. E ji nkwuwa egosi otu ihe si mee, otu ihe dị, Oge ihe mere, ihe eji mee ihe, otu ihe ha, ihe nwere ike ime. w.d.g.z
Ọmụmaatụ:
i. Ọ bịara ebe a unyaahụ.
ii. O riri nri ọsọ ọsọ.
iii. O jere dine ala nwayọọ.
iv. O kwuru okwu ngwa ngwa.
I. NTIMKPU
Ntimkpu bụ nkejiasụsụ egi egosi mkpu pụrụ mmadụ n’ ọnụ mgbe ihe mere n’ ike, na mwute, na mberede ma ọ bu na nkụja.
Okwu na-egosi ntimkpu na-akwụrụ onwe ya n’ ahịrịokwu ma bụrụkwa akara mkpu(!) tupu okwu ndị ọzọ esobe ya n’ azụ.
Ọmụmaatụ:
Ewo!, Yaa!, Hei!, Tufia!, Hia!, Chei!, Ooh!, Wdgz
Lee ụfọdụ ọmụmaatụ n’ ahịrịokwu.
(i) Yaa! Ọ dabara nke ọma.
(ii) tufịa! Ọ bụrụ ọgwụ ọ gaghị ere.
(iii) Aaa! Obi m arịtuola.
(iv) cheyi! Ọnwụ gburu ya mere arụ.
ISI NKE ANỌ
AKỤKỌ IFO(STORY)
4.1 NKỌWA AKỤKỌ IFO
Akụkọ ifo bụ akụkọ mere n’ ala mmadụ n’ ala mmụọ na n’ ala anụmanụ. A na-akọkarị akụkọ ifo mgbe enwere ohere di ka n’ oge abalị. N’ oge gboo, ọ bụ ndị okenye na-akpọkọ ụmụaka na- akọrọ ha akụkọ ifo na-enwe usoro eji amalite ya nakwa usoro eji emechi ya.
4.2 Ụdị Agwa dị n’ Akụkọ Ifo
A na-enwe agwa dị iche iche dị ka:
i. Mmụọ
ii. Anụmanụ
iii. Mmadụ
iv. Osisi
v. Mmiri dgz
Ụfọdụ mgbe ihe ndị a na-eme omume dịka mmadụ. Ha na-ekwu okwu. Ha na- agbakwa mgba. Ha nwere ike merie ma ọ bụ emerie ha. Dị ka mmadụ, ha nwekwara ike ịnwụ anwụ.
4.3 Asụsụ na nka di n’ Akụkọ ifo: mbido Akụkọ ifo
1. Asụsụ ifo na-enwe mgbanwe site n’ obodo ruo n’ obodo. O nwere usoro ndị a:
a. Mbido
b. Etiti
ch. Usoro ngwacha.
2. Ọmụma asụsụ mbido
a. Chaakpii, Taakwii, Ootii
b. Ndi na-ege akụkọ ga-aza ugboro abụọ
Woo, yaa, Ọyọọ
3. Ihe ọzọ na- esote bụ ma ọkọ akụkọ nwere ike iji ilu wee jaa
akụkọ ya mma.
Ọmụmaatụ:
Ọkọọ: Nkịta nyara akpa.
Ogee: Nsi agwu n’ ohia.
Ọkọọ: Agụ baa n’ Ọhịa.
Ogee: Mgbada achịrị ume n’ aka.
Ndị be anyi enwere m akụkọ m ga-akọrọ unu. Ndị na-ege ya nti ga-aza si:
- Kọọrọ anyi ka obi dị anyị mma.
- Kọọrọ anyi mana ya dikwa mma(Tọkwa ụtọ)
- Na anyi ga-ege nti mara ihe iga-ekwu.
- Ugbu aka ọkọ akụkọ ga-asi:
Ọkọọ: O ruru otu mgbe.
Ogee: Otu mgbe eruọla.
Mgbe nke a gasịrị, ọkọ akụkọ nweziri ike ịkọ akụkọ ifo ahụ otu o si mara ya.
4. Mmechi: E nwere ike iji oyiri mkparịta ụka nke ọkọọ na ogee ga-ekwuritara onwe ha mechie ya dika:
Onye aghụghọ nwụọ.
Onye aghụghọ elie ya.
Ọkọ akụkọ ga-ahụ na-ewepụtara ihe mmụta dị n’ akụkọ ifo.
4.4 NJỊRỊMARA AKỤKỌ IFO
i. Akụkọ ifo na-enwe ụwa ndi a: Ụwa mmadụ, ụwa ụmụanụmanụ na ụwa ụmụ mmụọ.
ii. A na-akọkarị ya oge e nwere efe.
iii O na-enwe usoro eji ebido ya na usoro eji emechi ya.
iv. A naghị akpọ aha onye chepụtara ya.
v. Ọ na-esi n’ aka fere n’ aka, si n’ ọgbọ fere ọgbọ
4.5 URU AKỤKỌ IFO BARA
a. Ọ bụ akụkọ ndị okenye na-akọrọ ụmụaka ka ha si na ya mụta ihe.
b. Nkụzi na-apụtakarị ihe n’ akụkọ ifo bụ na onye na-eme ihe ọjọọ ga-ezukwa ihe ọjọọ, onye na-eme ihe ọma, ihe ọma ga-akpọ ya ihu.
Ch. Eji ya akụziri ụmụaka omenaala na agụmagụ ala.
d. Ọ na-eme ka ụmụaka mụta ige nti nakwa ikwu okwu.
ISI NKE ISE
AHḷRḷMFE
5.1 NKỌWA AHỊRỊMFE.
Ahịrịmfe bụ ahịrịokwu na-enwe naanị otu ngwaa nke na-ezipụta naani otu echiche na nghọta.
Ọmụmaatụ:
a. Ada chụrụ mmiri.
b. Mary jere ahia.
ch.O gwuru mmiri.
d. Ada gbara ọsọ.
e. Chibuike na- achị Ọchị.
5.2 Anyị nwere udị ahịrịmfe ndị a:
A. Ahịrịmfe: Ndịugbua
Ụdị Ahịrịmfe a na- egosi ihe na- eme ugbu a maka na- agakwa n’ihu na- eme ugbu a dị ka:
i. Chinonso na- eri nri.
ii. Nkechi na- echu mmiri.
iii. Ha na- achị ọchị.
iv. Ụmụakwụkwọ na-agba egwu.
v. Nwafor na- agụ akwụkwọ
B. Ahịrịmfe Ndịnaazu
Ụdị Ahịrịmfe a bụ udị na-egosi ihe mere n’oge garaaga. Ọ na- egosi ihe megoro eme maọbụ ihe emesigoro n’oge gara aga dịka:
i. Ada riri nri.
ii. Nkechi churu mmiri.
iii. Ha chịrị ọchị.
iv. Ụmụakwụkwọ gbara egwu.
v. Nwafọ gụrụ akwụkwọ
CH. Ahịrịmfe Ndịniihu
Ụdị a bụ ahịrịmfe na- egosi ihe ka ga-eme n’ọdịniihu. Emebeghị ihe ahụ eme.
Ọmụmaatụ:
i. Ada ga- eri nri.
ii. Nkechi ga- echu mmiri.
iii. Ha ga- achị ọchị.
iv. Ụmụakwụkwọ ga- agba egwu.
v. Nwafọ ga-aga akwụkwọ.
ISI NKE ỊSỊỊ
KỌLỌ DỊ ICHE ICHE(Colour)
6.1 NKỌWA KỌLỌ
Kọlọ nwere aha ọzọ ana- akpọ ọ bụ Agwa(colour). Kọlọ ọ bụla nwere ihe anyi na –akpọ ya n’olu igbo.
ISI NKE ASAA
IHUOKWU NA AZUOKWU
(Direct and indirect speech)
7.1 NKỌWA IHUOKWU NA AZỤOKWU
Ihuokwu bụ ndị ahụ si n’ọnụ “okwuu” boowampụta. Okwu ndị ahụ dị etu ahụ “onye mbu si kwuo ya n’abụghị agwaragwa okwu. N’ebe a ‘okwuu’ bụ ‘onyEmBu’ ebe ‘ỌNỤỤ IHU NA IHU’ bụ onye nke abụọ. Ya bụ na okwuu kwuru okwu ya n’ihu onye nke abụọ bụ ‘ỌNỤỤ IHU NA IHU. Ọ bụrụkwa n’ ọgbakọ dịka n’ ụlọ ụka ndị niile nụrụ okwu ụkọchukwu ihu na ihụa bụcha ‘ỌNỤỤ IHU NA IHU’ n’ Ụbara. A bia n’edemede maka okwu niile okwuu bụ ONYEMBU KWỤRỤ, a na- eji akara ngwu were guchie ha. A na-eme nke a n’iji gosi na onye ahụ bụ onye nke abụọ na-ekwu ya na ọ bụghị ọnụ ya kwuru ha. Ya bụ na okwu kadịkwa etu esi kwuo n’agwaghi ha agwa. Lee ihe chioma kwuru.
Chioma siri, “Aga m abia echi”.
Chike kwuru “Agwala m ahia”.
Obisiri, “Edechaala m leta nke m”.
7.2 AZỤOKWU/ OKWUAZU
Azụokwụ bụ okwu ndị ahụ onye/ndi nke abụọ bụ ỌNỤỤ IHU NA IHU nụtara wee bịa na- akọzịrị mmadụ nke atọ. Onye nke atọ nwere ike nọrọ nso na ọ nọghị ebe ọ ga-anụ ya ihu na ihụ. Dị ka ekwuru na mbu, ndị niile nọ n’ụlọ ụka nụrụ ihe na ihe oge ụkọchukwu na-ekwu okwu ya bụcha ỌNỤỤ IHA NA IHU nke ụbara.
Ọ dị mkpa ka a mụta na e nwere okwu ụfọdụ a na- agbanwe na ntụgharị okwuihu ka ọ bụrụ okwuazụ.
Lee mgbanwe ndia-
i. M/GI – ga – aghọzi – ya
ii. ANyi –ga – aghọzi – Ha
iii. NDI A- ga aghọzi – NDI AHỤ
iv. UGBU A ga – aghọzi – MGBE AHỤ
v. TAA- ga- abụkwa- ỤBỌCHḷ AHỤ
vi. ECHI- ga- abụkwa- ECHI
Ọmụmaatụ:
|
|
OKWU IHU |
OKWUAZỤ |
|
1 |
Ọ zụtara ji na ede. |
Ọ sịrị na ọ zụtara ji na ede. |
|
2. |
A ga m abịa ugbua. |
O kwuru nay a ga- abịa mgbe ahụ. |
|
3. |
Ihu ụwa emesi ela ya ike. |
O kwuru na ihe uwa emesiela ya ike. |
|
4. |
Chineke gozie m. |
Ọ sịrị ka chineke gozie ya. |
|
5. |
Nna m zụtara ewu. |
Ọ sịrị na nna ya zụtara okụkọ. |
|
6. |
Ha niile bụcha ndị Yoruba. |
O kwuru sin a ha niile bụcha ndị Yoruba. |
|
7. |
Nkechi emzuola nkwa ya. |
Ọ sịrị na nkechi emezuoka nkwa ya. |
|
8. |
Amaka gbara onye nke ise. |
Ọ sịrị na Amaka gbara onye nke ise. |
|
9. |
Obi na-eche Uche maka nna ya. |
Ọ sịrị na Obi na-echi uche maka nna ya. |
|
10. |
Kelee nne na nna gị. |
Ọ sịrị m kelee nne na nna gị. |
ISE NKE ASATỌ
NTỤGHARỊ (TRANSLATION)
8.1 NKỌWA NTỤGHARỊ
Ntụgharị bụ ịsụgharị ihe dị n’otu asụsụ ka ọ dị n’asụsụ ọzọ, ka echiche, nghọta na mpụtara ya bụrụ otu.
8.2 IHE MGBAKWASA UKWU MAKA NTỤGHARỊ
1. Gụọ ihe enyere gi ọtụtụ ugboro iji mata echiche na ebmnuche di na ya.
2. Ntụgharị mkpụrụokwu ga-adị na mkpụrụ okwu nke ahịrịokwu ga- adi n’ ahịrịokwu nke nkeji edemede ga- adịkwa na nkeji edemede. (paragraph)
3. Na ntụgharị, a gaghi etinye echiche ọzọ ma ọ bụ wepụ ewepu. Ọmụmaatụ:
“ He went to the market” ga- abụ “Ọ gara ahịa” Ọ gaghị abụ “Ọ gara igote ihe n’ ahịa”.
4. E nwere ilu, akpalaokwu na atụmatụ okwu bekee a ga-eji nke igbo ya na nke bekee ahụ nwere otu echiche na mpụtara tụgharịa ya.
Ọmụmaatụ:
“A stitch in time, saves nine” ga- abụ “E mee ngwa ngwa emeghara ọdachị” “There is no smoke without fire” ga- abụ “Awọ anaghị agha ọsọ ehihie n’efu”.
8.3 NTỤGHARỊ IHE EDERE NA BEKEE N’IGBO
|
Bekee |
Igbo |
|
Bread |
Achịcha |
|
Time |
Oge |
|
O’clock |
Elekere |
|
Minute |
Nkeji |
|
Tall |
Ogologo |
|
Male |
Nwoke |
|
White |
Ọcha |
|
Truth |
Eziokwu |
|
Water |
Mmiri |
|
December |
Disemba |
|
November |
Novemba |
|
October |
Ọktoba |
|
Sunday |
Sonde |
|
Tuesday |
Tuzudee |
|
Assignment |
Ihe omume |
|
Reported |
Okwungwon |
|
Plural |
Ụbara |
|
Singular |
Mkpoolu |
|
Padlock |
Igodo |
|
Paragraph |
Nkeji edemede |
|
Sentence |
Ahịrịokwu |
|
Teacher |
Onyenkuzi |
|
Food |
Nri |
|
Moon |
Ọnwa |
|
Poem |
Abụ |
8.4 NTỤGHARỊ AHỊRỊOKWU NA ILU.
|
|
Bekee |
Igbo |
|
1. |
I should have come there. |
A garam abia ebe ahu. |
|
2. |
Adamma has take in. |
Adamma adila ime. |
|
3. |
Nkechi went to market. |
Nkechi jere ahịa. |
|
4. |
She bought some meat. |
Ọ zụtara anụ. |
|
5. |
There is no smoke without fire. |
Awọ anaghị agba ọsọ ehihie n’efu. |
|
6. |
The man gave me one thousand naira. |
Nwoke ahụ nyere m otu puku naira. |
|
7. |
His uncle deliberately stood up. |
Nwanne nna ya nke nwoke kpachara anya kwuru ọtọ. |
|
8. |
The patient dog eats the fattest bone. |
Onye ndidi na- eri azụ ukpoo. |
|
9. |
Ngozi took first position. |
Ngozi gbara onye nke mbu. |
|
10. |
Obi is the son of the soil. |
Obi bụ nwa amaala. |
ISI NKE ITOOLU
AKWỤKWỌ AGỤMAGỤ A HỌPỤTARA (EJIJE)
9.1 NNYỌCHA AKWỤKWỌ EJIJE.
“NKA Dḷ NA NTI”
1. Aha akwụkwọ “Nka dị na nti.”
2. ỤdỊ agụmagụ o bụ Ejije a rọrọ arọ
3. Aha onye dere akwukwo Maazi Okoro. B. C
4. Afọ Mbipụta 1983
5. Ndị Mbipụta Evans publisher Nig Ltd
6. Ebe mbipụta Ibadan
7. Ebe ihe mere Eji ntọala ala ngwa nke dị n’abịa steeti na obodo ndị gbara ya okirikiri wee dee akwụkwọ a.
8. Isi okwu dị n’akwụkwọ nka di na nti. Nke a pụtara na onye gee nti n’ezigbo ndumodụ e nyere ya na ọ ga- anote ndu ka na ọ ga –aka nka. Onye egehi kwanu nti n’ezigbo ndụmọdụ, ọ ga- anwụ n’ oge erughị eru.
9. Nchịkọta akụkọ: Maazi Okoro B.C na- ezipụta n’ akwụkwọ ejije a etu nwa okorobịa aha ya bụ Njoku siri ghara ige nti na ndumọdụ nne ya na nna ya na ndị enyi ya na- enye ya. Ọ kpọchiri nti ya. Ajọ ndu niile o biri karịchaa n’ịchụ nwaanyi na ndi nkiti ma ndị nọ na dị mere ka ọ nwụọ ọnwụ okorobịa ọnwụ ya site kwara n’ aka nwaanyi.
9.2 USORO NHAZI
A. Anyi nwere ike hazie ejije a uzọ atọ:
i. Nke mbu: mmalite idi na mma Njọkụ na otu Nwaanyi a na- akpọ Ezinwaanyi. Njọkụ hụrụ n’ anya. Naani ego ya ka ọ hụrụ n’ anya. Njọkụ Chefụọ ndumọdụ ndị enyi ya isepu onwe ya n’ebe Ezinwaanyị nọ.
ii. Nke Abụọ: Site na mgbe ọdachi Kwudoro Njọkụ. O wee daa n’ azumahia ọ na- azụ. Ezinwaanyi wee gba fuo n’ ebe ọ nọ.
iii. Nke atọ: site na mbilite n’ahia Njọkụ. O wee laghachikwa n’ ọnụdụ ya, nwee ego ọzọ, zụọ ụgbọ ala buru ya lọta n’ obodo ya bụ ụmụanụmbe. Ọ gwara nne ya nna ya na ya ga- eje Aba jee hụ Ezinwaanyị. Ha dọrọ ya aka na nti ka ọ gharakwa ịga be nwaanyị a- lurula dị. Ọ kachiri nti chọrọ Ezinaanyị gaa n’ụlọ dị ya. Ebe ahụ ka ọ nọrọ zute ọnwụ ya.
B. Agwa ndị pụtara ihe N’Ejije a: ka anyị nyochaa agwa ndị a:
iv. Njọkụ: Ọ bụ nwoke a bụ isi dokpu nti n’ ejije a. Ọ bụ nwoke OKEDIKE n’ ejije a. Anyi chọpụtara akparamagwa ndi a n’ebe ọ nọ.
a. Ọ bụ onye na- agha mbọ n’ ichụta ego.
b. Njọkụ dịka onye oriri.
ch. Njọkụ dịka onye na-abụ ọ daa, o bilikwa ọzọ.
d. Njọkụ dịka onye mkpọchị nti.
e. Njọkụ dịka ọchụ nwaanyị.
9.3. AGWA NDḷ ỌZỌ PỤTARA IHE.
A. ỌJỊ Na nwunye ya bụ ikodie: Anyị ga-etule mmadụ abụọ ndị a. Ha bụ ndị Ụmụ anụmbe. Ọ bu ha mụrụ Njọkụ. Ha kpara awa ọma ndị a:
i. Ha na-ebi ndu ezigbo ezinaụlọ. Ha na-ejiko aka ọnụ enye ụmụ ha ndụmọdụ ga- abara ha uru. Ha adịghị ka ezi na ụlọ ụfọdu ebe nne ma ọ bu nna na-adọnyre nwa ya na akpa ajọ agwa ukwu. Ha jikọrọ aka ọnụ kagbuo ọchichọ Njọku ilụ nwaanyi mbammiri. Ha jikọkwara aka ọnụ gbaa mbọ igbochi Njọkụ ịchọrọ Ezinwaanyi gawa n’ụlọ dị ya n’Abia: Ndụmọdụ ha kụru afọ n’ala.
ii. Dịka ndị ha na mmadụ ibe ha na enwe ezi mmekọrịta: mgbe mmadụ nwu na hụrụ maazi Azubike, Maazị Oji na nwunye ya gbra ya mgbaru. Oji nyere ya okwu nkasi obi.
iii. Dika dị na nwunye na- ebi n’udo : Ọ dighị ebe anyi hụrụ ka oji na nwunye ya na- ese okwu. Ha abụọ jịkọrọ aka ọnụ n’inye nwa ha nwoke, Njoku ndụmọdụ ka o sepụ aka n’ agwa ọjọọ.
B. Ezinwaanyi: Anyi chọpụtara ihe ndị a n’ ebe Ezinwaanyị nọ:
i. Ọ bụ nwata akwụkwọ ejighị akwụkwọ ya kpọrọ ihe.
ii. Naanị mkpa ya bu isogharị umụnwoke, na- aghọgbu ha na- anakọrọ ha ego.
iii. Ọ dịghị mgbe ọ hụrụ Njọkụ n’ anya. Naani ego Njọkụ ka ọ hụrụ n’anya.
iv. mgbe Njọkụ dara n’ahia ya, Ezinwaanyi gbafuo ga lụọ dị ọzọ.
v. Ọ bụ agwa ọjọọ ọnọnadịa chọdị ya ranyere Njọkụ n’onwu ya.
vi.O dịghị ezigbo agwa anyi chọpụtara n’ Ezinwaanyi.
vii. Aha obodo nyere nwaanyị a adabaghị adaba. Aha ya aka abụ Ajọ nwaanyị.
CH. Eze, Agụ, chima na Adikwu: mmadụ anọ ndị a bụ enyi Njọkụ. Anyị Chọpụtara omume ndị a n’ aka ha:
i.Ndị a na- enye enyi ha ezigbo ndụmọdụ: Ha na- enye Njọkụ ndụmọdụ bara uru gbasara mmekọrịta ya na ụmụ nwaanyị. Njọkụ egeghi ha nti.
ii. Dịka ndị oriri: Ha bụ ndị oriri. Ha na- aga ụlọ oriri na nkwari ebe ha na-anọ na-eri na- anụ ka a na- anwụ anwụ.
iii. Dịka ndị na- emu enyi ha emu azụ: Anyị chọpụtara na mmadụ ano ndị a nujuo mmanya afọ ha ebido muwe enyi ha nwọke bụ Njọkụ eme azụ. Ọ bụ site na nkata ha na-akpa ka ha nupuru nkwu afọ ka ha nọ kọwapụta na ebe Njọkụ siri baa ọgaranya bụ ihe ndị mmadu o zuru mgbe ọkụ ghara ahịa Aba.
9.4 OMENAALA DỊ N’ EJIJE A
A. Maazị Okorọ B.C zipụta Omenaala abụọ n’akwụkwọ ejije a. Ha bụ:
i. Ịje mgbaru.
ii. Omenaala Oji n’ebe mmadụ Nwụrụ
B. Asụsụ Nka dị n’ejije a: Anyị chọpụtara ndị a:
i. Ụkabuilu: Nke a dị abụọ. Akụkọ oji kọrọ maka ọzọdịmgba na Agadị Nwaanyị n’ihu 14. Nke a bụ ụkabuilu. Ọ bụkwa akụkọ ntọọchi. Ụkabuilu ọzọ dị n’ ihu 40. Nke ahụ akụkọ chima kọrọ n’ụlọ o riri na nkwarị.
ii. Okwu sị n’Akwụkwọ Nsọ: Lee ihu 31 ebe o dere “onye nwụrụ anwụ anaghị eto jaa”. Nke a bụ okwu si n’ Akwụkwọ Nsọ ndi ụka Kraist Leekwa ihu 38 ebe o dere na Akwụkwọ Nsọ kwuru na ihe “iji tunyere mmadụ ka a ga- eji atunyere gị”. Chima webatakwara okwu ndị ụka Kraist mgbe o siri n’ihu 59 “……. Ọ bụ n’ihi ndị ọjọọ ka Jisos jiri bịa n’uwa”.
iii. Olumba; Ọ bụ eziokwu na ejiri igbo izugbe dee ejije a mana maazị Okoro echezoghịkwa na ọ bụ n’ala Ngwa ka a mụrụ ya. Ọ bụkwa ebe ya nọ too. Ọ bụ ya mere o jiri webata ọtụtụ okwu olu ndi Ngwa. Ọ bụkwa ya kpatara o jiri wepụta ihu akwụkwọ abụọ na Ọkara ikọwa ihe okwu olumba ndị a bụ n’igbo izugbe. Gụọ ha nke ọma.
ISI NKE IRI
EDEMEDE NDUZI BANYETE OTU NZUZO N’ỤLỌ
AKWỤKWỌ.
10.1 NKỌWA IHE BỤ OTU NZUZO N’ ỤLỌ AKWỤKWỌ
N’ ụlọ akwụkwọ sekọndịrị nakwa nke a na-azu ndị nkuzi, ụmụ akwụkwọ na- enwe otu enyemaka dị iche iche dịka otu skaụtụ, Gal Gaidi, Red Krọọs, manọwọọ, SCM nakwa ọtụtụ ndị ọzọ. otu ndị a bụ inyere ndị mmadụ aka n’anaghị ego. Ha na-enwekwa otu ga na- enyere ha aka n’ agụmakwụkwọ ha dịka ndị otu egwuregwu (dramatic society) na kwanya.
N’ ulọ akwụkwọ mahadum, ha na-enwe kwa otu nke ha ga- eji na- enwe aṅuri, na- anọrịkwa oge dịka Dọla klọb, G Sigma Klọb; Juy international nakwa ndi ọzọ. ha nwekwara otu a na-akpọ paireets E kwuru na otu onye n’ime ndị nwere paireets n’ulọ akwụkwọ mahadum na Naijiria bụ ọkammụta Wole Shoyinka. Mgbe hị were ya, ha ji ya arụ ezi ọrụ. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla ha ji ya eme.
Mana ka agha bisiri na 1971 ụmụ akwụkwọ mahadum wee tụgharịa otu paireets ka ọ ghọọ otu ọjọọ ha ji arụ arụrụ ala dị iche iche.
Ha si n’otu paireets a wee kewapụtasịa otu ọjọọ ọzọ dịka Vayakins, Blaak Kats, Black Bereeti na ndị ọzọ. otu ndi a na- akpa ike ọjọọ n’ụlọ akwụkwọ mahadum.
Anyị na- anụkwa na ụfodụ otu ndị a anbatala n’ụfọdụ ụlọ akwụkwọ sekọndịrị.
10.2 ỌRỤ ỌJỌỌ OTU NZỤZỌ N’ỤLỌ AKWỤKWỌ.
Otu nzuzo nọ n’ụlọ akwụkwọ na-arụ ọrụ ọjọọ ndị a:
i. Ha na- eji ya egusi onwe ha.
ii. Ha ji ya amaja ụmụ akwụkwọ ndị esoghị n’otu ha. Mgbe Ụfọdụ ha na- egbu ụmụ akwụkwọ emeghị ha ihe ọbụla.
iii. Ha ji ya amanye ndị nkụzi ka ha nye ha akara n’ule ha emeghị nke ọma. Mgbe Ụfọdụ ha na- egbu ndị nkụzi ahụ egbu.
iv. Ha na- amanye ụmụ nwaanyi, waa ha ụkwụ n’ike.
v. Ha na- enye nnukwu nsogbu n’ụlọ akwụkwọ site n’ime mkpọtu na ọgba aghara mgbe ọ chajuru ha isi.
vi. Ụfọdụ n’ime ha na- eji egbe eje ohi.
10.3 NHAZI EDEMEDE: OTU NZUZU N’ỤLỌ AKWỤKWỌ.
Onye nkụzi na ụmụ akwụkwọ ga- ahazi edemede a na nkeji na nkeji.
Nhazi na nkeji na nkeji,
i. Okwu mmalite.
ii. Nkenke akụkọ.
iii. Ike ọjọọ otu nzuzo na- akpa.
iv. Ọghọm dị n’otu nzuzo.
v. Etu a ga-esi kwụsị otu nzuzo n’ụlọ akwụkwọ.
vi Okwu mmechi.
10.4 EDEMEDE ỌMỤMAATỤ: OTU NZUZO N’ỤLỌ AKWỤKWỌ
N’oge elu bu ala ọsa, ụmụakwụkwọ na- enwe otu di iche iche n’ulọ akwụkwọ ha. Ụfọdụ bụ otu ndị enyemaka dịka boys skaụtụ, Gals Gaịdị na Red Krọọs. Ụfọdụ bụ nke ụmụ akwụkwọ ji eme onwe ha obi akụrị. Ụfọdụ bụ nke ha ji anorị oge ma ha gusia akwụkwọ. Ụfọdụ bụkwa ndị na-enyere ha aka n’ imụta akwụkwọ ha.
Enwere otu nzuzo ndị dị ọjọọ. Ha na- ebusa onwe ha agha kwa mgbe kwa mgbe. Mgbe Ụfọdụ ha egbuo onye maọbụ ndi otu ha nọ n’otu ọzọ na- ama ha aka n’ihu. Ha na- amanye ndị nkuzi ka ha nye ha akara n’ihe ha emetaghị nke ọma n’ule. Oge Ụfọdụ ha na- egbu ndị nkụzi ha nụpụrụ si n’ime ihe ha chọrọ. Ha na- awa ụmụ agbọghọ ụkwụ n’ike ma onye ahụ jụ ikwere ka ha na ha mee ọyị. Ụfọdụ n;ime ha na- eji egbe gaa nọchie moto nakọrọ ndị mmadụ ego na ngwogwo ha. Ha na- ebute ọgba aghara n’ ụlọ akwụkwọ ọ bụla ha nọ.
Ha na- ebutere ụmụ akwụkwọ na ndị nkuzị obi nkoro n’elu oge ọ bụla. Onye ọ bụla na- anọ n’oke egwu mgbe niile. Ha na-ebutere ulọ akwụkwọ ha aha ọjọọ. Ọ bụ ha ka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ji emere akpu obị ka ha wee natara ha ọchịchị n’aka ike. Ha na- emebi ego nne na nna ji azu ha n’ụlọ akwụkwọ na- ebutekwara ha aha ọjọọ. Ha anaghị agụ akwụkwọ ọ bụla mana ha na- achọ ka e kponye ha akaraekponye. Ha na- ebute nnukwu ọgba aghara n’ ụlọ akwụkwọ na-alakwa ndụ na akụ na’ ụba n’ iyi ma ya chaju ha isi.
kwesiri ka gọọmenti tie ezigbo iwu iji gbochie otu nzuzo n’ ụlọakwụkwọ. Nne na nna kwesiri ina-enye ụmụ ha ezigbo ọzụzụ. Dị na nwunye ọ bụla kwesiri ịjịkọ obi ha ọnụ na-ebi n’ udo. Ọtụtụ n’ ime ụmụ akwụkwọ na-eso n’ otu nzuzo bụ ndị enweghi ezigbo ọzụzụ n’ ezinaụlọ. Ụfọdụ bụkwa ụmụ ndị nnukwu mmadụ bụ ndị mkpa ha abụghị ịzulite ụmụaka n’ ezi agwa, kama ọ bụ ịchụsọ akụ na ụba. O kwesiri ka mahadum ndị ọzọ ṅọmiri mahadum Naịjịrịa dị na Nsụkka. Onye isi ya bụ mahadum ugbu a batara nnọ wee mee ka ndị otu nzuzo nyụọ ka ọkụ. Gọọmenti kwesiri ime ya ka ọ bụrụ iwu na onye ọ bụla ejidere n’ otu nzuzo ka a tụọ ya nga mkpụrụ ọka.
E mee ihe ndi a, otu nzuzo ga-ebelata ma ọ bụ kwusi kpam kpam. Ka ụmụ akwụkwọ na ndị nkuzi wee kuru ume ndụ hapụ ịchị obi n’ aka.
10.5 NKỌWA OTU NZUZO
otu nzuzo bụ ọgbakọ ụfọdụ ndi mmadụ na enwe nke ebum n’ obi ha bụ ime ihe ọjọọ dị iche iche. Otu nzuzo bụ ajo otu ọ dị n’ ụdị n’ udị, e nwere ya n’ ụlọ akwụkwọ, n’ ụlọ ọrụ di iche iche, n’ ụlọ ụka na ọgbakọ ndị ọzọ dị iche iche.
ISI NKE IRI NA OTU
AKARA EDEMEDE (PUNCTUATION MARKS)
11.1 NKỌWA AKARA EDEMEDE
Akara edemede bụ akara dị iche iche a na-etinye n’ ihe e dere ede iji zipụta mkpọpụta, ụda, ọrụ na nghọta ya n’ ụzọ doro anya. Akara edemede bụ akara ndị ahụ anyi na-etinye n’ ahịrịokwu ka ha gosi ebe anyị kuru ume, ebe anyi jụrụ ajụjụ, ebe anyi tiri mkpu.dgz. itinye akara edemede dịka ha kwesiri dị nnukwu mkpa iji mee ka ghara inwe nghọtahie n’ ihe edere.
11.2 ỤDI AKARA EDEMEDE DI ICHE ICHE
|
Akara edemede |
Aha Igbo ha |
Aha bekee ha |
|
. |
Kpọm |
Full stop |
|
, |
Rikọm |
Comma |
|
: |
Kpọm kpọm |
Colon |
|
; |
Kpọmrịkọm |
Semicolon |
|
? |
Akara ajụjụ |
Question mark |
|
! |
Akara mkpu |
Exclamation mark |
|
n' |
Rịkọm elu |
Apostrophe |
|
- |
Akara uhie |
Hyphen |
|
“ ” |
Rịkọm ngwu |
Quotation mark |
|
( ) |
Akara mgbodo |
Bracket |
|
/ / ____ |
Akara udaolu |
Tone mark |
|
… |
Akara nkwubiri |
Ellipsis |
|
ᴧ |
Akara mmagba |
Omission
|
11.3 NKỌWA ỤDỊ AKARA EDEMEDE Dḷ ICHE ICHE
A. KPOM [ .]
Kpọm bụ ntụpọ a na-etinye iji gosi nkwusi ahịrịokwu nke na-abụghị mkpu ma ọ bụ ajụjụ.
Ọmụmaatụ:
1. Nkechi jere ahịa.
2. Mmadụka riri nri.
3. Mmiri na-ezo n’ udu mmiri.
4. Nne m mara mma.
5. Ahụ m bụ obi.
A na- etinyekwa kpọm n’ aha mkpirisi ma ọ bụ iji gosi okwu a na- ederughị n’ isi.
Ọmụmaatụ:
i. Mz. (maazị)
ii. N.A. Nwafọr
iii. W.A.E.C = West African Examination Council
iv. dgz. = dịrị gawazie
v. ork = Oriakụ
vi. G.C.E = General Certificate Examination
vii. Rv. = Reverend
B. RỊKỌM [,]
Rịkọm bụ akara edemede eji gosi nkuru ume tupu ekwutọpụ ihe a na-ekwu.
Ọmụmaatụ:
i. Adakụ zụtara ji, ede, mmanụ, nnu na azụ, mgbe o jere ahịa.
ii. Ha gakatara ije, gbawa ọsọ.
iii. Anyi gara ahia, ma anyi ahụghị nnu ka anyị ji ahụ ose.
iv. Ọ gbagidoro ọsọ, o wee daa.
v. E ruo ọnịcha, a ga-ahụ osimiri Naija.
Ch. KPỌM KPỌM[:]
E ji kpọmrịkọm egosi ebe okuku ume toturu eto, ebe a jịkọrọ usoro okwu dị iche iche, ndi na-ekwụ maka otu ihe na ndị gaara ịbụ ahịrịokwu nọọrọ onwe ha iche iche ma a bịa zia jikọta ha ọnụ.
Ọmụmaatụ:
i. Ọ zụtara ihe ndị a: akara, agidi, azụ na ogili.
ii. Nke a bụ ndi so ya bia: mmadụka, Nkechi na Onyinye.
iii. O nyere onyinye dị iche dịka: moto, ego na akwa.
iv. Ụbọchi ahụ aṅụri ekwughị onye ọ bụla rie nri: Ụmụ akwụkwọ anyị niile gafere n’ ule Igbo.
v. Ndị gara ahia bụ ndị a: Mmesọma, Ndidi, na Nneameka.
D. KPỌMRỊKỌM [;]
Nke a na-ekewa ahịrịokwu abụọ zuru ezu ma ha enweghị njiko n’ etiti ha.
Ọmụmaatụ:
i. Onyinye mụrụ nwa; nwoke ka ọ mụrụ.
ii. Nkechi zara ụlọ; ọ chọrọ ihi ụra
iii. Nne ya were iwe; narakwa ya ihe ya.
iv. A hụ kwghịị na-egbu okenye; e kwuo a nụghịị na-egbu nwata.
v. Ahụ adịghị ya; ọ gawala ụlọ ọgwụ.
E. AKARA AJỤJỤ [?]
Akara ajụjụ bụ akaraedemede eji akara ajụjụ egosi nkwusi ebe a jụrụ ajụjụ
Ọmụmaatụ:
i. Gini bụ aha gị?
ii. Kedụ ka ịmere?
iii. Chisom ọ nọ n’ ụlọ?
iv. Mmadụ ole biara?
v. Gịnị na-eme gị?
F. AKARA MKPU [!]
A na-etinye akara mkpu iji gosi ihe eji iti mkpu kwụpụta dị ka okwu dapụtara mmadụ n’ ọnụ na mberede site n’ ihe mere n’ ike, na mwute, n’ ujo maọbụ na nkuja.
Ọmụmaatụ:
i. Hia! Ọkụ anyụọ.
ii. Chei! Ọnwu dị egwu.
iii. Onyinye o!
iv. Chimu o o o!
v. Hey! Were nwayọọ.
G. RỊKỌM ELU [n’]
Rịkọm elu dị ụzọ abụọ. Nke mbu bụ nke eji ezipụta mbuụzo.
Ọmụmaatụ
i. Ewu nọ n’ elu ụlọ.
ii. Nkechi bi n’ aba.
iii. Ụlọ ha dị n’ ahia.
iv. Jisọs gara ije n’ elu mmiri.
v. Uwe m dị n’ ime akpati.
Nke abụọ bụ nke eji ezipụta mgbochiume dị ka
i. Azụ dị na mmiri.
ii. Ngozi bị na legosi.
iii. Ụkwụ ya kụtụrụ na bọọlụ.
iv. Uwe m dabara na mmiri.
v. Amaka bi na Nnewi.
GB. AKARA UHIE [-]
Akara uhie na-apụtakari n’ ahịrịokwu oge ọ na- arụ ọrụ dị ka nyemakangwaa.
Ọmụmaatụ:
i. Ada na-azụ ụlọ.
ii. Nwata ahụ ka ga – eje ije.
iii. Uchenna ga – esi ofe echi.
iv. Nwanne m na – asụ ede.
v. Onye isi ụlọ m na – ede ihe n’ akwụkwọ.
ISI NKE IRI NA ABỤỌ
EJIJE ỌDḷNAALA
12.1 NKỌWA EJIJE ỌDḷNAALA
Ejije ọdịnaala bụ ijije mmadụ maọ bụ anụ ọhịa n’ ụzọ ime ka ndị na-ele anya chịa ọchị n’ ụzọ dị iche iche dị ka n’ oge mgba ọdịnaala, egwu agha, Egwu ọnwa, egwu mmawu, egwuregwu ntọaja. Ejije ndị ahụ nke a n’ edeghị ede wee na-eme ya.
Ọtụtụ oge mgbe ndị nne na nna anọghị nso, ụmụaka na-ejije ha ma ọ bụ anụ ọhịa, ụgbọ elu, ụgbọala, ndị mmụọ dịka ha nụtara site n’ akụkọ ifo.
12.2 NKENỤỤDỊ EJIJE ỌDḷNAALA
Enwere ụdị ejije ọdịnaala dị iche iche
i. Ejije mgba ọdịnaala.
ii. Ejije Egwu ọnwa.
iii. Egwu mmanwu.
iv. Egwu ntọaja.
v. Egwu Agha.
A. EJIJE MGBA ỌDINAALA
Ọ bụ egwuregwu dị bụ tupu ndị ọcha azọta ụkwụ ha n’ ala igbo. Eji ya eme ndị mmadụ obi ụtọ. Ụmụ okorobia na agbọghọ ji mgba ọdinaala anwale ike ha. N’ oge ochie, kama mba na mba ga-alu agha ma ọ bụ ọgụ, ndị ichie na-ahaziri ha egwuregwu mgba ọdinaala. N’ ebe ụfọdụ, ọ na-abụ oge ọkọchị mgbe a kọcharala ji. N’ ebe ụfọdụ eji eri ji ọhụụ. Etu osi dị mkpa mere na eji akwara ya ngwongwo egwu dị iche iche dịka udu, ọyọ, ekere, ogene, ekwe, ekpete na ndị ọzọ. Ebe ụfọdụ, ndị mmadụ na-eji ọgwụ agha mgba ọdinaala nke a kpọrọ “azueruala”. Ndị ụfọdụ haziri nke ha n’ụzọ e buru mgba jee obodo nke a, n’ afọ ọzọ e bụrụ ya jee na nke ọzọ. Ọtụtụ okamgba ji ya eriju afọ n’ oge ahụ, site n’ onyinye dị iche iche ndị mmadụ na-enya ha. Ọ na-abụ anụrị oge ọtụtụ ụmụ, okorobịa sitere n’ otu obodo nwere mmasi n’ asọmpi mgba ọdịnaala, ọ na-abụkwa ihe ihere nye ndi e meriri emeri.
B. EGWU AGHA
Egwu Agha sọ bụrụ ejije ọdịnaala maka na o si n’ aka feta n’ aka ndị nọ ndụ ugbua. Agha mba na mba adịkwaghi ugbua, kama a na-echeta nke a lụrụ alụ ọtụtụ afọ gara aga. Eji akụkọ akụziri ụmụ aka otu esi alụ agha na egwu agha. Ndị na-akụ egwu agha bụ ndị na-eji egwu kpolie mmụọ ndị na-aga agha. N’ akụkụ ọhafia n’ oge ochie, okoro egbuteghị isi agaghị alọtakwa n’ obodo ya. Ndị ebiri ya ga na-akpọ ya ụjọ. Ọ gakwaghị esi nyere ha ime ọtụtụ ihe ha na-eme. Onye ọzọ nwere ike inapụ ya nwunye ya.
CH. EJIJE EGWU ỌNWA
Ejije egwu ọnwa bụ nke kacha ibe ya maka ọnwa n’ oge ọkọchi na-enye ohere ịmụ ọtụtụ egwu dị iche iche ma ndị a kpachapụrụ anya na-akuzi ma ndị a na-akpachapụghị anya kuzie. Ọ bụ oge ọnwa na-agba ka ụmụaka na-enwekari ohere ijeje ndị mụrụ n’ ụzọ ọ bụla o metụrụ ha n’ obi. Ụmụaka ụfọdụ na-ejije ndị ọrụ aka dị iche iche etu ha si arụ na ihe ha na-eme. Ha na-ejije ndị nchuaju ọdịnaala. Ọ bụkwa oge a ọnwa na-eti ka ha na-amụ igba mgba ọdịnaala. N’ ebe ụfọdụ, ndị okenye na-abịa kwa anyasi ilebo ụmụaka na ihe ha na-eme. Ndị nne na-apụtakwa ihụta ihe aghọghọ ha diiri ha. Ebe ụfọdụ, ụmụaka na-apụta kwa afọ bịa jijee ndị lụrụ ọgụ, ndi sere okwu, ndị dị na nwunye ha, nwunye dị na ibe ya. Ha niile bụcha ejije nke ndị mmadụ ji amata na ihe niile na-eme n’ obodo, ụmụaka na-elebakwa ha anya. Ndị okenye na-akwado ha maka na ha ji ụdị ihe akwusi ihe ojoo n’ obodo ha.
D. EGWU MMANWỤ
Oge ọ bụla a na-eti egwu mmanwụ, ọ bụ ndị mmụọ ka a na-ejije site etu e chere ha si eje ije, ekwu okwu na oname ndị ọzọ. Ọ bụ n’ ụdị ejije ka ndị igbo si egosi n’ ezie na ndị mmadụ na ndị mmụọ nwekwere ụzọ ha si enwe mmekọ. Ọ bụ eziokwu na anaghị ahụ mmụọ anya, ya mere eji emechicha akụkụ ahụ mmanwụ. Ike anaghị, agwụkwa ndị mmụọ o bụkwa ya mere mmanwụ anaghị anọ otu ebe tutu chi ejie oge ọ ga-ala.
Enwere ndị mmanwụ dị iche iche dị ka enwere na mmadu. Ụfọdụ bụ ndi na-akpa ike gọọ, ebe ụfọdụ biara ime ka ndị mmadụ nuri a ọnụ. Ihe gbasara mmanwụ n’ ebe dị ka Aro Ndị zuọgụ, ọ bụ ihe siri ike nke ejikwa ejide obodo. Ụfọdụ na-eti ndi mmadụ ihe, ebe ndị ọzọ na-ete egwu. Ụfọdụ na-ejije ụmụ mmadụ dịka ndinyom. Ọ dị nke a na-akpọ nwanyi afọ ime. Ọ na-eme dị ka Nwanyị.
E. EJIJE NTỌAJA
Ejije Ntọaja nke metụtara ofufe chi dị iche iche na chukwu okike kere ụwa. Ebe o si n’ aka nna feta n’ aka nwa ya, ọ bụ ejije nwa jijere nna ya mere o jiri mụta ya make ikuziri ụmụ nke ya. Enwere ike ọ dịghị onye kụziri ya. Onye kụziri nwa ya ihe dị na nwunye na-arụ n’ oge anyasi? Ọ bụrụ ịgo oji , ịgo ọfọ, igba afa, ụmụ aka na-anọ nso mee anya ka ha anaghi ahụ ma ọ bụ ha anaghi ahụ ihe a na-eme. Ozugbo ndị okenye mechara ihe dịịrị ha, ụmụ ha anọchie mewe ya. Oge ụfọdụ ihe I ga-anụ bụ ọ bụghị otu aka o si eme ya, ekwu ya, edebeolu. Ya bụ na anya na-eru ụmụaka ala hie nne n’ihe ọ bụla metụtara mụọ ha, ọ bụrụ na izo onwe gi ezo hu ihe ha na-eme, ihe ha na-akwu, oge ụfọdụ isi ga-ebu gi. E wepu ejije n’ ihe niile mmụta agaghị adị.
ISI NKE IRI NA ATỌ
ỊGỤ OGE (TIME)
13.1 NKỌWA IHE BỤ ỊGỤ OGE
Ịgụ oge bụ usoro ndị mmadụ ji agwa ibe ha mgba ha chọrọ ime ihe dịka mgbe ha chọrọ ije be mmadụ, mgbe ha chọrọ ije ọrụ na mgbe ha chọrọ ime ihe ndị ọzọ. dgz
13.2 ETU NDḷ IGBO SI AGỤ OGE MGBE GBOO
Ha ji ihe ndị a amata oge.
i. Aka ọrụ: Ha na-eji aka ọrụ ndị ụfọdụ dịka ndị ọkụ azụ, ndi na-ete nkwu were ekwu oge.
ii. Ahịa: Ụfọdụ na-asi, “Bịa ma uje ahịa gbabie maọbụ ahịa lawa”.
iii. Oke okụkọ: Ụfọdụ na-asị, “Bịa ma oke akụkọ kwaa akwa mbu” ụfọdụ asị “Bia ma ọkụkọ Labasia ụra”.
iv. Anyanwụ: Ụfọdụ na-asi “Bịa ma anyanwụ gbajụọ igwe maọ bụ ọ ma onyinyo nọrọ n’ ọbọ ụkwụ.
13.3 IGU OGE ELEKERE
Ụfọdụ okwu ndị metụtara ọgụgụ oge ndị igbo bụ ndị a:
|
Okwu gbasi ara ya |
Related words |
|
Oge |
Time |
|
Awa |
Hour |
|
Elekere |
O’clock |
|
Nkeji |
Minute |
|
Izu |
Four days |
|
Izu asaa |
One month |
|
Afọ |
Year |
|
Ntabinaya |
Second |
|
Ụtụtụ |
Morning |
|
Ehihie |
Afternoon |
|
Ọfọduru |
To |
|
Ojirila |
After |
|
Mgbede |
Evening |
|
Ụbọchi |
Day |
|
Izuụka |
A week |
|
Onwa |
Month |
|
Ọkara |
Half |
|
Taa |
Today |
|
Ugbua |
Now |
|
Ụnyaahụ |
Yesterday |
|
Echi |
Tomorrow |
|
Abalị |
Night |
13.4 ỊGỤ OGE ỤBỌCHỊ
A. Ndị igbo nwere ahịa anọ ha na-azụ n’ ala igbo. Ahịa ndi a bụ:
i. Nkwọ
ii. Eke
iii. Ọrie
iv. Afọ
Ha jikwa ahịa ndị a agụ oge. Mmadụ nwere ike si gi, “Bịa be m ụbọchị Nkwọ na-abịa, eke gaa Eke, taa bụ atọ maọbụ echi”.
B. ḷgụ oge izu asaa
Izu asaa dị mkpa na ndu igbo niile. Ya bụ:
Sonde
Monde
Tuuzdee
Wenezdee
Tọọzdee
Fridee
Satọdee
Ch. Ọnwa ole dị n’ afọ. Ha bụ ndị a:
Janụari
Febrụari
Maachị
Aprel
Mee
Junu
Julani
Ọgọọstu
Septemba
Ọktoba
Nọvemba
Disemba
ISI NKE IRI NA ANO
JENDA (NWOKE NA NWAANYI)
14.1 NKỌWA JENDA (GENDER)
Jenda bụ katịgọrị ụtọasụsụ nke na-egosi ma ihe ọ bụ oke ka ọ bụ nwunye. N’ asụsụ igbo, okwu ụfọdụ na-egosi kpọmkwem na ihe bụ oke ma ọbụ na ha bụ nwunye dịka okwu ndị a:
ISI NKE IRI NA ISE
ỌMỤNKWU
15.1 NKỌWA ỌMỤNKWU
Ọmụ nkwu bụ igụ ahụ akaghị aka n’ adị n’ etiti osisi nkwu. Ọ na-adị abụọ too wara wara. Ọ naghị agbasa agbasa ka ịgụ ndị kara aka. Ọ na-acha edo edo. Ọmụ nkwu bara ọtụtụ ụrụ.
Ọmụ bu osisi nsọ ndị igbo. Ebe ọ bụla e tinyere ọmụ nwere ihe o na-egosi
15.2 URU ỌMỤNKWU BARA
1. Ọmụ ka ana-akpụ n’ ọnụ ele ogwu. Eji ọmụ nkwu ebu ọgwụ.
2. A na-etinye ọmụ iji gosipụta ozu.
3. Eji ya-ekechi ọtụtụ ihe dị ka: ogiri, azụ, akwụkwọ nri, ụgba, nkụ na ihe ndị ọzọ.
4. Eji ya aka ụka ọmụ.
5. Eji efekwa arụsị.
6. A na-etinye ọmụ nkwu n’ ala a na-azọ azọ.
7. A na-eji y egechi ili ozu okenye nwụrụ anwụ.
8. E ji ya egosi ebe ihe dị egwu dị ma ọ bụ mere.
9. Eji ya akwa ụgbọ aja.
10. Eji ya agbaba ihe iyi, dị ka osisi umi dị iche iche, oge ụfọdụ ụmụaka gaa n’ ezu mkpụrụosisi ndị mmadụ n’ ohi, ndị nwe ya na-aga tinye ọmụ nkwu na ya.
ISI NKE IRI NA ỊSỊỊ
ỊDỊ ỌCHA NKE ONWE
16.1 NKỌWA ỊDỊ ỌCHA NKE ONWE
Ịdị ọcha nke onwe bụ mmadụ idebe onwe ya ọcha oge niile dịka uwe, eze, ntụtụ isi na ndị ọzọ dị iche iche. Ịdị ọcha nke onwe dị nnukwu mkpa na ndụ mmadụ.
Idị Ọcha n’ụlọ nke onwe na- ebe ụmụakwụkwọ nọ ndị oke mkpa. Ụmụakwụkwọ ọ bụla kwesiri ndị ọcha n’ ụlọ akwụkwọ dị ka isa eze, ịsụ akwa akwụkwọ ya, ikpu isi ha, na isa ahụ ọ bula. Onye ọ bụla na-eru unyi na- anwụ ọnwa ọsọọsọ.
16.2 IHE NDḷ EJI EDOBE ONWE ANYI ỌCHA
Ụfọdụ ihe ndị eji edobe onwe anyi ọcha bụ ndị a:
i. Mmiri
ii. Ncha
iii. Ogbo
iv. Aguba
v. Nha
vi. Ude
vii. Buroshi
viii. Nhicha onụ
ix. Atụ
x. Omo w.d.z.g
16.3 OTU ESI EDOBE ONWE ANYỊ ỌCHA
1. Ọ dị mkpa bụ ịkụchasi ntụtụ na-aji n’ime ahụ oge niile.
2. Anyị ga na-akpụcha mbọ aka na mbọ ụkwụ anyi ọge niile.
3. Anyị ga- agba mbọ na- asa eze anyị ugboro abụọ n’ụbọchị ụtụtụ na abalị anyị chọọ ilaba ụra.
4. Anyị tosịrị ịdị na –asu akwa ime ukwu anyị oge ọ bụla anyị yipụrụ ya. Ọ na- adịkwa mma iji mmiri ọkụ banye ya opekata mpe otu ugboro n’ọnwa.
5. Ọ dị mma bụ ịdị na- ete ezigbo ude na-ekpo ikpo ọma.
6. Ọ bụrụ na anyị kwado ịpụ apụ, anyị ga- ewere mbọ isi bọọ isi anyi nke ọma.
7. ụmụ aka ga na-akwọ aka ma ha lọta akwụkwọ ma ọ bụ ha gwuchaa egwuregwu tupu ha erie nri.
8. Anyị sụchaa akwa, anyị ga- agba mbọ dee ya edee. w.d.z.g.
ISI NKE IRI NA ASAA
TENSI (TENSE)
17.1 NKỌWA TENSI.
Tensi bụ katigọrị ụtọasụsụ a na- enwe na ngwaa nke na- egosi oge ihe jiri mee. N’Ọmụmaatụ tensi dị iche iche a aga- enye ebe a, a ga- ezipụta ha mgbe ha bụ nkwe(positive)na mgbe ha bụ njụ (negative).
17.2 ỤDỊ TENSI DỊ ICHE ICHE
A. TENSI NDỊUGBUA: Nke a bụ tensi eji ezipụta ihe na- eme ugbu a. mgbe ihe a na-ekwu maka ya na- eme ugbu a, na- agawanye, a na- eji nnyemakangwaa “na” ezipụta ya.
Ọmụmaatụ:
|
|
NKWE |
NJU |
|
I |
Anyị na-eme igbo |
Anyị anaghị eme igbo |
|
Ii |
Ada na- egwu egwu |
Ada anaghị egwu egwu |
|
Iii |
Ngozi na- ehi ụra |
Ngozi anaghị ehi ụra |
|
Iv |
Uche na- akọ akụkọ |
Uche anaghị akọ akụkọ |
B. TENSI NDỊNAAZỤ: Nke a bụ tensi eji ezipụta ihe mere n’’oge dị n’azụ ma ọ bụ n’oge gaworo aga. A na- ezipụta tensi ndịnaazụ site n’igbakwunye “r” nke ụdaume na-eso n’isingwaa.
Ọmụmaatụ:
|
|
Nkwe |
Nju |
|
I |
O jere ahia |
O jeghị ahia |
|
Ii |
Ha depụtara ahaha |
Ha edepụtaghị aha ha |
|
Iii |
Ada mụrụ nwa |
Ada amụghị nwa |
|
Iv |
Nkechi zara ezi |
Nkechia zaghị ezi |
|
V |
Nke m kụrụ aka |
Nkem akụghị aka |
CH. TENSI NDỊNIIHU: Nke a bụ tensi e ji egosi ihe ga- eme n’ọdịniihu. Ihe e ji ezipụta ya bụ nnyemakangwaa “ga”.
Ọmụmaatụ:
|
|
Nkwe |
Nju |
|
I |
Ha ga-esi nri |
Ha agaghị esi nri |
|
Ii |
Anyi ga-ezu ike |
Anyi agaghị ezu nke |
|
Iii |
Anyi ga- aga ụlọ ụka |
Anyi agaghi ụlọ ụka |
|
Iv |
Nkechi ga- egwu egwu |
Nkechi agaghi egwu egwu |
ISI NKE IRI NA ASATỌ
IME NDUZI NA NTỤZḷAKA MFE
(CARDINAL POINTS)
I lee anya n’ihe esere di n’elu, ịga ahụ ụzọ anọ e kewara obodo anyi bụ Naịjịrịa. E nwere ndị bi n’ugwu, nwee ndị bi na ndida, n’ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.
18.2 NKỌWA NDỊ BI N’UGWU: Ihe a na- akpọ ndị bi n’ugwu bụ ndị awụsa. Ha bigoro ebigoro. Iji gosi na ha bi n’ugwu eziokwu, ịgaa n’akụkụ ala ebe ahụ, mmiri anaghị ezoro ha dị ka otu osi ezoro ndị, bi n’ndida, ọwụwa na ọdịda anyanwụ. Ha na- enwe ala ọkpọ nkụ, oke anwụ na- akpọ na mgbago ugwu ebe ahụ. Ndị ugwu awusa na- akọta agwa, tomatoes, ose, yabasi, ha na- azụkwa ehi na anụmanụ ndị ọzọ. Ihe eji amata ha bụ na eze ha na- aja gworo. Ha na- eji oji gworo emere atụ. Ụfọdụ bụ ndị awusa, Fulani na- adọwa akụkụ ọnụ ha adọwa. Ejikwa ekike ha mara ha. Ha na- eyi kara danchiki.
18.3 NDỊ BI N’ỌWỤWA ANYANWỤ: Ọ bụ ndị igbo bi n’ ọwụwa anyanwụ mba Naijiria. Ha bụ ndi oke amamiihe. Mmiri na-ezoro ha nke ọma, nke a mere ha ji akọta akpụ, ji na ede. Ndị igbo bụ ndị na-agba mbo a na-ahu ya n’ anya. A ga-asi na ọ bụ ha nwere ego karichaa agburu ndị ọzọ. Abịa na-azụm ahịa ha nọ ya. Ndị igbo nwere ọtụtụ osisi na-ami mkpụrụ dị ka ube, udara, mangoro, akioyibo, oroma na ndi ọzọ, chineke jikwa ọtụtụ nri gozie ha dị ka akpụ, ede, ji, osikapa, agwa, ụkwa, na ona. w.d.z.g. Ejikwa ekike ha dị ka ụmụ nwoke otu ukwu akwa na efe isiagụ, ụmụ nwaanyi, ukwu akwa abụọ na elu efe mara ha. Ọtụtụ ndị igbo n’ oge mgbe ochie na-ekpere arụsị mana n’ oge ugbua, ha na-ekpeziri chineke dị ndu.
18.4 NDỊ BI NA ỌDỊDA ANYANWỤ: Ọ bụ ndi Yoruba bi n’ ọdịda anyanwụ. Ha na-enwe mmiri ozuzo dịka ndị bi n’ ọwụwa anyanwụ. Ha bụ ndị ala mmiri, ọ bụrụ n’ ala ha dị iri, mmiri sachiri asatọ n’ ime ha. Amaghị ha dị ka ndi na-agba mbọ. Ọ bụ ụmụnwaanyi ha na-achụta ihe ụmụnwoke ha na-eri ọtụtụ ụmụnwoke ha na-adị ume ngwu, chifo n’ ụtụtụ ha anọdụ ala n’ ụlọ ụmụnwaanyi apụọ ichụnta ihe ezinaụlọ ha ga-eri. Nri ha na-ejupụta na ose na mmanụ, ọ bụ nke a mere eji akpọ ha ndi “OFE OSE” ma ọ bụ ndị “OFE MMANU”. Eji iyi akwa buba were mara ha.
18.5 NDḷ BI NA NDIDA: Ndi a bụ ndi n’ etiti. Ha bụ ndị akụkụ Edo, Tivi, Bini na ndị ọzọ. Ndị akụkụ ahụ na-akụkarị azụ, ụfọdụ na-akọtakwaji ọnụ ha. A ga-asị na ha bụ ndị ejim guzuru. Ụfọdụ n’ ime ha na-akpọ isiala na ekakwa ekike ndị isiala. Chineke gosikwara ha n’ ụdị nke ha. Ihe ejirimara ha bụ na ha na-adọwakarị ihụ. w.d.z.g.
ISI NKE IRI NA ITOOLU
ỌNỤỌGỤGỤ
19.1 ỌNỤỌGỤGỤ (5000 – 1,000,000)
Ọnụọgụgụ bụ usoro ọgụgụ n’ igbo.
Omaaatu:
|
1001 |
Otu puku na otu |
|
2000 |
Puku abụọ |
|
2001 |
Puku abụọ na otu |
|
3000 |
Puku atọ |
|
3001 |
Puku atọ na otu |
|
4000 |
Puku ano |
|
4001 |
Puku ano na otu |
|
5000 |
Puku ise |
|
5001 |
Puku ise na otu |
|
6000 |
Puku ịsịị |
|
6001 |
Puku ịsịị na otu |
|
7000 |
Puku asaa |
|
7001 |
Puku asaa na otu |
|
8000 |
Puku asatọ |
|
8001 |
Puku asatọ na otu |
|
9000 |
Puku itoolu |
|
9001 |
Puku itoolu na otu |
|
9999 |
Puku itoolu, nari itoolu, iri itoolu, na itoolu |
|
100,000 |
Otu puku nari |
|
100,001 |
Otu puku nari na otu |
|
100,010 |
Otu puku nari na iri |
|
100,020 |
Otu puku nari na iri abụọ |
|
200,000 |
Nari puku abụọ |
|
300,000 |
Nari puku atọ |
|
400,000 |
Nari puku anọ |
|
500,000 |
Nari puku ise |
|
600,000 |
Nari puku ịsịị |
|
700,000 |
Nari puku asaa |
|
800,000 |
Nari puku asatọ |
|
900,000 |
Nari puku itoolu |
|
1,000,000 |
Otu nde |
ISI NKE IRI ABỤỌ
ABỤ NKỌCHA, OTITO NA IHỤNANYA
20.1 NKỌWA ABU
Abụ bụ unere ndi igbo ji ekwe okwu. Ndị igbo na-eji abụ maka ọnọ dụ dị iche iche. Ndi igbo na-eji abụ egosipụta obi ụtọ. Obi aṅụri ma ọ bụ nwute ha nwere.
20.2 ỤDỊ ABỤ DỊ ICHE ICHE
i. Abụ nkọcha
ii. Abụ otito
iii. Abụ ihụnanya
iv. Abụ nwa
v. Abụ agha
vi. Abụ ọrụ
A. ABỤ NKỌCHA: Abụ a bụ eji akọcha mmadụ ma ọ bụ ihe ọjọọ. Ọ bụ aka eji akọcha ajọ agwa mmadụ na-akpa iji mee ka ọghanwe agwa ya adịghị mma.
Ọmụmaatụ:
Nwaanyị di ya hụrụ n’ anya onye ụjọ ọrụ ebute akpa osikpa orichaa onye ụjọ ọrụ ebute akpụ olochaa onye ụjọ ọrụ. Nwaanyị bi a rụọ oo anaghị m arụ oo, na di m hụrụ m n’ anya onye ụjọ ọrụ
B. ABỤ OTITO: Abụ otito bụ abụ a na-eji eto chineke. Enwekwara ike iji ya too mmadụ ma ọ bụ ihe chineke kere. A na-ejikarị abụ otito eto aka ọrụ chineke.
Ọmụmaatụ:
Otito diri chineke.
Otito diri Nwa ya.
Otito diri mmuo Nso.
Onye na-eme mma.
Otito dịrị chineke.
Otito dịrị Nwa ya.
Otito dịrị afọ ọma ya
Onye enyere anyị ndụ taa.
CH. ABỤ ỊHỤNANYA: Abụ ịhụnanya bụ abụ anyị na-abụrụ onye anyị ḷhụnanya. O nwere ike bụrụ nwọke, nwaanyị ma ọ bụ ụmụaka.
Ọmụmaatụ:
Onye ọma mụ bụ n’ obi.
E cheta obi abị ụtọ.
E dobe ego ego dobe gị.
Ahara m gi ghara ego.
Bia daam obi.
D. ABỤ NWA: Nke a bụ abụ a na-abụri ụmụaka mgbe ha na-ebe akwa iji mee ka ha mechie ọnụ. O nwere ike bụrụ ka mmadụ gosipụta ọnwụ nwa.
Ọmụmaatụ:
Onye mere nwa n’ ebe akwa.
Egbe mere nwa n’ ebe akwa.
Weta uziza, weta ose.
Weta amala gere nge ofe.
Ka ụmụ nnụnụ Lachaa ya.
Egbe oo, Egbe oo.
D. ABỤ AGHA: Abụ agha bụ abụ a na-abụ mgbe a na-eji agha.
Ọmụmaatụ:
Nzogbu …………. Enyi mba enyi.
Nzogbu …………. Enyi mba enyi.
Zogbuo tigbuo …….. Enyi mba nyi.
Zugbuo nwoke …….. Enyi mba enyi.
Zugbuo nwaanyi …… Enyi mba enyi.
E. ABỤ ORỤ: Nke a bụ eji arụ ọrụ.
Ọmụmaatụ:
Nwa nṅụnụ nwa nṅụnụ nta.
Tụrụzanza, Tụrụnza.
Ị nọ nga ahụ eme gini?
Tụrụzanza, Tụrụnza.
A nam atụrụ nne m ose.
Tụrụzanza, Tụrụnza.
A nam atụrụ nna m ose
Tụrụzanza, Tụrụnza.
Tụụ Tụụo
Tụrụzanza, Tụrụnza.
ISI NKE IRI ABỤỌ NA OTU
ỌGỤGỤ NA AGHỌTAAZAA
21.1 NKỌWA IHE BỤ AGHỌTAAZAA
Aghọtaaza bụ edemede na ajụjụ na-eso ya a na-ajụ. E dechaa edemede a, nke nwere ike bụrụ akụkọ, leta ma ọ bụ edemede nkiti, a jụọ ajụjụ. Ọgụụ ga-aza ajụjụ ndi a.
Tupu anyi azata ajụjụ aghọtaazaa nke ọma, o kwesiri ka anyi bụrụ ihe ndị a n’ obi:
1. Anyị ga-agụ edemede ahụ ugboro ugboro, nke ọma.
2. Ọ ga-edo anyị na anyị ghọtara ihe edemede ahụ na-akọ maka ya.
3. Anyị ga-agụkwa ajụjụ ndi ahụ a jụrụ hụkwa na anyi ghọtara ihe a chọrọ ka anyi zaa.
4. Anyị ga-aghọta na oge enyere maka nọmba aghọtaazaa anaghị ebu ibu (n’ ule). Ya bụ na anyị ga-abụ ndị na-agụ agụmagụ ngwa ngwa.
5. Anyị bido ịza ajụjụ anyị kwesiri iwere okwu aka anyị na-aza ajụjụ a jụrụ. Ọ naghị akacha mma i na-akọpịrị naanị ahịrịokwu nke odee jịrị dee edemede ya. Anyị were okwu aka anyị, ọ na-egosi na anyị ghọọtara edemede ahụ ọ bụkwanụ ya bụ aghọtaazaa.
21.2 NWALE AGHỌTAAZAA
Gụọ ederede a tupu ị zazia ajụjụ maka ya.
Ọkụkọ bụ anụ ụlọ, nri ọ na-erịkari bụ mkpụrụ ọka. Ọkụkọ na-ewu anaghị anọ n’ otu ụlọ. Ọ dịghị ebi n’ ọhịa. Ọ dịka nnụnụ mana ọ bụrụ ibu kakwa nnụnụ. Ọkụkọ nwere nku abụọ na ụkwụ abụọ. Ọkụkọ na-eyi ọtụtụ akwa.
Ọ na-ekpugide akwa ya ruo mgbe ụmụ ya ga-apụta. Ọ kpọrọ ha pụọ ọ na-achọtara ha nri. Mgbe ụmụ ya toro, ndi nke nwunye ya. Ndị nke bụ oke (Oke okpa) ga-amalite ikwa akwa. Okokorokoo ọkụkọ na-anyụ nsi ebe ọ bụla masiri ya.
AJỤJỤ NWALE
1. Isiokwu edemede a bụ __________ A. akwa B. ọkụkọ Ch. nri akpụ D. anụ ọkụkọ
2. Olee ebe ka ọkụkọ na-ebi A. n’ Ọhịa B. n’ ezi Ch. n’ ụlọ D. n’ elu osisi
3. Akwa ole ka ọkụkọ pụrụ iyi? A. akwa nri B. ọtụtụ akwa Ch. akwa anọ D. akwa ise
4. Nne ọkụkọ na-eyi akwa ebe oke okpa A. na-ata ji B. na-ekpugide akwa ya Ch. na-achuta nri D. na-akwa okorokoo
5. Gịnị bụ nri ọkụkọ na-eri na akụkọ a? A. abacha B. gari Ch. mkpụrụọka D. oroma
6. Ọkụkọ na-anyu ______ ebe o bula A. nsi B. akwa Ch. anụ D. akpi
7. Mejuputa ọkụkọ __________ mkpụrụọka na mkpụrụ osikpa A. na-asa B. na-eri Ch. na-ata D. na-ezu
ISI NKE IRI ABỤỌ NA ABỤỌ
MBEM
22.1 NKỌWA MBEM
Mbem bụ abụ kpom kwem. E tere azụ, etere anụ. Ihe eji agụ mbem bụ ọnụ. A na-ahụta ya na stanza na stanza dị ka abụ ndị ọzọ. Otu abụ nwere usoro doro anya eji agụ ya/ha ma n’ ebe mbem dị, ọgụụ na-ewebata echiche nke ya maka otu osi metụta mmụọ ya. Ọ dịghị iwu jigidere ya ịgụ dị ka ihe/isiokwu siri kpalie mmụọ ya.
22.2 NKENỤỤDI YA:
Mbe nwere ụdị dị iche ma e were anya ọkpa ji ele ihe nke ọma. Nke ọ bụla nwere ihe dịtu iche ọ na-arụ.
i. mbem ifo
ii. mbem otito
iii. mbem ikpe
iv. mbem arịrị
v. mbem nwata
vi. mbem ntọaja
vii. mbem ọha
viii. mbem ọrụ
ix. mbem ihunanya
x. mbem echichi
xi. mbem agha
xii. mbem okike
A. MBEM IFO: Akụkọ ifo na-enwakari mbem na-eso ya. Oge ụfọdụ ọ ka mma ikpọ ya akụkọnegwu.
Ọmụmaatụ:
Nwa nnụnụ mmiri
Tụrụjam
Ya ga n’ sis iyi
Tụrụjam
Ya tụrụ mmiri
Tụrụjam
Ya ga ndida iyi
Tụrụjam
Ya tụrụ mmiri
Tụrụjam
Ya tụrụjam
Iyi taa
Tụrụjam
Nwa nnụnụ alaa
Tụrụjam
Iyi lọọ
Tụrụjam
Nwa nnụnụ alọta
Tụrụjam
B. MBEM OTITO: Mbem otito dị ka aha ya siri dị bụ mbem eji eto ọbasi dị n’ elu, mmụọ na mmadụ. Onye ọ bụla ihe na-eto ọbasi dị n’ elu oge o mere ya ihe ọma. O nwere ike bụrụkwa oge chineke mere ọha na eze ihe ọma onye mara ihe kwesiri iji abụ/mbem too chineke dị ka oge oke okochi chineke eziitere ụmụ mmadụ mmiri ozizo.
CH. MBEM ỌHA: Ụdị a bụ mbem eji egosikarị obi ụtọ n’ obodo dị ka n’ oge emume dị iche iche. Dị ka n’ ila ọsọ, alụm dị na nwunye, igba mmanwụ.
Ọmụmaatụ:
Onye egbule ya
Onye egbule ya
Onya egbule nwa mgbei
Onye egbule ya
Onye ma echi
Onye egbule nwa mgbei
D. MBEM ỌRỤ: Ha bụ mbem ndị a na-agụ ma a na-arụ ọrụ. Oge ụfọdụ otu ogbo ma ọ bụ ebiri na-agba onwe ọrụ. Oge ha na-eme ụdị ihe ha na-agu ọtụtụ abụ iji gosị obi ụtọ na ịdị n’ otu.
Ọmụmaatụ:
O tawa ike anyị abịa
O tawa ike anyị abịa
O siwe ike anyị abịa
Ruo ọrụ anyị abịa
Jisie ike anyị abịa
E. MBEM AGHA: mbem agha bụ egwu eji eje, alụ agha n’ ọgbọ ụgha. Ndị bende ochie bụ ndị a mara ama maka ịlụ agha.
Ọmụmaatụ:
Agha egbe agha
Agha agha
Agha mma
Agha agha agha
Ndịkom ki,
Agha agha agha
Ekweghi arịrị agha
Agha agha
Agha echiche agha
Agha agha.
22.3 URU MBEM BARA
Mbem bara uru nke ukwuru n’ ụzọ dị iche iche ọtụtụ oge ọ bụ etu mmụọ dị, n’ ime mmadụ na-akpali onye ịgụ mbem ma ọ bụ abụ. Ọ na-enye ọgụabụ aṅụrị oge o weputara ọha na eze ihe niile gbasara isi okwu nke ọ na-agụ maka ya. Ọ bụrụ ọnwụ, mmadụ, ọgụ, agha, ọmụmụ nwa, ihụnanya, na ndị ọzọ ma ọgụabụ agụghi ihe niile dị ya n’ obi ọ naghị enwe aṅọrị.
Mbem ọ bụla na-eme ka mmekọrịta di n’ etiti mmadụ na ibe ya. Uru ọzọ mbem nwere bụ na chineke na-agozi onye ọ bụla nke na-enye ya otito. Ọgụ abụ mgbe ọ na-agụ abụ nye chineke, ya na chineke na-enwe mmekọrịta pụrụ iche.
AJỤJỤ NNWALE
1. Eze ga-agba ọsọ. Nke a bụ ahịrịmfe A. ndịniihu B. ndịugbu a Ch. ndịnaazụ D. ndịmechaa
2. Ada jere ugbo. Nke a bụ ahịrịmfe na-egosi A. ndịniihu B. ndịugbua Ch. ndịnaazụ D. ndịmechaa
3. Ịgụ nwa aha debara n’ ejije ọdịnaala A. mgba B. agha Ch. egwu ọnwa D. ntọ aja
4. Ụmụaka ịnwale ọkpụkpụike dabara n’ otu na ndị a: A. ntọaja B. mgba Ch. agha D. oriri
5. N’ ọdinaala ndị igbo, “Ejije niile pụtara: A. egwuregwu B. mkpari Ch. ịlụọgụ D. igokwu
6. Nkejiasụsụ na-ejiko okwu abụọ bụ A. ngwaa B. mbuụzọ Ch. njiko D. mkpọaha
7. Ndị igbo bụ ndị sitere n’ _______ A. nwụcha anyanwụ Naịjịrịa B. mbido anyanwụ Naịjịrịa Ch. ọwụwa Naịjịrịa D. ọdịda anyanwụ Naịjịrịa
8. Akara edemede a “!” pụtara ______ A. akara nju B. akara mkpu Ch. akara ajụjụ D. njiko
9. Akara edemede a “?” pụtara ______ A. akara ajụjụ B. akara nju Ch. akara mkpu D. mbuụzọ
10. Ihe a na-ekele na mmadụ nye gi ihe bụ ______ A. nnọọ B. ndeewo Ch. jisieke D. kedụ
11. Eji ọmụnkwu ekechi A. isi B. akpa Ch. akwụkwọ nri D. akwụkwọ
12. Tensi na-ezipụta ihe ga-eme eme bụ A. nganiihu B. nsonaazụ Ch. ugbua D. Ngaraadi
13. Abụ eji agha bụ _________ A. abụ nwa B. abụ otito Ch. abụ agha D. abụ nkọcha
14. Enwere ụdị Agụmagụ ___________ A. abụọ B. atọ Ch. anọ D. ise
15. Ihe ndị eji edobe onwe anyi ọcha bụ ________ A. akwụkwọ B. iko Ch. mkpisi ode D. mmiri
16. Otu nde bụ _________ A. 1,000 B. 10,000 Ch. 100,000 D. 1,000,000
17. Puku itoolu, nari itoolu, iri itoolu na itoolu A. 99 B. 999 Ch. 9989 D. 9999
18. Puku ise pụtara na bekee _______ A. 505 B. 500 Ch. 5,000 D. 5005
19. __________ bụ usoro ọgụgụ n’ igbo A. akwụkwọ B. ọnụọgụgụ Ch. ọmụmaatụ D. numeral
20. Kedụ ihe elekere pụtara na bekee A. O’clock B. minute Ch. day D. today