Skip to content

We use essential cookies to sign you in and remember your settings. With your permission we also use analytics cookies to understand how the site is used. See our privacy policy or fine-tune this anytime at cookie settings.

SubjectFree lesson

NDḷ IGBO NA EJỊRỊMARA HA.

ClassNotes Team 58 MIN READUPDATED 13 JUN 2026

 ISI NKE MBU

       NDḷ IGBO NA EJỊRỊMARA HA.

1.1 NDỊ IGBO:

Ndị igbo bụ ndị ahụ bi n’ebe amaara dịka ala igbo, ma nweekwa asụsụ igbo dịka asụsụ nne na nna ha. Ndị igbo bụ ndị bi n’ọwụwa anyawụ mba Naịjịrịa. Ihe eji mara mba ma ọ bụ obodo ọ bụla na ha ga-enweriri ebe ha bi na ya.

          Abịa n’ọwụwa Anyanwụ Naịjịriịa ebe ndị igbo bi, ọ bụ naanị ha bi na steeti ise ndị a;

a. Abịa

b. Anambra

ch. Ebonyi

d. Enugu

e. Imo

f. E nwekwra steeti ndị ọzọ ebe ndị igbo so biri dịka:

i. Akwa ibom

ii. Kros River

iii. Delta

iv. Riva

 

  1.  1.2 NDI IGBO N’AGBATOBI HA.     
  2. NDḷ IGBO NA EJỊRỊMARA HA.
  3. Agbụrụ dị iche iche na Naijiria gbara ndị igbo gburugburu. Na mgbago ugwu, ndị ha na ndi igbo gbara bu igbala, idoma and Tiv; na ndida, ọ bụrụ ndị ịjọ(ijaw), urobo(Urhobo) na isoko, n’ ọwụwa anyanwụ o bụrụ ha na efik (efik) na ibibo. A gafee ọdịda anyanwụ ọ bụrụ ha na ndi Edo.

    Mmekọrịta ndi igbo na ndi agbataobi ha metutara Omenaala, Usoro, ọchịchị na Usoro achụmụnta akụnụba. Site n’ụzọ dị iche iche, tụmadi site n’akụkọ ndiiche, anyi na- aghọta na ọ bụ ndi igala na ndị Edo ka ha na igbo ka nwee mmekorịta n’oge gboo.

         Ndị Enugwu Ezike nke dị na mgbago Nsuka na ndị igala gbara agbataobi ha na- alụkọrịta di na nwunye. Ụfọdụ ndị Enugwu Ezike dịka ndị Unadụ na- egbu egbugbu dịka ndị ịgbala. Ha na- azakwa ndị igala. Ụfọdụ na- aza Ataa.

    Ndị Aguleri na ndị igala nke dịkwa na Kogi steeti gbakwara agbataobi. Ọ bụ osimiri. Anambra ma ọ bụ omambala kewara ndị igbala na ndị Aguleri.

              Ndị igbo ụfọdụ bị na Delta steeti na ndị Edo (iduu)gbara agbataobi. Ndị ọ bụla na- esi n’aka ibe ha gbaziri ma ọ bụ omenaala ma ọ bụ okwu ụfọdụ.

    1.  AKỤKỌ GBASARA EBE NDḷ IGBO SI MALITE.
  4. Agbụrụ ọ bụla nwere akụkọ ha na- akọ bụ etu agbụrụ ha sịrị

    malite. Ndị Yoruba kwenyere na ọ bụ oduduwa bụ nna ndi Yoruba. A mughị ya amụ. Ọ si n’ elu igwe wudata n’ala wee mụbawazie ndi Yoruba. Ndị Awụsa kwenyere na ọ bụ kanọ be ebe mbu nna mbu ha siri malite.

              Ndị igbo nwere ọtụtụ akụkọ gbasara etu ha sịrị malite. Ide akwụkwọ abiaghị ala igbo n’ oge. Ndi ọ bụla na-akọ na-ekwu na ọ bụ ha bụ ndị mbu biara biri n’ala igbo.

              E nwkwara ndị kwenyere na ndị igbo esighi ebe ọ bụla bia. Ndị dị otu a na-akọwa na ndị igbo malitere ndụ ha n’ Awka na nri. Oweriri na ọrlụ na okigwe. Ọ bụzi ebe ndị a ka ha sitere gbasaa. Ụfọdụ n’ime ndị kwenyere n’echiche a na- akọwa na ndị igbo malitere ndụ ha na mpahara ọrlụ na owerri na mgbagwo oshimiri ọmabala tupu ha we rute Awka na nri.

              Ụfọdụ siri na ndị igbo sitere n’agbụrụ ndị juu. Ha gbadoro ụkwụ n’ihe ndị a we na- ekwu:

    A. Ndi igbo na- akpa agwa ka ndị juu:

    i. Ha na achụkarị akụnaụba nke ụwa a.

    ii. Ha a maghị ihe bụ ezumike

    iii. Ha dị ike ọrụ nke ukwuu

    iv. Afọ anaghị eju ha eju n’ichu ego

    v. Ha anaghị efe eze ha ofufe dịka ndị agbụrụ ndụ ọzọ.

              Otu a kwa ka ọ dị n’ agbụrụ ndị juu.

    B. Ụfọdụ omenaala ha na ndị juu yiri bụ:

    i. Ha na- ebe ugwu dịka ndị juu.

    ii. Ha na- eme mmemme ọmụgwụ.

    iii. Ha na- eme mmemme ịgụ nwa ọ hụrụ aha. 

     1.4 NJḷRḷMARA NDỊ IGBO

    a. Ndị igbo na-asụsụ igbo.

    b. Ha na-enwe amamiihe.

    ch. Ndị igbo na-azụkarị ahịa.

    d. Ha kwenyere n’egbe bere ugo bere.

    e. E ji erimeri ndị a mara ndị igbo dịka akpụ, ofe onugbu, ji, ofe ọra na ndị ọzọ dị iche iche.

    f. Ejikwa ejije a mara ndị igbo.

  5. NDḷ IGBO NA EJỊRỊMARA HA.

     

     

    IGBO

    BEKEE

    Okpu

    Okpumme

    Mkpara

    Ume mwuda

    Abụba ugo

    Akpụpọụkwụ

    Aka

    Ịchafụ

    Irika

    Udo

    Olanti

    Ukwu akwa

    Cap

    red cap

    staff

    long gown

    eagles feather

    shoes

    bead

    scalf

    ring

    robe

    earring

    wrapper

     

     

                                                                               ISI NKE ABỤỌ

    ỌJỊ NA URU ỌJỊ BARA

  6.  

    NDḷ IGBO NA EJỊRỊMARA HA.

     

     

    2.1 NKỌWA: Ọjị bụ mkpụrụ osisi a na- enyekarisi ugwu n’ala igbo. Ọjị bụ isi emume n’ala igbo. Ọjị bụ isi emume n’ala igbo. Ọ bụkwa ihe mbu a na- enye onye ọbịa, ọ bụ ihe mbu a na enye arụsị na ụmụ mmụọ dị iche iche, ọ bụkwa ihe mbu eji amalite mmemme ọ bụla. E nwere udị ọjị dị iche iche dịka oji awụsa, oji enwe, oji igbo wdg, mana nke gbasara ihe ọmụmụ a bụ ọjị igbo.

              Ibe ole ọjị igbo gbara nwere ihe ọ na egobipụta.

    Ọmụmaatụ:

    a. Ọjị gbara otu abụghị ezigbo oji, a na- akpọ ya ọjị ogbi ma ọ bụ ọjị isi.

    b. Ọjị gbara ibe abụọ abụghịkwa ezigbo ọjị a na-akpọ ya ọjị nwaanyi n’ebe ụfọdụ.

    ch. Ọjị gbara ibe atọ bụ ọjị ikenga ma ọ bụ dike.

    d. Ọjị gbara ibe anọ na- egosiputa ihe ọma ga-abịara mmadụ.

    e. Ọjị gbara ibe ise ma ọ bụ ịsịị na- egosipụta ọmụmụ, ụba ma ọ bụ ogaranya.

    f. Ọjị gbara ibe asaa na- egosi na nnukwu ihe ọma ga-abịara mmadụ.

    g. Nwere mkpụrụ osisi ndị ọzọ enwere ike iji mme ọjị dị ka mkpụrụ anara/afụfa/mkpụrụ ofe, aki ilu ma ọ bụ ugoro, mmiri, mmanya, ahụekere ma ọ bụ, nzu. wgdz.

     

    2.2 URU ỌJỊ BARA

    a. Ndị igbo ji ya ele obịa

    b. Ndị igbo ji ọjị ekpe ekpere ma ọ bụ agọ ọfọ.

    ch. E ji ọjị arịọ arịrịọ n’ụzọ dị iche iche.

    d. A na- eji ọjị agba ndụ.

    e. A na-ejikwa ọjị anụ iyi/agọ iyi.

    f. E ji ọjị agba afa.

    g. Ndị igbo jikwa ọjị eme ihe ndị ọzọ dị iche iche dịka ichụ nta ego, isi ji akwa. wdg.

    2.3. ỌGHỌM DỊ N’ỌJỊ

    a. Ọji nwere ike ịghọ onye ji ya achụ nta ego ahịa site n’agba ndị mgbe ọ na- echekwa.

    b. mmadụ nwere ike itinye nsi n’ọjị onye ọ chọrọ igbu.

    ch. Ojị bụzi ihe oke ọnụ ahịa ugbu a.

     

     

                                                                              ISI NKE ATỌ

    EDEMEDE (ESSAY WRITING)

     3.1 NKỌWA EDEMEDE.

              Edemede bụ ihe ọ bụla mmadụ ji uche ya chepụta ma dee dịka o si metụ ya n’obi maka ihe ọji mere isiokwu. Ọ bụ ihe a na-ede maka ya ka a na- akpọ isiokwu. N’edemede ọ bụ isiokwu ka a na- ebu ụzọ dee, gbado ụkwụ na ya wee dewezie edemede ahu.

    3.2. ỤDỊ EDEMEDE DỊ ICHE ICHE.

    1. Edemede Akọmakọ (Narrative Essay)

    2. Edemede Nkọwa (Descriptive Essay)

    3. Edemede nkọwami (expository essay)

    4. Edemede mgbagha (Argumentative Essay)

    5. Edemede mkparịtaụka (Dialogu Essay)

    6. Edemede Nrụrịtaụka (Debate Essay)

    7. Edemede Leta (Letter writing)

    3.3 EDEMEDE LETA

              Edemede leta bụ edemede eji ezigara onye na-anọghị nso ozi ma ọ bụ gwa ya ihe ọ bụla odee gaara ịgwa ya ma ọ bụrụ na ọ nọ nso. Edemede leta na-ezipụta ebe onye na-ede ya nọ na etu ozi nwere ike isi ru ya ahụ. A na-akpọ nke a adreesi. Ọ na-ebu ihe ọnwa dị na ya tinyere ekele mmalite no ekele mmechi. Ọ bụ ụdị ekele mmalite leta nwere na-ezipụta ụdị ekele mmechi ọ ga-enwe.

    3.4 ỤDỊ EDEMEDE LETA ENWERE

    i. Leta nke onye

    ii. Leta Anamachọihe ma ọ bụ leta Anamachọrụ

    A. LETA NKE ONYE: Nke a bụ leta mmadụ na-edegara onye nke ya, onye ọ maara nke ọma, enyi ya na ikwu na ibe ya.

    Usoro leta nke onye na-agbaso

    i. Adreesi onye na-ede leta (n’ elu, n’ aka nri) na ụbọchị.

    ii. Ekele mmalite.

    iii. Ahụ leta/etite leta ahu.

    iv. Mmechi na naanị aha ya.

     

     

    Ọmụmaatụ:

  7.  

     

    NDḷ IGBO NA EJỊRỊMARA HA.

     

     

     

    B. LETA ANAMACHỌIHE: Nke a bụ leta mmadụ na-edega n’ ofiisi iji rịọ ihe maọbụ mee ka a meta ihe dị ya mkpa. Leta anamachọihe na-ebu adreesi abụọ, nke ode na nke onye nọ n’ ofiisi a na-edegara. Adreesi leta ọ bụla ga-abụ na bekee ma ekele mmalite etiti na mmechi leta ahụ ga-abụ n’ igbo leta.

    Usoro leta Anamachoihe:

    i. Adreesi onye na-ede leta na ụbọchị.

    ii. Adreesi onye isi ụlọ ọrụ/ụlọ mgbasa ozi a na-edegara.

    iii. Ekele mmalite.

    iv. Isiokwu ebu n’ uche ede leta a.

    v. Ahu leta ebe nkọwa niile ga-abata.

    vi. Nkọwa onye dere leta, idepụta aha n’ uju.

     

    Ọmụmaatụ:

  8.  

     

     

    NDḷ IGBO NA EJỊRỊMARA HA.

     

     

     

     

    180, Uzoigwe Street,

                                                                       Private mail Bag 1923,

                                                                       Onitsha.

                                                                       6th April, 2017.

    The Personal manager,

    Anambra Broadcasting Service,

    Private mail Bag 2861,

    Onitsha.

              Ezigbo Nna anyị ukwu;

    ỊRỊỌ KA E WERE M N’ ỌRỤ NGỤPỤTA AKỤKỌ IGBO

    ----------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------------

  9.  

     

     

     

    NDḷ IGBO NA EJỊRỊMARA HA.

     

     

     

     

     

    Akaọrụ bụ ihe mmadụ na-eme iji nweta ego nri ọnụ. Ọ bụ ihe ọ bụla mmadụ na-eme iji nweta nri ọnụ ma ọ bụ iji nweta ego o ji mkpa ya. E nwere ụdịrị ọrụ dị iche iche ndị mmadụ na-arụ iji nweta nri ọnụ.

    4.2 ỤDỊ AKAỌRỤ DỊ ICHE ICHE

    i. ikpa isi.

    ii. ọrụ isi nri.

    iii. ịkpụ ụzụ.

    iv. ọrụ ụlọ.

    v. ikwa ụgbọala.

    vi. ichụnta.

    vii. ịkọ ugbo.

    viii. isu akwa.

    ix. ikwa akwa.

    x. ọrụ moto.

    xi. orụ bekee.

    xii. ịkụ azụ.

    xiii. izu ahịa.

    xiv. ọrụ iku osisi.

    xv. ọrụ ugbo.

    xvi. ikwe ugboelu.

    xvii. iru okporo ụzọ.

    4.3 URU AKAỌRỤ BARA

    Onye mụtara akaọrụ nke ọma:

    i. Ga eriju afọ.

    ii. Amaghị njọ ahịa, a zụrụ azụghị ha na enweta ọrụ.

    iii. Na enweta nnukwu ego.

    iv. Na-enwe ezigbo aha w.d.z.g.

     

     

    ISI NKE ISE

    ỌGỤGỤ NA AGHỌTAAZAA

    5.1 NKỌWA IHE BỤ AGHỌTAAZAA

              Aghọtaaza bụ edemede na ajụjụ na-eso ya a na-ajụ. E dechaa edemede a, nke nwere ike bụrụ akụkọ, leta ma ọ bụ edemede nkiti, a jụọ ajụjụ. Ọ gụụ ga-aza ajụjụ ndị a.

              Tupu anyị azata ajụjụ aghọtaazaa nke ọma, o kwesiri ka anyị bụrụ ihe ndị a n’ obi:

    1. Anyị ga-agụ edemede ahụ ugboro ugboro, nke ọma.

    2. Ọ ga-edo anyi na anyi ghọtara ihe edemede ahụ na-akọ maka ya.

    3. Anyị ga-agụkwa ajụjụ ndị ahụ a jụrụ hụkwa na anyị ghọtara ihe a chọrọ ka anyị zaa.

    4. Anyị ga-aghọta na oge enyere maka nọmba aghọtaazaa anaghị ebu ibu (n’ ule). Ya bụ na anyị ga-abụ ndị na-agụ agụmagụ ngwa ngwa.

    5. Anyị bido ịza ajụjụ anyi kwesiri iwere okwu aka anyị na-aza ajụjụ a jụrụ. Ọ naghị akacha mma i na-akọpịrị naanị ahịrịokwu nke odee jiri dee edemede ya. Anyị were okwu aka anyị, ọ na-egosi na anyị ghọọtara edemede ahụ ọ bụkwanụ ya bụ aghọtaazaa.

    5.2 NWALE AGHỌTAAZAA

              Gụọ ederede a tupu ị zazia ajụjụ maka ya.

            Ọkụkọ bụ anụ ụlọ, nri ọ na-erịkari bụ mkpụrụ ọka. Ọkụkọ na-ewu anaghị anọ n’ otu ụlọ. Ọ dịghị ebi n’ ọhịa. Ọ dịka nnụnụ mana ọ bụrụ ibu kakwa nnụnụ. Ọkụkọ nwere nku abụọ na ụkwụ abụọ. Ọkụkọ na-eyi ọtụtụ akwa.

              Ọ na-ekpugide akwa ya ruo mgbe ụmụ ya ga-apụta. Ọ kpọrọ ha pụọ ọ na-achọtara ha nri. Mgbe ụmụ ya toro, ndi nke nwunye ya. Ndị nke bụ oke (Oke okpa) ga-amalite ikwa akwa. Okokorokoo ọkụkọ na-anyụ nsi ebe ọ bụla masiri ya.

     

    AJUJU NWALE

    1. Isiokwu edemede a bụ __________ A. akwa  B. ọkụkọ  Ch. nri akpụ  D. anụ ọkụkọ

    2. Olee ebe ka ọkụkọ na-ebi  A. N’ ọhia  B. N’ ezi Ch. N’ ụlọ  D. N’ elu osisi

    3. Akwa ole ka ọkụkọ pụrụ ịyị? A. akwa nri  B. ọtụtụ akwa  Ch. akwa anọ  D. akwa ise

    4. Nne ọkụkọ na-eyi akwa ebe oke okpa  A. na-ata ji  B. na-ekpugide akwa ya  Ch. na-achụta nri  D. na-akwa okorokoo

    5. Gịnị bụ nri ọkụkọ na-eri na akụkọ a? A. abacha  B. gari  Ch. mkpụrụ ọka  D. oroma

    6. Ọkụkọ na-anyu ______ ebe ọ bụla  A. nsi  B. akwa  Ch. anụ  D. akpi

    7. Mejuputa ọkụkọ __________ mkpụrụ ọka mkpụrụ osikpa  A. Na-asa  B. Na-eri  Ch. Na-ata  D. Na-ezu

     

     

     

    ISI NKE ỊSỊỊ

    NTỤGHARỊ OKWU NA AHỊRỊOKWU (TRANSLATION)

    6.1 NKỌWA NTỤGHARỊ:

              Ntụgharị bụ ịsụgharị ihe dị n’otu asụsụ ka ọ dị n’asụsụ ọzọ, ka echiche, nghọta na mpụtara ya bụrụ otu.

    6.2 IHE MGBAKWASA UKWU MAKA NTỤGHARỊ

    1. Gụọ ihe enyere gi ọtụtụ ugboro iji mata echiche na ebmnuche dị na ya.

    2. Ntụgharị mkpụrụokwu ga-adị na mkpụrụ okwu nke ahịrịokwu ga- adị n’ ahịrịokwu nke nkeji edemede ga- adịkwa na nkeji edemede. (paragraph)

    3. Na ntụgharị, a gaghi etinye echiche ọzọ ma ọ bụ wepụ ewepu. Ọmụmaatụ:

     “ He went to the market” ga- abụ “Ọ gara ahia” Ọ gaghị abụ  “Ọ gara igote ihe n’ ahịa”.

    4. E nwere ilu, akpalaokwu na atụmatụ okwu bekee a ga-eji nke igbo ya na nke bekee ahụ nwere otu  echiche na mpụtara tụgharịa ya.

    Ọmụmaatụ:

     “A stitch in time, saves nine” ga- abụ “E mee ngwa ngwa emeghara ọdachị” “There is no smoke without fire” ga- abụ “Awọ anaghị agha ọsọ ehihie n’efu”.

     

    6.3 ỊTỤGHARỊ IHE EDERE NA BEKEE N’ IGBO

    S/N

    Bekee

    Igbo

    1.

    Bread

    Achicha

    2.

    Time

    Oge

    3.

    O’clock

    Elekere

    4.

    Minute

    Nkeji

    5.

    Tall

    Ogologo

    6.

    Male

    Nwoke

    7.

    White

    Ọcha

    8.

    Truth

    Eziokwu

    9.

    Water

    Mmiri

    10.

    December

    Disemba

    11.

    November

    Novemba

    12.

    October

    Ọktọba

    13.

    Sunday

    Sọnde

    14.

    Tuesday

    Tuzudee

    15.

    Assignment

    Ihe omume

    16.

    Reported

    Okwungwon

    17.

    Plural

    Ụbara

    18.

    Singular

    Mkpolu

    19.

    Padlock

    Igodo

    20.

    Paragraph

    Nkeji edemede

    21.

    Sentence

    Ahịrịokwu

    22.

    Teacher

    Onyenkụzi

    23.

    Food

    Nri

    24.

    Moon

    Ọnwa

    25.

    Poem

    Abụ

     

     

     

    6.4 ỤFỌDỤ ỌMỤMAATỤ

     

    S/N

    Bekee

    Igbo

    1.

    I got second position in my class.

    Agbara m onye nke abụọ na klassi m.

    2.

    My mother went to market.

    Nne m gara ahịa.

    3.

    I gave that pencil to him.

    E nwere m ya mkpisiodee ahụ.

    4.

    She came with his father.

    Ọ bụ ya na nna ya so bia.

    5.

    She is sick.

    Ahụ adịghị ya mma.

    6.

    I go to school everyday.

    A na m aga akwụkwọ ụbọchị niile.

    7.

    My father is a banker.

    Nna m na-arụ n’ ụlọ akụ.

    8.

    The name of my teacher is Mrs. Azubuike.

    Aha onye nkuzi m bụ oriakụ Azụbụike.

    9.

    That is my motor car.

    Nke ahụ bụ ugboalam.

    10.

    He is my pastor.

    Ọ bụ ụkọ chukwu m.

     

    6.5 NTỤGHARI AHỊRỊOKWU NA ILU

    S/N

    Bekee

    Igbo

    1.

    I should have come there.

    A garam abịa ebe ahụ.

    2.

    Adamma has taken in.

    Adamma adịla ime.

    3.

    Nkechi went to market.

    Nkechi jere ahịa.

    4.

    She bought some meat.

    Ọ zụtaraanụ.

    5.

    There is no smoke without fire.

    Awọ anaghi agba ọsọ ehihie n’ efu.

    6.

    The man gave me one thousand naira.

    Nwoke ahụ nyere m otu puku naira.

    7.

    His uncle deliberately stood up.

    Nwanne nna ya nke nwoke kpachara anya kwụrụ ọtọ.

    8.

    The patient dog eats the fattest bone

    Onye ndidi na-eri azụ ukpoo.

    9.

    Ngozi took first position

    Ngozi gbara onye nke mbu.

    10.

    Obi is the son of the soil

    Obi bụ nwa amaala.       

     

     

    ISI NKE ASAA

    ILU ỤFỌDỤ DỊ MFE NA NKỌWA HA

    7.1 NKỌWA IHE BỤ ILU.

    Ilu igbo bụ okwu amamihe na-adị omimi nke na-ezipụta echiche na nkwenye ndị igbo banyere ihe dị iche iche ma ọ kachasi ihe ndị metụtụ obibi ndụ, akparamagwa na mmekọrịta mmadụ na ibe ya ilu na-adị n’ ụdị ahịrịokwu. Ndị igbo ji ya achọ okwu na ederede maa. Ya mere eji asi na ilu bụ mmanụ eji okwu.

    Ọmụmaatụ:

    S/N

    ILU

    NKỌWA

    1.

    Aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ.

    Onye gbasie mbo ike e mecha o rie uru.

    2.

    Ukwu jie agụ mgbada abịara ya ụgwọ.

    Mmadụ nwee nsogbu onye ọ kabu mma kpariwa ya.

    3.

    Nku onye kpara n’ ọkọchi ka ọ na –anya n’ udummiri.

    Mbo mmadụ gbara mgbe okorobịa ya ka o ga-eri uru n’ agadi.

    4.

    Awọ anaghị agba ọsọ ehihie n’ efu.

    Ihe anaghị eme na nkiti.

    5.

    Nwata a kwo n’ azụ amaghị na ije dị mfe.

    Onye a na-emere ihe amaghị na ihe siri ike.

    6.

    Ihe mere ede ojiri bee nwịị.

    Ọ dịghị ihe na-eme o nweghị ihe kpatara ya.

    7.

    Otu aka ha nwaanyị ka ọ na-atụkwasi dị ya.

    Otu aka ha mmadụ ka ọ na-emedewe ihe.

    8.

    Ọbara anaghi atu asi.

    Nwata ga-akparịrị agwa nne na nna ya.

    9.

    Agadi nwoke ọ na-achọ gịnị n’ egwu ọnwa.

    Mmadụ ga-ana emekọrịta ihe n’ ebe ụmụ ebiri ya nọ.

    10.

    Ebe nwata n’ ebe akwa arụ aka nne ya anọghị ya nna ya anọrọ ya.

    Ihe a na-ekwu ekwukwa ọ ga-enwerịrị ihe dị ya.

    7.2 URU ILU BARA

    1. Eji ya azụlite ụmụaka.

    2. Eji ya achọ edemede na okwu mma.

    3. Eji ilu akpa nkata miri emi nke achọghị ka onye ọ bụla mata.

    4. Eji ya eme ka mmadụ chemie echiche echemi iyi nwee nghọta banyere ihe a na-ekwu.

    7.3 NKỌWA OKWU NTABIIRE

              Okwu Ntabiire bụkarị ahịrịokwu nwere ụmụ mkpụrụokwu yiri onwe ha site n’ ụda ha. Ụfọdụ ndị na-akpọ udị okwu a “okwu mgbawa ọnụ ma ọ bụ okwuntụhị. Ụmụmkpuruokwu ndị a yiri onwe ha n’ ụda ma nwee nghọta dị iche na-ara ahụ ịkpọpụta tụmadụ, mgbe a sị mmadụ kpọọ ya ọsịịsọ ọsịịsọ, ma ọ bụ kpọọ ya ugboro ugboro.

    7.4 OKWU NTABIIRE DI ICHE ICHE

    1. Mgbada gbabara n’ agbata obi ọgba mgbada.

    2. Were akwụ n’ akpa akakpọ nye akakpọ ka ọ taa.

    3. Mpi ka mpi bụ m pi mkpi pụrụ n’ isi mkpi.

    4. Ụkọchukwu okechukwu kwuru okwu n’ ụlọ chukwu dị n’ Arọchukwu.

    5. Ụkọchukwu ụkachukwu kwuru okwu chukwu n’ ụlọ chukwu dị n’ ụmụchukwu.

    6. Nwanyị nọ n’ ukwu mgbamgbe gbaghria ba mgbemgbe mgbe.

    7. Iziima na Ezuma Zụrụ ezimma na ụzọọma.

    8. Tọrọ ọcha chụrụ sịrị ọcha ọsọ.

    9. Anacle na-ele ele, ele a na-ele anaele.

    10. Adaobi, jiri obi mawa ụkwa dara n’ obi obi.

    11. Ọkụ si ite pu ite si ọkụ pụ.

    12. Anyị gara mgba n’ ọba, ọba bịa mgbe be anyị.

     

     

    ISI NKE ASATỌ

    ỌRỤ ‘NA’ NA-ARỤ N’ AHỊRỊOKWU IGBO

    8.1 NKỌWA NA ỌRU ATỌ “NA” NA-ARỤ N’ ASỤSỤ IGBO.

     “Na” nwere ọrụ atọ pụtara ihe ọ na-arụ n’ asụsụ igbo: Ha bụ ndi a.

    i. “Na” dịka Njiko (Conjunction)

    ii. “Na” dịka Mbuụzọ (Preposition)

    iii. “Na” dịka Enyemakangwaa (Auxilary verb)

    8.2. A. “NA” DI KA NJIKO

              Ọ bụrụ ‘Na’ na-arụ ọrụ dịka Njiko ị mara na ọ na-ejikọta okwu abụọ ọnụ onwere ike ijiko aha na aha.

    Ọmụmaatụ:

    i. Ji na ede bụ ihe oriri.

    ii. Azu na anụ dị n’ ime ofe.

    iii. Nne na Nna dị mkpa.

    iv. Nkechi na Ebere bụ ụmụnne.

    v. Oroma ahụ bụ nnukwu na obere.

    B. NA DỊKA MBUỤZỌ.

              Oge ‘na’ na-arụ ọrụ dịka mbuụzọ bụ oge ‘na’ na-egosipụta ebe ihe dị ma ọ bụ ọdịdị ihe. Ọ dị ụzọ abụọ esi ede na dịka mbuụzọ.

              Nke mbụ bụ: A na-ederu na n’ isi ma ọ bụrụ na okwu ọ na-eso bidoro na mgbochiume.

    Ọmụmaatụ:

    i. Nnam bị na legọsụ.

    ii. Nkechi na-agụ akwụkwọ na Enugwu.

    iii. Azụ dị na mmiri.

    iv. Onyinye tinyere aka na mmadụ.

    v. Anyi bi na Kano.

              Nke abụọ bụ: ọ bụrụ na okwu ‘na’ na-eso bidoro na ụdaume. A na-edepụta na otu a n’ ya bu a na-akpozo ‘a’ akpazo were rịkọm elu dochie anya ‘a’ chichapụrụ.

    Ọmụmaatụ:

    i. Eke nọ n’ elu osiso.

    ii. Akwa dara n’ ala.

    iii. Akpa ahụ dị n’ elu oche.

    iv. Azu dị n’ ime ite.

    v. Mmiri dị n’ elu oche.

    CH. “NA” Dḷ KA ENYEMAKANGWAA

              Enyemakangwaa bụ okwu na-enyere ngwaa aka ịzipụta ngọta o nwere ka a na-akpọ nnyemaka ngwaa. “Na” bụ otu n’ ime Nnyemaka ngwaa e nwere n’ igbo.

              Oge ‘na’ na-arụ ọrụ dị ka nnyemakangwaa a na-edepụta. otu a: na ọ bụ oge a na-ede na were tinye ya akara uhie iji zipụta nghọta ngwaa nwere n’ ahịrịokwu.

    Ọmụmaatụ:

    i. Chisom na-esi nri.

    ii. Obi na-echu mmiri.

    iii. Ngozi na-ede ihe

    iv. Ọ na-agba ọsọ.

    v. Chima na-agba bọọlụ

     

    ISI NKE ITOOLU

    EKWUMEKWU BANYERE IZU NA ỊNỤ ỌGWỤ AGHARA AGHARA.

    9.1 NKỌWA ỌGWỤ.

  10.  

     

     

     

     

    NDḷ IGBO NA EJỊRỊMARA HA.

     

     

     

     

     

     

    Ọgwụ pụtara ihe ọ bụla a na-anụ mgbe mmadụ na-arịa ọrịa, o nwere ike bụrụ mkpụrụ ya ma ọ bụ mmiri ya iji wee mee ka onye ọrịa gbakere ọsọ ọsọ.

              Ọgwụ dị n’ ụdị dị iche iche, E nwere mkpụrụọgwụ bekee na mmiri ọgwụ. Enwekwara ọgwụ igbo nke sitere n’ ahị hia na mkpọrọgwụ osisi.

    9.2 ONYE KWESIRI IRE ỌGWỤ NA EBE EKWESIRI IZỤTA ỌGWỤ:

              Ọ bụ onye gara ọzụzụ maka ire ọgwụ ka e kwesiri ịzụta ọgwụ n’ aka ya. Ọ bụghị ebe ọ bụla ka ekwesiri ịzụta ọgwụ, ọtụtụ ndị mmadụ taa anaghị amụ ahịa ọgwụ nke ọma tupu ha amalite rewe ya. Ọ bụ n’ ụlọ ọgwụ ma ọ bụ n’ aka dọkịta ma ọ bụ nọsụ mụrụ maka ọgwụ nke ọma ka e tosiri ịzụ ta ọgwụ.

    9.3 NSOGBU DỊ N’ ỊZỤ N’ NA-ỊNỤ ANWỤRỤ IKE:

    Ọtụtụ ụmụ mmadụ taa na- anụzi anwụrụ ike ka a na-anụ mmiri. Ha amaghi n’ ihe na-atọ ụtọ na-egbu egbu. Ọtụtụ abụrụla ndi new ojii jedere ebe ha na-anu anwuru ike tụọ ha nga mkpụrụọka. Ụfọdụ ṅụbara ya site na ya nwee isi mgbaka.

              Ebe ọkacha dị njọ bụ n’ ụfọdụ ndị mmadụ anaghị eri nri tupu ha anụba ya, ọtụtụ jizi ya mere nri na mmiri, ọ meziri ọtụtụ ụmụ nwoke ha na-eghaisi ha eghe ka ụmụnwaanyị. Ebe ọ nọ agbawa obi bụ na ụfọdụ ụmụ nwaanyị na-anụkwu anwụrụ ike. Ha nụchazie ya, ha echefuo na ha bụ nwaanyị.

    9.4 NSOGBU DỊ NA-ỊNỤ NA-ỊZỤ ỌGWỤ AGHARA AGHARA:

              Ọtụtụ ndị mmadụ esitena na-ịzụ ọgwụ aghara aghara nwụọ ọnwụ abụghị ọnwụ chi ha. Ịnụ na ịzụ ọgwụ aghara aghara na ebute.

    i. Ọnwu erughi erụ.

    ii. Isi mgbaka.

    iii. Ọrịa ndị ọzọ dị iche iche.

    iv. Ọ na-ewetara ụmụ nwaanyị dị ime ihe ọgbugha.

     

     

    ISI NKE IRI

    OMENAALA: IRI JI ỌHỤRỤ

    10.1 NKỌWA IRI JI ỌHỤRỤ

  11.  

     

     

     

     

     

    NDḷ IGBO NA EJỊRỊMARA HA.

     

     

     

     

     

     

     

    Iri jibụ otu n’ ime emume ndị igbo dị mkpa. A na-eri ji ọhụrụ n’ ọnwa asato ma ọ bụ ọnwa itoolu n’ afọ.

              E nwere aha dị iche iche n’ obodo di iche iche. Iji maa atụ, obodo ụfọdụ na-akpọ ya iwa ji, ịlọ mmụọ ma ọ bụ oriri Ahịajiọkụ n’ ihi na ndị igbo kwenyere na Ahịajiọkụ bụ mmụọ new ji. Ka o sila dị aha jikọtara mmemme a n’ ala igbo bu iri ji ọhụụ

    10.2 USORO MMEMME IRI JI

              N’ usoro ọdinaala kpọmkwem. Iri ji na-adikarị n’ ọnwa asatọ nke afọ ọ bụla obodo ọ bụla na-amazi n’ ọnwa ọ dabara ha dịka ha si agụ afọ nke ha.

              Ụbọchị iri ji ọhụrụ na-abiadebe, onye isi ezinaụlọ ọ bụla na-ezigara ndị enyi na nwadiala na ikwu na ibe ndị ọzọ ozi ka ha bịa maka mmemme a. Ma ụmụ nwoke, ma ụmụnwaanyị na-eme nkwadobe dị iche maka mmemme a. iji maa atụ, ụmụnwaanyị na-edobe ebe niile ọcha ma wekọtakwa ihe di iche iche eji esi nri. Ụmụnwoke na-ewekọtakwa ụdị erimeri di iche iche a ga-esi ụbọchị ahụ.

              Ihe mbu a na-eri n’ ụtụtụ ụbọchị ahụ bụ ji a hụrụ n ọkụ. Ụmụnwaanyị na-eji mmanụ, ukpaka(ụgba) na ụtazi gwọkọọ ji ahụ. Nna ezinaụlọ ọ bụla na-eburu nke ya gaa n’ obi ụmụnna ebe ụmụnwoke ụmụnna na-agbakọ. Mgbe ha mesiri mmemme ọtụtụ a, ha alasaa na be ha dị iche iche.

              Erimeri ọzọ na-esote n’ oge ehihie bu iri ji (ụtara ji). Nna ezinaụlọ ọ bụla ga-egbụkwa otu ọkụkọ nke nwaanyị agaghị eso rie. Mgbe esichara nri ji ahụ, a ga-ebụrụkwa ụzọ nye ndiiche nke ha, tupu ndi mmadụ amalite riwe.

              Ụbọchi iri ji na-abụrụ ndị ezinaụlọ ọ bụla na ndi ọbịa na ụbọchi oriri na ọnụnụ.

              N’ oge mgbede, onye ọ bụla na-aga n’ ama ogbe ha maka ihe nkiri dị iche iche dịka otu mmanwụ na otu egwu dị iche iche.

              N’ oge ugbu a, ma ndi otu kraist ma ndi otu ekpemekpe ọdinaala na-esonye na mmemme iri ji, ma ndị otu kraist anaghị esonye n’ ụzọ ọ bụla o siri gbasa ise ụmụ mmụọ dị iche iche.

    10.3 NKỌWA ỌMỤGWỌ

  12.  

     

     

     

     

     

     

    NDḷ IGBO NA EJỊRỊMARA HA.

     

     

     

     

     

     

     

     

    Ọmụgwọ bụ ọnọdụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-anọ na ya. Ọ bụ ogeeji elezi nwaanyị mụrụ nwa anya. Di nwaanyị di otu  a na-ahụ na ya zụtara erimeri dị iche iche na-edozi ahụ aga na-esiri nwaanyị mụrụ nwa. Nkowe na-eji mmanya, ji na ọkụkọ aga agwa ọgọ ya nwoke na ọgọ ya nwaanyị na nwa ha bụ nwunye ya amụọla nwa, obi aṅụrị na-adị n’ ezinaụlọ abụọ a. E mechaa, Nne nwaanyị mụrụ nwa na-aga ele nwa ya nwaanyị ọmụgwọ.

              Ọrụ nne nwaanyị mụrụ nwa bụ ịhụ na ya mara nwa ya nwaanyị mmiri ọkụ n’ ukwu nke ọma. Ọ bụ ọrụ ya ịdị na-esi erimeri dị iche iche nwoke  na-alụ nwaanyị zụtara maka iji lee nwunye ya ọmụgwọ. Ọ bụkwa ọrụ nwaanyị a bịara ile ọmụgwọ ịsa nwa ọhụrụ ahụ na-ekukwa ya. Oge ọmụgwọ bụ oge nwaanyị ji achọpụta ihunanya dị ya nwere n’ ebe ọ nọ.

              Oge ụla ọgọ nwaanyi rue, nwoke na-aba ahịa zuo akwa, ji, nnu na ncha nye ọgọ ya nwaanyị ọ ga-eji ala. Ndị ụmụ nna na-enyekwa ọgọ ha nwaanyị biara ile ọmụgwọ ihe dịka ego.

              Ọmụgwọ bụ ọnọdụ ezumike nwaanyi na-anọ malite mgbe ọ mụchara nwa ọhụrụ ruo izu asaa.

    10.4 URU ỌMỤGWỌ BARA

    i. Nwaanyi nọ n’ ọmụgwọ na-enweta ihe onyinye dị iche iche site n’ aka ndị bịara ileta ya na nwa ya.

    ii. Ọmụgwọ na-abụrụ nwaanyị nwa oge ezumike.

    iii. A na-enye nwaanyị nọ n’ ọmụgwọ ezigbo nri pụrụ iche n’ oge a.

    iv. Dị nwaanyị nọ n’ ọmụgwọ na-azụtara ya akwa ọhụrụ.

    v. Oge ọmụgwọ na-enye nwaanyị mụrụ nwa ọ hụrụ ohere ilekọta nwa ya anya nke ọma.

    vi. Ọ bụ oge nwoke ji ezipụta ihunanya pụrụ iche n’ ebe nwunye ya nọ.

    vii. Nne na nna nwa ha mụrụ nwa na-enweta ihe onyinye site n’ aka ọgọ ha nwoke.

     

     

    ISI NKE IRI NA OTU

    KỌMPOZISHỌN

    11.1 EDEMEDE KỌMPOZISHỌN

              Edemede kọmpozishọn bụ otu n’ ime nkenuụdị edemede e nwere. Na ebe a ọ na-enwe isiokwu akpọrọ aha nke achọrọ ịde maka ya. O nwere ike bụrụ maka nne gị, nna gị, ụlọ akwụkwọ gị, ezigbo enyi gị, onye isi ụlọ akwụkwọ gị. w.d.g. Nke ọ bụla bụ isiokwu akpọrọ aha n’ ụdị edemede ọ na-enwe usoro na nhazi nke ya.

    11.2 USORO IGA AGBASO WEE DEE MAKA NNE GỊ MA Ọ BỤ NNA GI.

    1. Aha nne gi ma ọ bụ nna gi.

    2. Onye ebe o bu.

    3. Afọ ole o gbara.

    4. Etu o di ogologo ka mkpumkpu.

    5. Ụdị akpụkpọ ahụ ya ọcha ka ọ oji.

    6. Ihe ọ na-arụ.

    7. Ụka ọ na-eje.

    8. Ihe na-emekarị ya obi aṅụrị.

    9. Ụmụ ole ọ mụrụ.

    10. Agwa ya.

    11. Ihe mere iji we hụ ya n’ anya.

    11.3 ỌMỤMAATỤ

              EZIGBO NNE M

    Aha nne m bụ obiọma okeke. Ọ bụ onye ọraifite nke dị n’ ime ọkpụrụ ọchịchị. Ekwusigo Lokal Gọọmeti Eria. Ọ gbara afọ iri anọ. Ọ toro ogologo. Nne m dị ọcha. Ọ makwara mma nke ukwuu. Ọ bụ onye ụka katọlịkị. Ọ bụ onye nkuzi ọrụ, nne m bụ idụ akwa, ọ na-azụ ahịa. Ọ mụrụ ụmụ asatọ. ọ na-agụ egwu ụka ọ na-enwe obi aṅụrị. Ọ hụchara ụmụ ya niile na anya.

              A hụrụ m nne m na anya nke ukwuu n’ ihi na ọ bụ ezigbo mmadụ.

     

    ONYE NKUZI M

              Aha onye nkuzi m bụ nwaada onyinye Ezeanya. Ọ bụ onye ụmụna nke dị n’ okpuru ọchịchị ọrlụ lokal Gọọmenti Eria. Ọ gbara afọ iri ise. O toro ogologo. Ọ dị oji. Ọ maghị mma. Ọ na-aga ụka siemensi. Ọ maara akuzi ihe. Ọ dịghị api ihe ma a jụọ ya ajụjụ; kama ọ na-apịa ihe ma ọ bụrụ na! nupụrụ ya isi. Ọ dị obi umeala. Onye nkuzi m na enyere mmadụ aka, ọ bụrụ na m rio ya ego. Oge ụfọdụ ọ na-enye m ma si akwụchi na ya ego ahụ azụ.

              A hụrụ m onye nkuzi m na anya n’ ihi na ọ mara akuzịrị m ihe ma bụrụkwa ezigbo mmadụ.

     

    EZIGBO ENYI M

              Aha Ezigbo enyi m bụ chiọma Nwaeze. Ọ bụ onye Ekwurummiri nke dị n’ okpuru ọchịchị Nnewi nọtụ, nke Anambra steeti. Aha nna ya bụ Maazi Nwaeze Chukwuma. Ọ bụ nwa nke atọ nne na nna ya mụrụ.

              Enyi m gbara afọ iri na anọ. O toro ogologo. Ọ dị ọcha ma maa mma. Ọ na-agụ akwụkwọ. Ọ bu ya gbara onye nke mbu na ule nataam gara aga. Aha ụlọ akwụkwọ ya bụ Jollat Model College, Okokomaiko. Ọ bụ onye ụka katọlịkị. Ọ na-agba egwu oge ọ bụla ọ nụrụ nkwa egwu ka ọ na-ada.

    A hụrụ m enyi m chioma na anya n’ ihi na ọ maara akwụkwọ nke ọma.

     

     

    ISI NKE IRI NA ABỤỌ

    AKARA ỤDAOLU (TONE MARK)

    12.1 NKỌWA ỤDAOLU (TONE)

              Ụdaolu putara otu okwu na-esi ada ma a na-akpọpụta ha. Ọ bụ ụda okwu ahụ ka a ga-esi mata ihe onye kpọrọ okwu. N’ ihi nke a, asụsụ igbo bụ asụsụ ụda. Ọ bụ ụdaolu okwu ka esi amata ihe okwu pụtara na ihe nghọta ya bụ. N’ asụsụ igbo, otu okwu nwere ike na akọwa ọtụtụ ihe mana. Site n’ ụdaolu ha ka aga-esi na amata nke bu nke.

              Ijimaa atụ akwa, oke na isi nwegasịrị nghọta bekee ndi a:

    Àkwà  (Bed)

    Ákwà  (Cloth)

    Àkwá  (Egg)

    Ákwá  (Cry)

     

    ὸké     (Rat)

    όkè     (Boundary)

    ὸkè     (Share)

    όké     (Male)

     

    ísí       (Head)

    ísì       (Smell)

    ìsì       (Blindness)

    ísī       (To cook)

     

    12.2 NKỌWA AKARA ỤDAOLU

              Akara ụdaolu bụ akara n’ egosi ụda okwu ọ bụla dị asụsụ igbo nwere. Ọ na-enye aka n’ ịkọwapụta ndiiche dị n’ okwu ndi nwere otu ụda otu nsupe na nghọta dị iche iche. Ọ bụ n’ elu ụdaume na myiri ụdaume ka a na-etinye akara ụdaolu.

    12.3 ỤDI AKARA ỤDAOLU ENWERE

    i. Akara Ụdaelu   ⁄             (High tone)

    ii. Akara Ụdaala   \            (Low tone)

    iii. Akara Ụdansuda    —    (Down step tone)

     

    A. AKARA ỤDAELU[H] Nke a na-ezipụta ebe a ga-eweli olu elu.

    Ọmụmaatụ:

    Áká              (Hand)

    Ákwúkwό      (Book)

    όgόlόgό        (tall)

    όché             (Chair)

    ísí                (Head)

    Ḿgbírígbá     (Bell)

     

    B. AKARA ỤDAALA [L] Nke a na-ezipụta ebe a ga-eweda olu ala.

    Ọmụmaatụ:

    Àlà     (Land)

    ìtè      (Pot)

    Àkwà  (bed)

    Ùgὸ    (Eagle)

    Àkù    (Wealth)

     

    CH. AKARA ỤDANSỤDA [S] Nke a na-ezipụta ebe olu na-esote udaelu na-eruchaghi elu ka ụdaelu ahụ ọ na-esote.

    Ọmụmaatụ:

    Égō    (Money)

    όnῡ    (Mouth)

    Átútῡ  (Sheep)

    Ńkítā  (Dog)

    Ńwόkē (Male)

     

    12.4 USORO ỤDAOLU N’ ASỤSỤ IGBO.

              Udaolu na-agbaso usoro ndị a n’ asụsụ igbo.

    1. Ụdaelu Ụdaelu [HH]: όché, Ḿgbírígbá, égwú, Ákwúkwό.

    2. Ụdaala Ụdaala [LL]: Ǹdìdì, Àkwà, Ùdѐlѐ, ìtè, ὸbὸgwù

    3. Ụdaala, Ụdaelu [LH]: Ùdé, Ùkwé, Èké, Ḿmánwú, ὸrόmá.

    4. Ụdaelu, Ụdaala [HL]: Úlὸ, Ḿmá, ígwè, Ńdùrù, átùmátù.

    5. Ụdaelu, Ụdansuda [HS]: égō. Ńwόkē, ídē, ágádi, árῡsī.

     

    12.5 ỌRỤ ỤDAOLU NA-ARỤ N’ ASỤSỤ IGBO.

    1. Ọ na-ezipụta ebe a ga-eweli maọbụ weda olu iji mee ka mkpọpụta okwu zipụta nghọta ebu n’ uche.

    2. Ọ na-ezipụta mgbanwe di na nghọta maka okwu nwere otu nsupe nke a na-akpọpụta n’ ụzọ dị iche iche.

    3. Ọ na-ezipụta nghọta nke e bu n’ uche ebe mkpụrụokwu dị n’ ahịrịokwu nwere ike ibute nghọtahie maọbụ mgbagwoju anya.

    4. Eji ụdaolu ezipụta mgbe ahịrịokwu bụ nkwusa ma ọ bụ ajụjụ.

    5. Eji ụdaolu ezipụta nkejiasụsụ maọbụ ọrụ mkpụrụokwu ụfọdụ na-arụ.

     

    12.6 NJḷRḷMARA ỤDANSỤDA

              Naanị Ụdaelu ka Ụdansụda na-eso. Ọ naghị eso ụdaala ma ụdaala nwere ike iso ya. Ọ naghị ebido ahịrịokwu ma o nwere ike ibido mkpụrụokwu dị n’ etiti ahịrịokwu.

     

     

    ISI NKE IRI NA ATỌ

    NKEBIOKWU (PHRASE)

    13.1 NKỌWA NKEBIOKWU

              Nkebiokwu bụ usorookwu nwere nghọta ma ọ nweghị ngwaa. Nkebiokwu nwere ike ịnọ n’ isi ahịrịokwu ma ọ bụ na mmeju. Naanị ngwaa ka a na-ewepu n’ ahịrịokwu iji nweta nkebiokwu.

    Ọmụmaatụ:

    Isịahịrị

    Ngwaa

    Mmeju

    Ọtụtụ mmadụ

    Bịara

    Ụbọchị ahụ

    Ụmụ ya

    Bere

    Akwa ọnwụ ya

    Akwụkwọ ya

    Di

    N’ akpa m

    Ha niile

    Nọ

    N’ ụlọ akwụkwọ

     

    N:B: Isiahịrị na mmeju a niile bugbado Nkebiokwu.

    13.2 ỤDḷ NKEBIOKWU Dḷ ICHE ICHE

    1. Nkebiokwu keaha: mkpụrụokwu eji emepụta nkebiokwu keaha na-abụ aha na aha ma ọ bụ aha na Nnọchiaha.

    Ọmụmaatụ:

    a. Ụlọ akwụkwọ anyị buru ibu.

    b. Osisi oji na-esi ike.

    Ch. Okechukwu nwere anya oke.

    d. Ụkwụ ọsa dị mkpirisi.

    2. Nkebiokwu Kenkọwa: Nke a na-abụ aha nke nkọwa na-esote

    Ọmụmaatụ:

    a. Ndị Nze kpucha okpu mmeemmee.

    b. Ewuọcha tara ji m.

    ch. Kelechi nwere chi oma.

    d. Eji ọka ọcha eme akamu.

     

    3. Nkebiokwu Kenrụaka: Nke a na-abụọ aha nke nrụaka na-eso.

    Ọmụmaatụ:

    a. oche a mara mma.

    b. ji ahu buru ibu.

    c. Nwoke a kwuru eziokwu.

    d. Nwata a amaghị ihe.

    4. Nkebiokwu kembuụzọ: Nke a na- abụ mbuụzọ nke aha na- eso.

    Ọmụmaatụ:

    a. Nne ya bi n’Aba.

    b. Ha nọ n’oriri.

    ch. Azụ dị na mmiri.

    d. nkechi bi na legọsụ.

    13.3 NJḷRḷMARA NKEBIOKWU

    1. Nkebiokwu ga- abụrịrị mkpụrụokwu abụọ maọbụ karịa nọ n’ezigbo usoro nwere nghọta ma nghọta ya anaghi ezucha oke ịnoro onwe ya zipụta echiche zuru oke.

    2. Nkebiokwu ga- abụrịrị aha ma ọbụ nnọchiaha na mkpụrụokwu ọzọ.

    3. Ha na- anọkari n’isiahịrị ma ọ bụ na mmeju dị ka usoro okwu na- afọdụzị ma e wepụsịa ngwaa.

    4. Ngwaa anaghị adị na nkebiokwu.

     

     

             ISI NKE IRI NA ANỌ

                                 NKEBIAHḷRḷ (CLAUSE)

    14.1 NKỌWA NKEBIAHḷRḷ: Nkebiahịrị bụ usorookwu nwere ngwaa na echiche nke anaghị ezucha oke ikwụrụ onwe ya nwee nghọta zuru oke. Nkebiahịrị na-afọdụ ntakiri ka ọ bụrụ ahịrịokwu.

    14.2 ỤDI NKEBIAHḷRḷ Dḷ ICHE ICHE.

    1. Nkebiahịrị nnọọrọonwe ma ọ bụ isinkebiahịrị (main clause) isinkebiahịrị bụ nkebiahịrịokwu nke ndi ọzọ na-adabere na ya iji nwee nghọta zuru oke, e wepu isinkebiahịrịokwu, nkebiahịrị ndị ọzọ agaghị enwe nghọta.

    Ọmụmaatụ.

    i. Dinta gburu enwe nke mabatara n’ụlọ ya.

    ii. O chefuru ọgu ya ebe o jere ugbo

    iii. Nkechi zutara okuko nke akaghi aka

    iv. Nkita a zụrụ nke ọma na- echekwa ụlọ.

    2. Nkebiahịrị Ndabe (subordinate clause) nke a bụ Nkebiahịrị na- adabere n’isinkebiahịrị nwee nghọta.

    Ọmụmaatụ.

    i. O chefuru ọgụ ya ebe o jere ugbo.

    ii. Nkita a zuru nke ọma na- echekwa ụlọ.

    iii. Dinta gburu enwe nke mabutara n’ụlọ ya.

    iv. Nkechi zutara ọkụkọ nke akaghi aka.

    14.3 IHE Dḷ ICHE NA NKEBIAHḷRḷ NA NKEBIOKWU BỤ:

    i. Nkebiahịrị na- enwe ngwaa ma nkebiokwu anaghị enwe ngwaa.

    ii. Nkebiahịrị na- enwe mkpụrụokwu kaịra nkebiokwu.

    iii. Nkebiahịrị na- afọ naanị mmejupụta ka ozuo oke ka ahịrịokwu ma nkebiokwu na-abụ naani mbido maọbụ mmeju na- adị n’ahịrịokwu.

     

    14.4 NJḷRḷMARA NKEBIAHḷRḷ.

    i. Ọ na-enwe ngwaa n’ime ya. Anyi ga edepụtakwa ahịrịokwu dị n’ọmụmatụ anyi nyere na mbu.

    Nkebiahịrị nke mbu

    Njiko

    Nkebiahịrị nke abụọ

    Onye isi anyi kwụrụ

    Na

    O ga- eje Nsuka

    Oge eruola

    Ka

    Anyi rie nri.

     

    ii. Nkebiahịrị na- achọkari mmejupụta ka nghọta ya wee kwụrụ chịm chịm. Leekwa anya, nkebiahịrị nke mbu dị n’ ọmụmaatụ anyị chọrọ mmejupụta n’otu, n’otu.

    Mmadụ kwuoro anyi

    “Onye isi anyị kwuru……” mao bu.

    “oge eruola”…….

     

     

    ISI NKE IRI NA ISE

                       NKEJIOKWU (SYLLABLE)

    15.1 NKỌWA NKEJIOKWU

              Nkejiokwu bụ nkeri a na- ekeri mkpụrụ okwu dịka ụda, ekumume na mkpọpụta ya siri di. Nkejiokwu igbo ga- enweriri ụda. O nwere ike ọ gaghị enwe nghọta. Nke a mere nkejiokwu na mọfim jiri dị iche. E nwere otụtụ nkejiokwu, E nwere ndi nwere otu nkeji, nkeji abụọ, atọ, anọ were dirizie gaba.

                       Ọmụmaatụ:

    Okwu ndị nwere otu Nkeji

    Ji

    Dị

    Kwe

    Gbu

    Si

    Be

     

    Okwu ndị nwere Nkejiokwu Abụọ

    Ada                       A—da

    Obi                        O—bi

    Mma                      M—ma

    Ego                       E—go

    Okwu                     o—kwu

    Kedụ                      k—edụ

     

    Okwu ndị nwere Nkejiokwu atọ

    Nnukwu – N-nu-kwu

    Osisi- O-si-si

    Mmadu – m- ma- du

    Mbem – m-be-m

    Ehihie – e-hi-hie

    Asụsụ – A-sụ-sụ

     

    Okwu ndị nwere Nkejiokwu Anọ

    Ọchanja – ọ – cha – n – ja

    Okorobia – o – ko – ro – bia

    Ọtapiapia – ọ- ta- pia – pia

    Mepụtara – me- pụ – ta –ra

    Onyekachi – o- nye – ka – chi

    Edemede – E- de – me – de

     

    Okwu Ndị Nwere Nkeji ise

    Atụmatụ – A – tụ – m- a – tụ

    Ahịrịokwu – A – hị – rị – o – kwu

    Ntabianya – N- ta- bi – a –nya

    Onyenkuzi – O- nye – n- ku – zi

    Okotiakpọ – O- ko- ti – a – kpọ

  13.  

  14.  

     

     

     

     

     

     

     

    NDḷ IGBO NA EJỊRỊMARA HA.

     

     

     

     

     

     

     

     

     

    16.1 NKỌWA EGWUREGWU

              Egwuregwu bụ otu ụzọ n’ime ngalaba agụmagụ ọdinaala, nke jupụtara na mmegharị ahụ dịka ndị mbu siri wee mee ya. Egwuregwu bụ mmegharị ahụ nke na- eme ka nziomzi zuru oke pụta.

              Ndị igbo nwere egwuregwu dị iche iche. Ha bụ ndị a: egwu ụmụaka nke egwu njiji na- esokwa ya, akpakoro, ịkpọ ọga, okereke okereke, tụmbọ tụmbọ, mpipio na okoso.

    16.2 Ọmụmaatụ Ụfọdụ Egwuregwu

    i.        Akpakoro ------ kpaakoro

              Akpakoro------- kpaakoro

              Udu moo --------Ogene

              Udu moo -------- ogene

              Onye ọ mara ------ kpu u ya ya ya kpuu ya!

              Onye ọ mara-------- Kpuu ya! ---- ya ----ya

    ii.       kpu kpu kpu ogene ------ ogene o gene!

              Kpu kpu kpu ogene ------- ogene o gene!

              Onye ga- ekpu ogene? ----- ogene o gene

              Enyi ga- ekpu ogene;

              Huu—u---u!

              Onye ga- ekpu ogene? ------ ogene o gene

              Atụrụ ga- ekpu ogene ------- ogene o gene

              Ma a a a! ------------------------ ogene o gene

              Onye ga- ekpu ogene? ------- ogene o gene

              Nkita ga- ekpu ogene --------- ogene o gene

              Wo ----o --- wo --- o – wo o….. ogene o gene

              Onye ga – ekpu ogene -----------o  ogene o gene

              Nwamba ga- ekpu ogene --------- o ogene o gene

              Mịọ ------ mịọ ----- mịoọ ---------- o ogene o gene

     

    iii.      Onye ga- agba egwu

              iya a ga- agba egwu iya

              onye ga- agba egwu

    uche ga- agba egwu ịya a

    Bola ga- agba egwu iya a

    Iyaa ga-agba egwu iya

    Ọ bụ ihere na- eme gị? ḷya

    Ọ bụ ihere ụmụikoro iya

    Ọ bụ ihere ụmụagboghọ iya

    Ihere hapu ya ka o laa laa be di ya.

     

    iv.      kedu onye ga- abụ ọyịm?

              Kedu onye ga- abu ọyị m?

              Onye ga- abụ ọyịm ọyịm o?

    A hụra m ọyị m

    A hụra m ọyịm

    A hụra m ọyịm ọyịm.

     

    v.       Okereke okereke               dudu ya ya

              okereke okereke               dududu ya ya

              okerafọ okereafo               dududu ya ya

               kwe na- ọga na – aga        ọ ga- na – aga njem

                ọ ga- na – aga                  ọ ọ gana- aga njem.

     

     

    ISI NKE IRI NA ASAA

    NZU

    17.1 NKỌWA NZU

              Nzu bụ nnukwu ihe na ndu ndị igbo tụmadị otu o sịrị metụta nnabata ọbịa. N’ịnabata onye ọbịa nzu na ọjị na- arụ otu udị ọrụ. Nzu na- egosi obi ocha mmadu nwere n’ebe onye ọbịa nọ. Nzu n’ onwe ya na- egosi ihe dịn so.

              Mgbe onye ọbịa batara n’obi onye igbo, onye ọ bịara na be ya na- atụpụrụ ya nzu nke ọ na- ewere ma kaakwa akara ole na ole n’ala dị ka akara anọ nke pụtara ahịa anọ dị n’izu tupu o tughachị nzu ahụ azụ, ma ọ bụ tugakwara ya onye nọdebere ya mmemme itu nzu ezughịkwa igbo niile ọnụ.

              Mgbe ụfọdụkwa ndị dịbia na- aba nzu n’anya n’ihi na ha kwenyere n nzu na- enyere ha aka n’ịhụ ndị mmụọ anya ma meekwa ka ha hụ ihe miri emi.

    17.2   URU NZU BARA

    a. A na- eji nzu anọchị anya ọjị.

    b. A na- eji nzu akachibido ebe achọghị ka mmadụ gafee. 

    c. A na- eji nzu asa onye na- abanye n’ọkwa dị asọ ahụ.

    d. A na- eji nzu ezipụta ebe ma ọ bụ ihe dị nso.

    e. Eji ya achọ mma.

    f. E ji nzu ete ahụ ụlọ.

     

    ISI NKE IRI NA ASATỌ

     ḷLỤ NWAANYḷ

  15.  

     

     

     

     

     

     

     

     

    NDḷ IGBO NA EJỊRỊMARA HA.

     

     

     

     

     

     

     

     

     

     

    18.1 NKỌWA ḷLỤ NWAANYḷ

              ḷlụ Nwaaanyị bụ alụmdị na nwunye nke dị n’etiti nwoke na nwaanyi. Ma ọ bụ ijiko nwoke na nwaanyị dị ka di na nwunye ka o siri dị n’omenaala. Ilu Nwaanyị bụ nnukwu ihe na ndụ ndị igbo.

    18.2 MMEJUPỤTA Dḷ N’ALỤM NWAANYḷ

    i. A ga – enwe nkwekọrịta n’etiti nwoke na nwaanyị ga-alụ dị na nwunye.

    ii. Ezinụlọ nke nwoke na nke nwaanyị, ga enwe nkwenye ha.

    iii. A ga – enwe onye aka ebe ma ọ bụ nwa nduụzọ

    iv. Ime akụ nwaanyị ma ọ bụ ime ego n’isi nwaanyị.

    v. Igba nkwụ nwaanyị.

    18.3 URU Dḷ N’ḷLỤ NWAANYỊ

    i. Nwoke na-alụ nwaanyị ka o were nwee onye enyemaka n’ezinaụlọ.

    ii. A na-ahụ nwoke lụrụ nwanyi ka onye tọzuru etozu.

    iii. Nwoke lụrụ nwaanyị nwere ike ichi echichi n’ obodo.

    iv. Nwoke na-alụ nwaanyi ka ọ mụta nwa nwee ezinaụlọ.

    v. Nwoke lụrụ nwaanyị na-enwe ọnụ okwu n’ obodo.

    vi. ḷlụ nwaanyị naenye obị aṅụrị.

     

    ISI NKE IRI NA ITOOLU

    EKWUMEKWU BANYERE IBI N’ UDO.

    19.1 NKỌWA IBI N’ UDO.

              Ibi n’ udo bụ mgbe ndị mmadụ bikọtara ọnụ bi n’ ifunanya na egwu nke chukwu. Ọ bụkwa mgbe ndị mmadụ ji aṅụrị biri. Ibi n’ udo na mbido na Ezinaụlọ.

    19.2 ỤZỌ ESI EBI N’ UDO.

              Enwere ọtụtụ ụzọ esi ebi n’ udo. Ha bụ ndịa:

    i. Nwoke ịhụ nwunye ya n’ anya n’ abụghị ịhụ ya dịka odịbo ma ọ bụ ohu na-ewetakwu ibi n’ udo.

    ii. Inye onye ọ bụla aka ya: Oge enyere onye ọ bụla aka ya n’ ezinaụlọ ma ọ bụ n’ obodo, obere amara na ya bụ obere, nnukwu, amara na ya bụ nnukwu udo ga a dị oge niile.

    iii. Ikwanyere nwoke nwe ụlọ ugwu. Mgbe nwaanyi na ụmụ ya. kwanyere nwoke nwe ụlọ ugwu, ha ga na-ebi n’ udo.

    iv. Ezinaụlọ ịma oke na ọrụ dịịrị ya. Mgbe onye ọ bụla na-eme ihe kwesiri ọ ga-eme, echere m n’ udo ga na-achị oge niile.

    v. Iji ume anị sobe ihe isike na-ewetakwa udo nke ezinaụlọ.

    vi. Nwoke inwe aka ọrụ: Ọ dị mkpa na nwoke ọ bụla ga-enwe aka ọrụ iji nwe ike hụ na nri dịịrị ezi naụlọ ya. Oge nwoke enweghị ike ikpata nri nye ndi ezi na ụlọ ya, echeghị m n’ udo ga-adị ebe ahụ.

    19.3 URU IBI N’ UDO BARA.

    i. Ọ na-eweta agamniihu.

    ii. Ọ na-eweta ogologo ndu.

    iii. Ọ na-eme ka ekpere na-aga aga.

    iv. Ọ na-eweta ahụ ike. w.d.z.g.

     

    ISI NKE IRI ABỤỌ

    NDAKỌRḷTA ỤDAUME (VOWEL HARMONY)

    20.1 NKỌWA NDAKỌRḷTA ỤDAUME.

              Ndakọrịta ụdaume kwuru na ụdaume nọ n’ otu ‘A’ ga-agakọ ọnụ ebe ụdaume nọ n’ otu ‘E’ ga-agakọ ọnụ n’ okwu igbo.

              Ndakọrịta ụdaume na-akọwa n’ ezi mkpụrụokwu igbo ọ bụla nwere otu echiche na otu mpụtara, n’ ụdaume dị na ya ga-esi n’ otu n’ ime otu abụọ ndị ahụ enwere n’ ụdaume igbo pụta. Otu ndị ahụ bụ otu ‘A’ na otu ‘E’

     

    Otu  A(Ụdamfe)

    Otu E (Ụdaarọ)

    A

    E

    I

    O

    U

     

    20.2 OKWU NDḷ GBASORO NDAKỌRḷTA ỤDAUME

    i. Ụdamfe (Otu A)

    Akidi, akpa, ọkwa, ụkwụ, ọka, ụtali.

    ii.  Ụdaarọ (Otu E)

    Udele, odo, otu, iwu, ede, ubu, ite. wdgz.

    20.3 OKWU NDḷ NUPỤRỤ ISI N’ IWU NDAKỌRḷTA ỤDAUME.

              Okwu ndị nupụrụ isi n’ iwu ndakọrịta ụdaume bu okwu ndị ahụ ụdaume mebere ha esichaghị n’ ofu otu otu pụta.

    Ọmụmaatụ:

    i. Ahaihe: akpo, alo, oroma, nkucha, okwuma, ashawo.

    ii. Aha mmadụ: Adaobi, chukwuma, ijeọma, Emeka, Chiamaka, Oziọma, Akuudo.

    20.4 EBE IWU NDAKỌRḷTA ỤDAUME NA-ADḷ IRE

    1. Ebe mkpụrụokwu zipụtara naanị otu echiche na nghọta dịka ego, akụkọ, arịrịọ, okwute.

    2. Ebe etinyere nganiihu n’ isingwaa, nganiihu na ụdaume dị n’ isingwaa na-adakọrịta.

    Ọmụmaatụ:

    Ụdaume Nganiihu Isingwaa

    a

    e

    o

    i

    Cho

    gu

    je

    kwu

    gba

    ma

    ịcho

    agụ

    eje

    okwu

    ọgba

    ima

     

    3. N’ ahịrịokwu, nnọchiaha nke otu ụdaume mepụtara n’ ụdaume izizi dị na ngwaa na-esote ya, ga-adakọrịta.

    Ọmụmaatụ:

    a. Akụrụ aka.

    b. O jere agha.

    ch. E siri nri.

    d. Ọ gbara egwu.

    4. mgba a na-emewe ntimiwu, ụdaume dị n’ isingwaa na nke eji gbati isingwaa na-adakọrịta.

    Ọmụmaatụ:

    ri + r = rie

    kwu + o = kwuo

    ga + a = gaa

    bị + a = bịa

    20.5 EBE IWU NDAKỌRḷTA ỤDAUME ANAGHḷ ADI IRE MA Ọ BỤ OKWU NDḷ NUPỤRỤ ISI N’ IWU NDAKỌRḷTA ỤDAUME.

    1. Okwu eji karịa otu mkpụrụokwu mepụta dịka;

    uche + nna = Uchenna

    Di + nta =    Dinta

    Ụda + ume =         Ụdaume

    Nwa + nne = Nwanne

    Ife + ọma = Ifeọma

    2. Okwu ụfọdụ nwere mgbakwunye nsonaazụ dịka;

              Tu + nye =   tunye

              We + pu =   wepu

              Zu + kọọ =   zukọọ

              Ebe + la =    ebela

              Ata + mu = atamu

    3. Okwu mbite ụfọdụ dịka: ashawo, wayo, agidi, rula, osikapa, akamu, tebulu, suya, sukulu, gọvamenti, fulawa, sekondịrị, na sayensi.

    4. Okwu ụfọdụ sitere n’ olumba dịka: egbe, oloma, akupe, alo, ase wdgz.

     

    ISI NKE IRI ABỤỌ NA OTU

    OMENAALA: ḷGBA MGBA

  16.  

     

     

     

     

     

     

     

     

     

    NDḷ IGBO NA EJỊRỊMARA HA.

     

     

     

     

     

     

     

     

     

     

     

    21.1 NKỌWA MGBA

              Mgba bụ otu egwuregwu a na-eji anwale ike onye. E nwere njikere dị iche iche eji agba mgba. Mgba na-enye onye na-emeri emeri aṅụrị mgba na-etiko obodo na obodo. Na mgbe ochie, dike mgba ma ọ bụ dịmgba nwere ike ịlụta nwanyị mara mma.

              Mgbe na-enye ob ụtọ oge eji agba mgba bụ n’ ọkọchị, mgbe ndị ọrụ ubi sepụrụ aka n’ ọrụ ubi. Ebe a na-agba mgba na-abụ n’ ọgbọ egwuregwu, n’ ama na-adị n’ etiti obodo.

    21.2 ỤDḷ MGBA ENWERE

    i. Mgba Ụmụaka.

    ii. Mgba ụmụ okorobia.

    iii. Mgba ụmụ aghọghobia

    21.3 ỤZỌ ESI ACHỌPỤTA ONYE MERIRI NA MGBA.

              Obodo dị iche iche nwere ụzọ dị iche iche esi achọpụta onye meriri na mgba.

    i. Onye nwere ike buru onye ya na ya ya na-agba tụọ ya n’ ala azọ onye ahụ eruo ala onye ahụ emeriele ya.

    ii. Onye buliri onye ya na ya na-agba mgba elu, ukwu, edetụghị, n’ ala.

    iii. Onye nwere ike nefee onye ya na ya na-agba mgba ụkwụ n’ isi.

    iv. Onye nwere ike gafee onye ya na ya na-agba mgba n’ azụ, nọduzie ya n’ azụ.

    v. Ihio onye gị na ya na-agba mgba ọkpụ.

    vi. Mgbe a na-agba mgba otu onye achilie aka elu ma ọ bụ gba ọsọ, emeriela ya.

    21.4 URU Dḷ N’ IGBA MGBA

    i. Ọ na-akwado omenaala.

    ii. Ọ na-eme ka ahụ gbasie mmadu ike.

    iii. Ọ na-eme ka mmadụ new nsọpụrụ na nwekwa aha.

    iv. Ọ na-enye obi anụrị.

    v. O na-enye ego.

    vi. O na-enye mba aha, nihi ndị ọkamgba ha nwere.

    vii. Ọ na-ebute ezigbo mmekọrịta n’ etiti mba na mba.

    21.5 ỌGHỌM Dḷ N’ IGBA MGBA.

    i. Ọ na-eweta ọnwụ erughị eru.

    ii. Ọtụtụ ndị mmadụ na-emeru ahụ mgbe a na-agba mgba.

    iii. Ụfọdọ n’ esite na ya buru anya mkpọ.

    iv. A na-ejikwa ọgwụ agba ya.

    v. Ọ na-ebutekwa iro ọgụ ikpọasi n’ etiti mba na mba.

    21.6 NSO Dḷ N’ IGBA MGBA

    i. A naghị eti mmadụ ihe mgbe a na-agba mgba ya bụ na a naghị ewebata ihe mmerụ ahụ ọ bụla n’ ogbo mgba.  

    ii. Nkowa na nwanyị anaghị agba mgba.

    iii. A naghị esi n’ azụ aba mmadụ mgba.

    iv. A naghị agburu mgba n’ ebe ndị na-akụ ekere mgba nọ.

     

     

    ISI NKE IRI ABỤỌ NA ABỤỌ

    EKWUMEKWU: MPỤ Dḷ N’ ULE

    22.1 NKỌWA: MPỤ Dḷ N’ ULE

     

     

    DRAW EXAM HALL

     

     

              Mpụ ule pụtara agwa ọjọọ ụmụ akwụkwọ na akpa n’ oge ule n’ ụlọ akwụkwọ di iche iche. Ihe nke a pụtara bụ izu ohi n’ oge ule. Nchọpụta anyi mere n’ egosi na mpụ ule n’ ebido n’ ụlọ akwụkwọ ndị obere.

              Igba ahụ obere ụmụ ntakịrị chọọ ile ule ha amapịa ihe n’ akwụkwọ ha, ụfọdụ amapịa n’ elu oche ha were akwụkwọ ha kpuchie ya.

              Otu a ka ụfọdụ na emebe bata n’ ụlọ akwụkwọ sekọndịrị. Mpụ ule dị ọtụtụ n’ ụlọ akwụkwọ sekọndịrị taa. Ndị sekọndịrị na amapicha mapịa n’ ọbụ aka ha, mpatampa ukwu, ụfọdụ n’ ebu n’ otu ha aba ule, ụfọdụ adọkarụ akwụkwọ ọgụgụ ha ebe ha chere ga-apụta n’ ule.

              Ụfọdụ ndị n’ ezu ohi a na-abụ ha bata mahadum ha eruo nku fere. Ọ bụ na mahadum ka ha na ano enweta nzere (Certificate) n’ izu ohi. Ụjọ anaghịzị atụ ha mancha ụfọdụ anaghị abịo akwụkwọ bido n’ izu ruo n’ izu, bido n’ ọnwa ruo n’ọnwa ma na n’ikpe azụ ha ga-eme nke ọma karịa ndị nọ n’ ụlọ akwụkwọ ụtụtụ na echihie. Nsogbu a adila n’ obodo anyị bụ Naijiria.

    22.2 ỌGHỌM Dḷ NA MPỤ ULE

    i. Ụmụ akwụkwọ n’ esite na ya banye izu ohi.

    ii. Ndị na-eme otu a anaghị agụcha agụcha a chụọ ha n’ ụlọ akwụkwọ.

    iii. O nweghị ihe ha adị n’ ụbụrụ ndị n’ ezu ohi n’ oge ule.

    iv. Ha na enwe obi mmapụ oge niile. 

    v. Ufodu anaghị aba uru n’ obodo.

    vi. Ha na-abụ ndị na-agba onye nke ikpe azu klaasi.

    vii. Mpụ ule na ebute mmechi ụlọ akwụkwọ maka ụlọ akwụkwọ ndị na akwado ya.

    viii. Ọ na-ebutere ụmụ akwụkwọ ndị na-eme mpụ ule ahụhụ maka na ejidi ha a na eji utari as a ha ahụ.

    23.3 NTỤGHARḷ UCHE BANYERE ULE

    i. Ọ bụ ọrụ dịịrị nne na nna ịhụ na ụmụ ha na-agusi akwụkwọ ha ike n’ ụlọ. Ha ga-agbakwa mbo hụ na ụmụ ha nwere akwụkwọ ọgụgụ ga na-enyere ha aka.

    ii. Gọọminti ga-ahụ n’ ụlọ akwụkwọ dị iche iche nwere ngwa nkuzi iji kwalite agụm akwụkwọ.

    iii. Ndị nkuzi n’ akụkụ nke ha ga na-eleru ụmụ akwụkwọ anya gbaa mbo hụ na ha ji usoro di mfe akụziri ụmụaka ihe iji mee ka nghọta dịrị ụmụakwụkwọ mfe.

     

    ISI NKE IRI ABỤỌ NA ATỌ

    ỌNỤỌGỤGỤ

    23.1 NKỌWA ỌNỤỌGỤGỤ

              Ọnụọgụgụ bụ usoro ọgụgụ n’ igbo. Ọnụọgụgụ so n’ otu n’ ime nkejiasụsụ enwere n’ igbo. E ji ọnụọgụgụ ezipụta ole ihe dị.

    Ọmụmaatụ:

    0 --------------------- Efu(Zero)

    1 ---------------------- Otu (One)

    10 -------------------  Iri (Ten)

    100 -----------------  Nari (Hundred)

    1,000 --------------   Puku (Thousand)

    1,000,000 -------     Nde (Million)

    1,000,000,000 ----  Ijeri (Billion)

     

    1,001 ---------------- Otu puku na otu

    1,010 ---------------- Otu puku na iri

    1,040 ---------------- Otu puku na iri anọ

    1,080 ---------------- Otu puku na iri asatọ

    10,000 --------------- puku iri

    4888 ----------------- puku anọ nari asatọ na iri asatọ na asatọ

    7099 ----------------- puku asaa, iri itoolu na itoolu

    10,300 -------------- puku iri na nari atọ

    11,000 -------------- puku iri na otu

    12,009 ----------------- puku iri na abụọ na iteghete

    16,209 ----------------- puku iri na ịsịị, iri abụọ na itoolu

    20,000 ----------------- puku iri abụọ

    30,912 ----------------- puku iri atọ, nari itoolu, iri na abụọ

    66,805 ----------------- puku iri ịsịị na ịsịị, nari asatọ na asatọ

    99,999 ----------------- puku iri itoolu na itoolu, nari itoolu, iri itoolu    

       na itoolu

    100,000 ---------------- otu nari puku

    160,000 ---------------- otu puku nari na puku iri ịsịị

    179,000 ---------------- otu puku nari, puku asaa na itoolu

    400,000 ---------------- puku nari anọ

    888,888 ---------------- puku nari asatọ, puku iri asatọ puku asatọ

        nari asatọ, iri asatọ na asatọ.

    999,999 ---------------- puku nari iteghete, puku iri itoolu na puku

        itoolu, nari itoolu, iri itoolu na itoolu 

    1,000,000 -------------- otu nde

    2,000,000 -------------- nde abụọ

    5,000,000 -------------- Nde ise

    60,000,000 ------------ Nde iri ịsịị

    80,000,000 ------------ nde iri asatọ

    1,000,000,000 ---------nde puku

    1,000,000,100 --------- Nde puku na otu nari

    1,000,000,000,000 ---- otu ijeri

     

    23.2 ḷGỤ ỌNỤỌGỤGỤ NKE USORO

    1st -----------  nke mbu

    2nd------------ nke abụọ

    3rd------------- nke atọ

    4th ------------ nke anọ

    5th ------------ nke ise

    10th----------- nke iri

    20th ----------- Nke iri abụọ

    30th ----------------Nke iri atọ

    31st ----------------Nke iri atọ na otu

    90th --------------- Nke iri itoolu

    92nd --------------- Nke iri itoolu na abụọ

    100th -------------- Nke Otu nari

     

    23.3 ḷGỤ MPEKERE

    Mpekere bụ ihe erughị otu. Abịa n’ịgụ mpekere, a na- enwe ọnụọgụ abụọ. Ha bu nke dị n’elu na nke dị n’ala. Nke dị n’ala bụ ole ekere ihe ebe nke dị n’elu bụ e were n’ime nke dị, n’ala.

    Ọmụmaatụ.

    ¼ ------------- otu n’ime anọ

    ½ ------------- otu n’ime abụọ

    ¾ ------------- ato n’ime anọ

    5/8 ---------- ise n’ime asatọ

    7/9 ---------- asaa n’ime itoolu

    4/6 ---------- anọ n’ime ịsịị

    7/8 ---------- asaa n’ime asatọ

     

    ISI NKE IRI ABỤỌ NA ANỌ

    AKARA EDEMEDE (PUNCTUATION MARKS)

    24.1 NKỌWA AKARA EDEMEDE

              Akara edemede bụ akara dị iche iche a na-etinye n’ ihe e dere ede iji zipụta mkpọpụta, ụda, ọrụ na nghọta ya n’ ụzọ doro anya. Akara edemede bụ akara ndị ahụ anyi na-etinye n’ ahịrịokwu ka ha gosi ebe anyị kuru ume, ebe anyi jụrụ ajụjụ, ebe anyi tiri mkpu.dgz. itinye akara edemede dịka ha kwesiri dị nnukwu mkpa iji mee ka ghara inwe nghọtahie n’ ihe edere.

     

    24.2 ỤDI AKARA EDEMEDE DI ICHE ICHE

    Akara edemede

    Aha Igbo ha

    Aha bekee ha

    .

    Kpọm

    Full stop

    ,

    Rikọm

    Comma

    :

    Kpọm kpọm

    Colon

    ;

    Kpọmrịkọm

    Semi colon

    ?

    Akara ajụjụ

    Question mark

    !

    Akara mkpu

    Exclamation mark

    n'

    Rịkọm elu

    Apostrophe

    -

    Akara uhie

    Hyhen

    “  ”

    Rịkọm ngwu

    Quotation mark

    (  )

    Akara mgbodo

    Bracket

    / / ____

    Akara udaolu

    Tone mark

    Akara nkwubiri

    Ellipsis

    Akara mmagba

    Omission

                         

     

    24.3 NKỌWA ỤDỊ AKARA EDEMEDE DI ICHE ICHE

    A. KPOM [ .]

    Kpọm bụ ntụpọ a na-etinye iji gosi nkwusi ahịrịokwu nke na-abụghị mkpu ma ọ bụ ajụjụ.

    Ọmụmaatụ:

    1. Nkechi jere ahịa.

    2. Mmadụka riri nri.

    3. Mmiri na-ezo n’ udu mmiri.

    4. Nne m mara mma.

    5. Ahụ m bụ obi.

              A na- etinyekwa kpọm n’ aha mkpirisi ma ọ bụ iji gosi okwu a na- ederughị n’ isi.

    Ọmụmaatụ:

    i. Mz. (maazi)

    ii. N.A. Nwafor

    iii. W.A.E.C = West African Examination Council

    iv. dgz. = diri gawazie

    v. ork = Oriakụ

    vi. G.C.E = General Certificate Examination

    vii. Rv. = Reverend

     

    B. RỊKỌM [,]

    Rịkọm bụ akara edemede eji gosi nkuru ume tupu ekwutọpụ ihe a na-ekwu.

    Ọmụmaatụ:

    i. Adakụ zụtara ji, ede, mmanụ, nnu na azụ, mgbe o jere ahia.

    ii. Ha gakatara ije, gbawa ọsọ.

    iii. Anyị gara ahia, ma anyị ahụghi nnu ka anyị ji ahụ ose.

    iv. Ọ gbagidoro ọsọ, o wee daa.

    v. E ruo ọnịcha, a ga-ahụ osimiri Naija.

     

    Ch. KPỌM KPỌM[:]

    E ji kpọmpkọm egosi ebe okuku ume toturu eto, ebe a jịkọrọ usoro okwu dị iche iche, ndi na-ekwụ maka otu ihe na ndi gaara ịbụ ahịrịokwu nọọrọ onwe ha iche iche ma a bia zia jikọta ha ọnụ.

    Ọmụmaatụ:

    i. Ọ zụtara ihe ndi a: akara, agidi, azụ na ogili.

    ii. Nke a bụ ndi so ya bịa: mmadụka, Nkechi na Onyinye.

    iii. O nyere onyinye dị iche dika: moto, ego na akwa.

    iv. Ụbọchi ahụ aṅụri ekwughị onye ọ bụla rie nri: Ụmụ akwụkwọ anyi niile gafere n’ ule Igbo.

    v. Ndị gara ahia bụ ndị a: Mmesọma, Ndidi, na Nneameka.

     

    D. KPỌMRỊKỌM [;]

    Nke a na-ekewa ahịrịokwu abụọ zuru ezu ma ha enweghị njiko n’ etiti ha.

     

    Ọmụmaatụ:

    i. Onyinye mụrụ nwa; nwoke ka ọ mụrụ.

    ii. Nkechi zara ụlọ; ọ chọrọ ihi ụra

    iii. Nne ya were iwe; narakwa ya ihe ya.

    iv. A hụ kwghịị na-egbu okenye; e kwuo a nụghịị na-egbu nwata.

    v. A hụ adịghị ya; ọ gawala ụlọ ọgwụ.

     

    E. AKARA AJỤJỤ [?]

    Akara ajụjụ bụ akaraedemede eji akara ajụjụ egosi nkwusi ebe a jụrụ ajụjụ

    Ọmụmaatụ:

    i. Gini bụ aha gị?

    ii. Kedụ ka ịmere?

    iii. Chisom ọ nọ n’ ụlọ?

    iv. Mmadụ ole biara?

    v. Gịnị na-eme gị?

                                

    F. AKARA MKPU [!]

    A na-etinye akara mkpu iji gosi ihe eji iti mkpu kwụpụta dị ka okwu dapụtara mmadụ n’ ọnụ na mberede site n’ ihe mere n’ ike, na mwute, n’ ujo maọbụ na nkuja.

     

    Ọmụmaatụ:

    i. Hia! Ọkụ anyụọ.

    ii. Chei! Ọnwu dị egwu.

    iii. Onyinye o!

    iv. Chimu o o o!

    v. Hey! Were nwayọọ.

    G. RỊKỌM ELU [n’]

    Rịkọm elu dị ụzọ abụọ. Nke mbu bụ nke eji ezipụta mbuụzo.

     

    Ọmụmaatụ

    i. Ewu nọ n’ elu ụlọ.

    ii. Nkechi bi n’ aba.

    iii. Ụlọ ha dị n’ ahia.

    iv. Jisọs gara ije n’ elu mmiri.

    v. Uwe m dị n’ ime akpati.

              Nke abụọ bụ nke eji ezipụta mgbochiume dị ka

    i. Azụ dị na mmiri.

    ii. Ngozi bị na legosi.

    iii. Ụkwụ ya kụtụrụ na bọọlụ.

    iv. Uwe m dabara na mmiri.

    v. Amaka bi na Nnewi.

    GB. AKARA UHIE [-]

    Akara uhie na-apụtakari n’ ahịrịokwu oge ọ na- arụ ọrụ dị ka nyemakangwaa.               

     

    Ọmụmaatụ:

    i. Ada na-azụ ụlọ.

    ii. Nwata ahụ ka ga – eje ije.

    iii. Uchenna ga – esi ofe echi.

    iv. Nwanne m na – asụ ede.

    v. Onye isi ụlọ m na – ede ihe n’ akwụkwọ.

     

    ISI NKE IRI ABỤỌ NA ISE

    TENSI (TENSE)

    25.1 NKỌWA TENSI.

              Tensi bụ katigọrị ụtọasụsụ a na- enwe na ngwaa nke na- egosi oge ihe jiri mee. N’

    Ọmụmaatụ: tensi dị iche iche a aga- enye ebe a, a ga- ezipụta ha mgbe ha bụ nkwe(positive)na mgbe ha bụ njụ (negative).

     

    25.2 ỤDỊ TENSI DỊ ICHE ICHE

    A. TENSI NDỊUGBUA: Nke a bụ tensi eji ezipụta ihe na- eme ugbu a. mgbe ihe a na-ekwu maka ya na- eme ugbu a, na- agawanye, a na- eji nnyemakangwaa “na” eziputa ya.

    Ọmụmaatụ:

     

    NKWE

    NJU

    I

    Anyi na-eme igbo

    Anyi anaghị eme igbo

    Ii

    Ada na- egwu egwu

    Ada anaghị egwu egwu

    Iii

    Ngozi na- ehi ụra

    Ngozi anaghị ehi ụra

    Iv

    Uche na- akọ akụkọ

    Uche anaghị akọ akụkọ

     

    B. TENSI NDỊNAAZỤ: Nke a bụ tensi eji ezipụta ihe mere n’’oge di n’azu maọ bụ n’oge gaworo aga. A na- ezipụta tensi ndịnaazụ site n’igbakwunye “r” nke ụdaume na-eso n’isingwaa.

              Ọmụmaatụ:

     

    Nkwe

    Nju

    I

    O jere ahịa

    O jeghị ahịa

    Ii

    Ha depụtara aha ha

    Ha edepụtaghị aha ha

    Iii

    Ada mụrụ nwa

    Ada amụghị nwa

    Iv

    Nkechi zara ezi

    Nkechi azaghị ezi

    V

    Nke m kụrụ aka

    Nkem akụghị aka

     

    CH. TENSI NDỊNIIHU: Nke a bụ tensi e ji egosi ihe ga- eme n’ọdịniihu. Ihe e ji ezipụta ya bụ nnyemakangwaa “ga”.

              Ọmụmaatụ:

     

    Nkwe

    Nju

    I

    Ha ga-esi nri

    Ha agaghị esi nri

    Ii

    Anyi ga-ezu ike

    Anyi agaghị ezu nke

    Iii

    Anyi ga- aga ụlọ ụka

    Anyi agaghi ụlọ ụka

    Iv

    Nkechi ga- egwu egwu

    Nkechi agaghị egwu egwu

     

     

                      ISI NKE IRI ABỤỌ NA ḷSḷḷ

                                 NKEJIASỤSỤ (Parts of Speech).

    26.1 NKỌWA: NKEJIASỤSỤ.

              Nkejiasụsụ bụ ọrụ mkpụrụokwu na- arụ dịka ọnọdụ, ụda na nghọta ya si dị n’ahịrịokwu ebe ọ di.     

    26.2 ỤDḷ NKEJI ASỤSỤ E NWERE

    1. Mkpọaha (Noun)

    2. Nnọchiaha (pronoun)

    3. Ngwaa (verb)

    4. Nkọwaha (nominal modifier)

    5. Enyemakangwa (Auxilary verb)

    6. Njikọ (conjuction)

    7. Mbuụzọ(preposition)

    8. Nkwuwa (Adverb)

    9. Ntimkpu (interjection)

     

    A. MKPỌHA/AHA

              Mkpọaha bụ mkpụrụokwu eji egosi aha ihe ọ bụla nke ọnọdụ ya n’ahịrịokwu na-abu n’ isiahịrị.

              Aha bụ aha obodo, mmadụ, anụmanụ ma ọ bụ ihe dị iche iche.

                                 Ọmụmaatụ

    Aha mmadụ

    Aha Obodo

    Aha anụmanụ

    Aha ihe

    Chiọma

    Abịa

    Ewu

    Efere

    Mmadụka

    Nnewi

    Aturu

    Iko

    Onyinye

    Imo

    Oke

    Mkpisi ode

    Ekenechukwu

    Ọba

    Ebune

    Akwụkwọ

    Ebube

    Ebonyi

    Ọkụkọ

    Oche

     

    E nwere ụdị aha dị iche iche. Ha bụ:

    i. Aha aka(proper noun)

    ii. Aha izugbe (common noun)

    iii. Ahauche (Abstract noun)

    iv. Ahaigwe (collective noun)

    v. Ahankọwa (adjectival noun) wdg.z

     

    B. NNỌCHIAHA

              Nnọchiaha bụ mkpụrụokwu na-anọchite ebe aha gaara anọ dịka ndi a:

    O,Ọ, Ya, Ha, Anyi Unu, g, ị, i,

    Ọmụmaatụ:

    a. Uche gara ahịa

        gara ahịa

    b. Ifeọma nwere ego

        O nwere ego

    a. N’ebe a “Ọ” nọchitere anya “uche”.

    b. N’ebe a “O” nọchitere anya “ifeọma”.

    Ụdị Nnọchiaha dị iche iche.

    1. Nnọchinonye (personal pronoun): Nke a bụ nnọchiaha na- anọchite aha mmadụ n’ihe ndị ọzọ a chọghị ikpọ aha. E nwere nnọchinonye onye nke mbu, onye nke abụọ na onye nke atọ.

    Ọmụmaatụ:

    Pesin (person)

    Mkpoolu(singular)

    Ụbara(plural)

    Onye mbu

    M, mu

    Anyị

    Onye abụọ

    gi, i, ị

    Unu

    Onye atọ

    ya, o, Ọ

    Ha.

    Ọmụmaatụ:

    a. (i) Ana m abịa (mkpoolu)

        (ii) Anyi na- abịa (ubara)

    b. (i) I nwere akwụkwọ ahụ (mkpoolu)

         (ii) unu e nwere akwụkwọ ahụ (ubara)

    ch. (i) hụrụ mkpa dị (mkpoolu)

          (ii) Ha hụrụ mkpa ha dị (ubara)

     

    2. Nnọchimpesin (impersonal pronoun): Nkẹ a bụ nnọchiaha na- enweghi onye ma ọ bụ ihe doro anya ọ na-anọ chite kpọmkwem. Nnọchimpesin e nwere n’asụsụ igbo bụ “a” na“e”.

    Ọmụmaatụ:

    i. A sịrị na mmiri zoro n’ Aba

    ii. E gburu ewu

    iii. A siri n’echi abụghị akwụkwọ

    iv. E kwuru na obi ga abịa echi.

     

    CH. NGWAA

              Ngwaa bụ mkpụrụokwu na-ekwu ihe mkpọaha ma ọ bụ nnọchiaha. Ọ bụ ngwaa na-ezipute echiche dị n’ ahịrịokwu na ihe ahịrịokwu na-ekwu

    Ọmụmaatụ:

    i. Okeke gburu eru

    ii. Ada bụ ite n’ ise

    iii. Obi jere ahịa

    iv. Maduka sịrị nri

     

    D. NKỌWAHA

    Nkọwaha bụ mkpụrụokwu nke ọrụ ya bụ ịkọwa mkpọaha.

    Nkọwaha nwere ngalaba anọ ha bụ:

    i. Nkọwa(Adjective): Nkọwa bu okwu na-akọwa mkpọaha. Okwu ụfọdụ bụ nkọwa bụ ọcha, ojii, ọma, ajo, ukwu, obere, ọhụrụ, ocha, mma, na ogologo.

    a. Nwoke Ojoo ahụ bịara ebe a.

    b. Ọkụkụ Ojii yiri akwa ise.

    ch. O gotere uwe ọhụrụ.

    ii. Nrụaka (Demonstrative): Nke a bụ nkọwaaha na-egosi ihe a na-ekwu maka ya site n’ irụta ya aka. Nrụaka enwere n’ igbo di abụọ. Ha bụ “A” na “Ahụ”

    Ọmụmaatụ:

    (a) Nwaanyi a na-ere azu.

    (b) Ewu ahụ mara abụba.

    (ch) Akwụkwọ a na-akuzi ụtọasụsụ igbo.

    (d) Ọkụkọ ọcha ahu mụrụ ụmụ iri abụọ.

    iii. Mkpọkọta(Quantifier): Nke a bụ nkọwaaha na-egosi n’ ihe a na-ekwu maka ya bụ ihe a kpọkọtara ọnụ ma bụ ihe dị ọtụtụ

    Ọmụmaatụ:

    a. Ụmụaka niile a hụrụ ka enyere onyinye.

    b. Mmadụ dum ka a chọrọ.

    ch. Anyị ncha ga-agefe n’ ule.

    d. Ụfọdụ mmadụ abụghị nzukọ.

    iv. Nkeonye (Pronominal Modifier): Nke a bụ nkọwaaha na-akọwa onye nwe ihe a na-ekwu maka ya.

    Ọmụmaatụ:

    i. Anyi na – agu Igbo Ugbu a.

    ii. Ada ga – eje ahịa echi.

    iii. Obi ka - akwọ aka tupu o rie nri.

    iv. Anyị ka – abịa ebe.

     

    F. NJIKỌ

              Njikọ bụ mkpụrụokwu na-ejikọ, mkpụrụokwu, nkebiokwu, nkebiahịrị na ahịrịokwu dị iche iche.

              Njikọ ụfọdụ bụ: na, ma, mana, mao, bụ, maka, ka, kama, tupu, tumadi.

    Ọmụmaatụ:

    i. Ji na ede bụ ihe oriri.

    ii. Obi na Ada bụcha ndị obodo anyị.

    iii. Tupu O rie nri ọ kwọrọ aka.

    iv. Nye m otu ma o bu abụọ

    v.  O jere ahịa ma ọ zụtaghị ji.

     

    G. Mbuụzọ

              Mbuụzọ bụ nkejiasụsụ na-egosi mmekọrịta dị n’ etiti mkpọaha na ibe ya. Mbuụzọ na-egosikarị oge, ebe ihe nọ, ebe ihe di na ọnọdụ ejiri mee ihe.

              Naani “Na” ka eji mbuụzọ n’ asusu igbo, ma a na-ede “na” dika mbuuzo n’ uzo abụọ

    i. Oge Okwu na-esote “na” bidoro na mgbochiume ma ọ bụ myiriudaume a ga-ede “na” n’ uju. Ọ ga-akwuru onwe ya.

    Ọmụmaatụ:

    a. Nnam bi na Legoosu.

    b. Azụ bi na mmiri.

    ch. Akpu dị na nkata.

     ii. Oge Okwu na-esote mbuụzọ “na” biadoro n’ ụdaume, a ga-ewepu “a” di na mbuụzọ “na” ma were rikọmelu dochie anya ya.

    Ọmụmaatụ:

    i. Ogechi nọ n’ oche.

    ii. Chike bi n’ Aba.

    iii. Ofe dị n’ elu.

     

    H. NKWUWA:

              Nkwuwa bụ nkejiasụsụ nke na-etinyeso nghọta na ngwaa. E ji nkwuwa egosi otu ihe si mee, otu  ihe dị, Oge ihe mere, ihe eji mee ihe, otu  ihe ha, ihe nwere ike ime. w.d.g.z

    Ọmụmaatụ:

    i. Ọ bịara ebe a ụnyaahụ.

    ii. O riri nri ọsọ ọsọ.

    iii. O jere dine ala nwayọọ.

    iv. O kwuru okwu ngwa ngwa.

     

    I. NTIMKPU

              Ntimkpu bụ nkejiasụsụ egi egosi mkpu pụrụ mmadụ n’ ọnụ mgbe ihe mere n’ ike, na mwute, na mberede ma ọ bụ na nkụja.

    Okwu na-egosi ntimkpu na-akwụrụ onwe ya n’ ahịrịokwu ma bụrụkwa akara mkpu(!) tupu okwu ndị ọzọ esobe ya n’ azụ.

    Ọmụmaatụ: Ewo! Yaa! Hei! Tufia! Hia! Chei! Ooh! Wdgz.

    Lee ụfọdụ ọmụmaatụ n’ ahịrịokwu

    (i) Yaa! Ọ dabara nke ọma.

    (ii) tufia! Ọ bụrụ ogwụ ọ gaghị ere.

    (iii) Aaa! Obi m arituọla.

    (iv) cheyi! Ọnwụ gburu ya mere arụ.

     

    NWALE/QUESTIONS

    1. Mkpụrụabichii igbo dị ole  A. iri abụọ  B. iri abụọ na ise  Ch. iri atọ na ise  D. iri atọ na ịsịị

    2. Ụdaume igbo di  A. atọ  B. itoolu  Ch. asatọ  D. abụọ

    3. Mgbochiume igbo dị  A. iri abụọ na asatọ  B. iri abụọ na itoolu  Ch. iri abụọ na abụọ  D. nari

    4. Olee nke abụghị mkpụrụedemede igbo  A. B  B. D  Ch. C  D. To

    5. Myiriudaume dị n’ ụdị  A. otu  B. abụọ  Ch. atọ  D. anọ

    6. Mgbochiume mkpị dị  A. ịsịị  B. asaa  Ch. itoolu  D. asatọ

    7. Kedụ steeti ala igbo eruteghị n’ ime  A. abịa  B. legosu  Ch. imo  D. Enugu

    8. Kedụ nke abụghị igbo izugbe ebe a?  A. akpa  B. afere  Ch. azịza  D. iko

    9. Kedụ aha ahịa asoghị bụ ____  A. orie  B. afọ  Ch. onie nta  D. eke

    10. Kedụ ndị na-asụ asụsụ n’ ime anụmanụ ndị a  A. nkita  B. ọkụkọ  Ch. ewu  D. mmadụ

    11. Ihe eji ama mba bụ  A. asụsụ  B. obodo  Ch. igbo izugbu  D. olumba

    12. Asụsụ ka chasi mma na, Naịjịrịa bụ  A. Yoruba  B. igbo  Ch. Awụsa  D. O nweghị

    13. Ndị igbo bi na-nke Naịjịrịa  A. ugwu  B. ọwụwa anyanwụ  ch. ndịda  D. mbido

    14. Onye isi mmụọ ala igbo bụ  A. eze  B. nze  Ch. ọzọ  D. ichie

    15. Olee anụmanụ aha ya na-anọkarị n’ ifo?  A. mbe  B. atụtụ Ch. eri  D. ọkụkọ

    16. Olee nke bụ akara ajụjụ?  A. !  B. *  Ch. “ ”  D. ?

    17.     Akpa nkoro

              Kpaa nkoro

              Udu mee!

              Nke a bụ egwu

    A. agha  B. ọmụgwọ  Ch. egwuregwu nwa  D. nri

    18.     Nzogbu Nzogbu!

              Enyi mba enyi!!

              Nke a bụ egwu

    A. agha  B. akwa  Ch. ọnwa  D. nwa

    19. Olee oge ndị igbo na-akọ akụkọ ifo?  A. ehihie  B. abali  Ch. ụtụtụ  D. oge ọ bula

    20. Kedụ nke bụ ọrụ nne na nna n’ ezinaụlọ  A. ịga ahịa  B. inye ego nri  Ch. izulite ụmụ na   D. ịza ụlọ

    21. Kedụ nke a na-aghọta n’ elu  A. epi  B. akpụ  Ch. aki bekee  D. ji

    22. Anụ ndị na-ebi n’ ụlọ?  A. ọsa  B. ewu  Ch. uze  D. enwe

    23. Gwa m ibe ji zuru ụwa ọnụ?  A. anyanwụ  B. ọnwa  Ch. ugboelu  D. ibeji

    24. Gwa m ihe ji zuru ụwa ọnụ?  A. anyanwụ  B. ọnwa  Ch. ibeji  D. ugboelu

    25.     Chakii

              Woo!!

              Kedu nke eji nke a ebido? Akụkọ

    A. agha  B. n’ egwu  Ch. ifo  D. nkiti

    26. Nkejiokwu ole ka okwu a bụ “Ọnụọgụgụ” nwere?  A. anọ  B. ise  Ch. ịsịị  D. asaa

    27. Akara ụdaolu e nwere n’ igbo dị  A. atọ  B. anọ  Ch. ịsịị  D. abụọ

    28. Ọ biara mgbe anyi lacharala “Ọ” ebe abụ _______ A. aha  B. ngwaa  Ch. nnọchiaha  D. mkpọkọta

    29. Olee nke edeziri nke ọma. Azụka nọ __________ A. n’ ahịa  B. na-ahịa  Ch. na ahịa  D. naahịa

    30. Họpụta nke abụghị okwu ajụjụ ebe a?  A. ebee  B. oge  Ch. kedụ  D. olee